Ndezu Senior Joinedand Complete 2019 NEwithcover
Ndezu Senior Joinedand Complete 2019 NEwithcover
Ndezu Senior Joinedand Complete 2019 NEwithcover
2
NDEZU ỤTỌASỤSỤ
IGBO
3
Published by:
FORMAT PUBLISHERS (NIG) LTD
(Publishers of Ideal textbooks)
84 Obiagu Road
P.O Box 729
Enugu, Enugu State, Nigeria
Phone: 08033393296
© Chinedum E. Ofomata
Okwu Mmalite - - - - - - 17
Akwụkwọ Ndị Odee A Derela - - - - 20
Ekele - - - - - - - 29
Maka Akwụkwọ A - - - - - - 31
Nụrụ Nke A - - - - - - 33
6
NKUZI ỤTỌASỤSỤ NKE ISII
Isi Ihe Ọmụmụ Nke Mbụ - - - - - 79
Nsinangwaa (Verbal Derivatives) - - - - 79
Omekangwaa (Participle) - - - - - 79
Mfinitiivu (Infinitive) - - - - - 81
Jerọndụ (Gerund) - - - - - 83
Omee (Noun Agent)- - - - - - 86
Mmee (Noun Instrument) - - - - - 88
9
NKUZI ỤTỌASỤSỤ NKE IRINAOTU
Isi Ihe Ọmụmụ Nke Mbụ - - - - - 150
Olundị (Olumba) – (Dialect) - - - - 150
Igbo Izugbe (Standard Dialect) - - - - 152
Oluundị/Olumba Na Igbo Izugbe - - - - 154
Olu Ngwa (Ngwa Dialect) - - - - - 154
Nkọwapụta Olu Ngwa Ahụ E Depụtara N’Igbo Izugbe - 156
Olu Nsụka (Nsuka Dialect) - - - - - 158
Nkọwapụta Olu Nsụka Ahụ E Depụtara N’Igbo Izugbe - 159
Olu Orumba (Orumba Dialect) - - - - 160
Nkọwapụta Olu Orumba Ahụ E Depụtara N’Igbo Izugbe- 161
Olu Ndọkị (Ndoki Dialect) - - - - - 162
Nkọwapụta Olu Ndọkị Ahụ E Depụtara N’Igbo Izugbe - 163
Olu Afikpo (Afikpo Dialect) - - - - 164
Nkọwapụta Olu Afikpo hụ E Depụtara N’Igbo Izugbe - 165
Olu Abakeleke (Abakeleke Dialect) - - - 166
Nkọwapụta Olu Abekeleke Ahụ E Depụtara
N’Igbo Izugbe - - - - - - 167
Olu Owere (Owere Dialect)- - - - - 167
Nkọwapụta Olu Owere Ahụ E Depụtara N’Igbo Izugbe - 169
12
Ịtụ Ilu - - - - - - - - 255
13
NKUZI ỤTỌASỤSỤ NKE IRINAISII
Isi Ihe Ọmụmụ Nke Mbụ - - - - - 295
Agwụgwa (Gwa m Gwa M Gwa M) - - - 295
15
NKUZI ỤTỌASỤSỤ NKE IRIABỤỌ NA ATỌ
Isi Ihe Ọmụmụ Nke Mbụ - - - - - 389
Nnyocha Abụ - - - - - - 389
‘1983’- - - - - - - - 389
16
NKUZI ỤTỌASỤSỤ NKE IRIABỤỌ NA ASAA
Isi Ihe Ọmụmụ Nke Mbụ - - - - - 440
Ikpochapụ Ụbịam Na Agụụ - - - - 440
OKWU MMALITE
18
Ọ na-abụ a chọwa ijide oke ehi, a chọwa oke mmadụ maka na
onye m na-achụ ehi were na-akpọku, ama m na ọ bụrụ na o
jighị ọgbịrị ehi, o jide ọgwụ ya. Ihe anya hụrụ ama ya anaghịzị
agba maka na ọ bụrụ na dibịa rijuo afọ, ọ gaa n’ajọ ọhịa ga bụta
mgbọrọgwụ. N’ihi na ọ na-abụ e jide ibe ji n’aka e were kọwa
akụkọ maka ụganị.
Ọ kwa ndị Igbo kwuru okwu were sị na ọ na-abụ azụ kaa isi ọ
laa n’oshimiri ga biri maka na ọ bụ isi zuru okpiri na-ebu
okpiri. N’ihi na nnụnụ isi akaghị aka anaghị eje akwa
ọtụrụkpọkpọ. N’ezie, nnụnụ tụọ nkwe a mara n’osisi ọ ga-ebe,
maka na onye tikarịa aka n’obi, o gosi ndị mmụo ebe ndụ ya dị.
Ihe ahụ a na-achọ n’uko elu adịla n’uko ala ugbua. E dere
akwụkwọ n’ụzọ pụrụ iche. N’ezie, ọ bụ onye nna ya dunyere
ohi na-eji ọkpa agbọwa ọnụụzọ. Ọ nweghịkwa ihe ọmụmụ
ọbụla banyere ỤTỌASỤSỤ IGBO a na-achọ achọ n’akwụkwọ
a. Ihe nwataakwụkwọ ọbụla kwesịrị ịma maka ụtọasụsụ Igbo
na Siniọ Sekọndịrị,UTME, JAMB dg, tupu ọ baa n’ule, dị
n’ime akwụkwọ a. Nke kacha nke bụ na ọtụtụ ihe ọmụmụ dị
n’akwụkwọ a ga-enyere onye ọbụla nọ N’ụlọakwụkwọ Dị Elu,
Kọleji Keedukeshọn, Politekniki, Mahadum dg, were na-
achụ nta mmụta banyere Asụsụ Igbo, aka nke ukwuu.
21
Chinedum E. Ofomata edeela ọtụtụ akwụkwọ n’Asụsụ,
n’Ụtọasụsụ na n’Agụmagụ Igbo (Iduuazị). Ụfọdụ n’ime ha
bụ ndị a:
26
52. Ọnwụ Egbughị Onye ụwa – 2006
(Recommended by NECO, 2010 - 2013)
OMENAALA IGBO
(Igbo Customs)
28
91. Omenaala Na Ọdịnaala Ndị Igbo - 2011
(Recommended by WAEC/ NECO, 2016 - 2020)
ENGLISH NOVELS
EKELE
30
Ọ bụ onye nọ ndụ na-akọ akụkọ ọgụ. Ọkụkọ anaghị echezọ
onye foro ya ọdụ n’udummiri maka na ọ bụ aka mere azụ ọ
gbaa nkụrụnkụ. Ọ bụkwuazị mmiri na-enyere akwụ aka o were
gbaa mmanụ. Ọ bụ ya kpatara m ga-eji were ohere a kelee ndị
niile nyeere m aka n’ụzọ dị iche iche nke mere ka mụ bụ opi
na-afụ ugbua. Esi m na mgbaziọnụ ha, nkwado ha pụrụ iche na
ọtụtụ aro dị iche iche ha tụnyeere m were ghọta n’ezie na onye
hapụ ihe ya na chi ya kwuru ọ bụrụ onye nwụrụ anwụ.
N’ihi nke a, aga m eji ohere a were kelee Maazị Ezekwesili E.C
(Former Chairman, Civil Service Commission, Enugu) onye
nke meere mụ karịa ihe nna ga-emere nwa ya. Enyemaka ya
n’ebe m nọ so were nyere aka ka mmụta m pụta ìhè. Amaghị m
otu mụ ga-esi kelee ya. Mana otu o sila dị, ana m echeta ya
mgbe ọbụla na ndụ m ma na-arịọkwuazị Chineke ka ọ nọnyere
ya n’ebe ọbụla ọ nọ.
31
Ka Chineke Nna bi n’eluigwe nọnyere ya mgbe ọbụla, n’ihe
ọbụla ọ na-eme na ebe ọbụla ọ nọ.
32
Prọfesọ Iwu Ikwubụzo, Dr Bright Nnabuihe, Department of
Igbo, University of Lagos.
N’ezie, ụwa naanị otu onye bi na-aka mma n’afọ. N’ihi nke a,
ana m ekele ndị niile m gụrụ akwụkwọ ha nke m si na ha nwee
nghọta nyeere m aka ijiri depụta nke m.
Chinedum E. Ofomata
National Chairman,
Association for the Survival of Igbo
Language and Culture (ASILAC)
33
MAKA AKWỤKWỌ A
Ekwe kụọ, ama agbaa maka na onye kuliri ọtọ nwere be ọ na-
eje. Tọọ ntị n’ala ka ịnụ ụya agbịsị.
Akwụkwọ a gbalirị nke ọma n’ịrụtụ aka n’ụzọ pụrụ iche n’ihe
ọmụmụ ụtọasụsụ Igbo. Ndewonụ! Ka Chukwu dubenụ anyị
n’ihi na ọ bụ Chi m na-edu m.
Chinedum E. Ofomata.
National Chairman,
Association for the Survival of Igbo
Language and Culture (ASILAC)
34
NỤRU NKE A!
35
Anyị echefuola na ogwumagala sị na onye chaa ka o si acha, ọ
chagharịa ụdịrị ọzọ. Edegharịala m akwụkwọ a ma bigharịa ya,
ugbua. Maka na otu nwoke sị na onye gbaa ụdịrị egwu ọ gbara,
ya agbaa ụdịrị ọzọ. Onye ọsọ chụkatara o were gbalaa ikwunne
ya, agbachaala ihe niile ọ ga-agba n’ọsọ. Agbalaala m ikwunne
m. Ndị na-achụ m, achụzila m. Anụ ọbụla kwesịrị ka ọ kpaa
n’ọwarị nke ya. Onye hapụ nke ya were gawa na nke onye ọzọ,
ọ bụrụ nsogbu. Asịghịkwa m nwata achọla nke ya kama nwata
emebikwala nke okenye. Maka na atụrụ ọbụla hụrụ m were puo
mpi, aga m eji mpi ya ńụọ mmanya.
Chinedum E. Ofomata
National Chairman,
Association for the Survival of Igbo
Language and Culture (ASILAC)
36
NKUZI ỤTỌASỤSỤ NKE MBỤ
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE MBỤ
MKPỤRỤEDEMEDE ABIDỊỊ IGBO
(MMALITE YA, ỤDỊ YA NA ODIDE YA)
Ndị ọcha ji ozi ọma were bata n’ala Igbo na senchụrị nke
irinaitoolu (19th Century), gbalịrị nke ọma n’iwepụta
mkpụrụedemede a ga-eji were na-ede asụsụ Igbo. Ọ bụ ha
wepụtara mkpụrụedemede abịdịị izizi e jiri malite dewe asụsụ
Igbo n’akwụkwọ. Mkpụrụedemede abịdịị Igbo e wepụtara
n’izizi e jiri malite dewe asụsụ Igbo bụ nke nwoke onye Jamani
(Germany) aha ya bụ profesọ Lepsius weputara n’afọ 1854.
Aha e jiri mara mkpụrụedemede abịdịị Igbo ahụ bụ
Mkpụrụedemede Lepsius (Lepsius Alphabet) maọbụ Standard
Alphabet na bekee (Nwadike, 2002). Mkpụrụedemede ndị ahụ
dị ka Lepsius siri wepụta ha bụ ndị a na-esota ugbua:
37
a b d e f g h i
k l m n o p r s
t u v w y z gb gh
gw kp kw n nw ny o š
dš tš
Mkpụrụedemede ahụ e depụtara n’elu dị iriatọ na-anọ.
Mkpụrụedemede ndị e bu ụzọ wepụta bụ ndị a:
a b d e f g h I
k l m n o p r s
t u v w y z
E mechaa gbakwụnyekwara ha mkpurụedemede ndị a:
(Nwadike, 2002) gb, gh, gw, kp, kw, n, nw, ny, o, š, dš, tš
a b ch d e f g
gb gh gw h i ị j
k kp kw l m n ń
nw ny o ọ p r s
sh t u ụ v w y
z
Mkpụrụedemede abịdịị Igbo ndị ahụ e depụtara n’elu bụ
n’obere mkpụrụedemede ka e depụtara ha. A ga-edepụtakwuazị
ha na nnukwu mkpụrụedemede. Lee ha na nnukwu
mkpụrụedemede dị ka e siri hazie ha ma wepụta ha:
A B CH D E
F G GB GH GW
H I Ị J K
KP KW L M N
Ñ NW NY O Ọ
P R S SH T
U Ụ V W Y
Z
Ọ bụ mkpurụedemede ndị a (ma nke obere, ma nke nnukwu) ka
e ji ede asụsụ Igbo ugbua. Ọ bụkwa mkpụrụedemede kwesịrị ka
onye ọbụla na-amụ asụsụ Igbo, na-agụ asụsụ Igbo, na-asụ asụsụ
Igbo ma na-ede asụsụ Igbo, mara nke ọma.
40
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE ABỤỌ
ỤDAUME (VOWELS)
A E I Ị O Ọ U Ụ
a e i ị o ọ
43
Mkpụrụedemede ụdaume nwere òtù abụọ. Ihe nke a pụtara bụ
na e kewara ụdaume ụzọ abụọ. Ụzọ abụọ ahụ e kewara ya ka a
maara dị ka òtù ‘A’ na òtù ‘E’. Ihe nke a na-akọwa bụ na
mkpurụedemede ụdaume dị asatọ n’ọnụọgụ, nwechara otu nke
ọbụla n’ime ha nọcha na ya. Ọ bụ site n’otu nke ọbụla n’ime ha
si ada ụda na-akọwa òtù nke ọbụla n’ime ha ga-anọ na ya. Òtù
‘A’ ka a maara dị ka ụdaume mfe maọbụ ụdamfe (Light
Vowels). Òtù ‘E’ bụrụkwa nke a maara dị ka ụdaume Arọ
maọbụ Ụdaarọ (Heavy Vowels). A ga-edepụta òtù abụọ ahụ
n’otu n’otu ma kọwaa ha.
a ị ọ ụ
44
Ụdaume arọ bụkwụazị mkpurụedemede ụdaume ndị nọ n’otu
‘E’. Mkpurụedemede ụdaume ndị a bụ mkpụrụedemede
ụdaume ndị ahụ ụda ha na-anyị arọ n’ọnụ ma a na-akpọputa ha.
Ha dịkwuazị mkpụrụedemede anọ dị ka mkpụrụedemede
ụdaume mfe siri dị. N’ime mkpụrụedemede ụdaume arọ anọ
ahụ e nwere, o nweghị nke ọbụla n’ime ha na-ebu ntụpọ dị ka e
siri nwee n’ụdamfe. Naanị otu mkpụrụedemede n’ime ha na-
enwe ntụpọ n’elu ma e depụta ya n’obere mkpụrụedemede.
Mkpụrụedemede ahụ bụ ‘i'. Mana ọ bụrụ na e depụta
mkpụrụedemede ‘i' na nnukwu mkpụrụedemede, ọ naghị ebu
ntụpọ ma elu, ma ala. A ga-edepụta mkpụrụedemede ụdaume
arọ ndị ahụ e nwere. Ha bụ ndị a:
e i o u
Ọ bụ otu a ka e si ede ụdaume arọ (ụdaarọ) - (Heavy Vowels)
n’obere mkpụrụedemede. A ga-edepụtakwa ha na nnukwu
mkpụrụedemede. Nnukwu mkpụrụedemede ha bụ ndị a:
A I O U
Ma ụdaume arọ ma ụdaume mfe, ọ bụ ha jikọrọ ọnụ were mebe
mkpụrụedemede ụdaume dị asatọ n’ọnụọgụ.
Ụ O U Ọ
47
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE ISE
NDAKỌRỊTA ỤDAUME
a e i ị o ọ
N’ime mkpụrụedemede asatọ ahụ e depụtara n’elu, e kewara ha
ụzọ abụọ. Ụzọ abụọ ahụ ka a maara dị ka òtù abụọ: Òtù ‘A’ na
Òtù ‘E’. Òtù ‘A’ ka a maara dị ka ụdaume mfe maọbụ ụdamfe
(light vowels), mana Òtù ‘E’ ka a maara dị ka Ụdaume Arọ
maọbụ Ụdaarọ (Heavy Vowels). Òtù ọbụla n’ime ha nwere
mkpụrụedemede anọ n’otu n’otu. Lee ka ha siri kwụrụ n’ihe
ngosipụta:
48
Okwu ọbụla maọbụ mkpụrụokwu ọbụla n’asụsụ Igbo bụ nke
ụda ya na nghọta ya na-ezu oke ma pụta ihe nke ọma site na
njekọrịta maọbụ nnọkọrịta ọnụ mkpụrụedemede ụdaume nọ
n’otu òtù na-anọkọta maọbụ na-ejekọrịta. Okwu Igbo maọbụ
mkpurụokwu Igbo bụ ndị a na-enweta ezi nghọta ha, nsụpe ha,
ụda ha na nkọwa ha site na mbiakọ ọnụ mkpụrụedemede
ụdaume nọ n’otu òtù na-abịakọ ma na-emekọrịtakwa. N’ihi nke
a, ndakọrịta ụdaume bụ ụdaume isi n’otu òtù were mewe okwu
maọbụ mkpụrụokwu. Iji maa atụ:
49
Dị ka Emenanjo siri kọwaa, e nwere ihe osise banyere
Ndakọrịta ụdaume. Ihe osise ahụ bụ nke a na-esota ugbua.
ỤDÀMFE
Oghe
(Nghezu)
(Non-close)
e a ọ o
ỤDÀARỌ
b ch d f g gb gh
gw h j k kp kw l
m n ń nw ny p r
s sh t v w y z
51
Mkpụrụedemede mgbochiume ndị ahụ e depụtara n’elu bụ
obere mkpurụedemede mgbochiume. A ga-edepụtakwuazị ha
na nnukwu mkpụrụedemede. Ha bụ ndị a na nnukwu
mkpurụedemede:
B CH D F G GB GH GW H
J K KP KW L M N Ñ NW
NY P R S SH T V W Y
Z
11. Kọwaa nke ọma ihe bụ ụdaume ihu ọnụ na ụdaume azụ
ọnụ. were ihe ọmụmaatụ were chọọ mkọwa gị mma nke
ọma.
53
NKUZI ỤTỌASỤSỤ NKE ABỤỌ
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE MBỤ
ỤDAMKPỊ (DIPHTHONG)
Ị U I Ụ
E nweghị mkpụrụokwu
nwere ụdamkpị na-enwe mkpụrụedemede ụdaume ndị a dị ka
54
mkpụrụedemede ụdaume ikpeazụ. Mana mkpụrụedemede
ụdaume ndị na-anọ n’azụ mkpụrụokwu nwere ụdamkpị bụ ndị
a:
a o e ọ
ụọ io ie Uo ịọ ịa
Okwu ndị a e depụtara e si na ha enweta ụdamkpị dị isii
n’ọnụọgụ. A ga-eji ha mee mkpụrụokwu n’otu n’otu iji were
zipụta nke ọma ihe a na-akọwa maka ha. Lee ịmaatụ ndị a:
ỤDAMKPỊ
56
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE ABỤỌ
UDANGE (MONOPHTHONG)
57
ỤDANGE
S/n Mkpụrụokw Ahịrịokwu e jiri ya mee
u
1. Chọọ Soro ha chọọ ego ahụ
2. Meere Onye meere m ihe m na-achọ
3. Kpọọrọ Amaka kpọọrọ nwanne ya
4. Dọọ Gwa ya ka ọ dọọ ya aka na ntị.
5. Mgbaaka Nne m nwere ọmarịcha mgbaaka.
6. Kpeenu Kpeenụ ya n’aka onye nkuzi unu.
7. Mịịrị Nwoke ahụ bụ mịịrị ego m.
8. Kweere Emeka kweere ya ọnya.
9. Chaa Kuru nwa ahụ chaa n’ụzọ.
Ihe ịmaatụ ndịa e depụtara bụ iji kọwaa nke ọma ihe akwụkwọ
a na-akụzi banyere ụdange (short vowels). O kwesịkwara ka
anyị ghọta na ụdamkpị na ụdange, na ha abụọ bụ nwanne na
nwanne otu ụdịrị afe (uwe).
62
6. Kedụ ihe kpatara e ji akpọ mkpụrụedemede
mgbochiume ụfọdụ myiriụdaume?
63
NKUZI ỤTỌASỤSỤ NKE ANỌ
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE MBỤ
OLILO ỤDAUME
66
Okwu Igbo Njekọ Ọnụ Olilo Mmakọ
i ụda ya ụda + ya ụdị a
iii ego ya ego + ya egi e
iii ọnụ ya ọnụ + ya ọnị a
iv oche ya oche + ya ochi e
v ije ya ije + ya iji e
vi
mkpa ya mkpa + ya mkpị a
vii
nwanne ya nwanne + ya nwanni e
viii
ix anya ya anya + ya anyị a
x uche ya uche + ya uchi e
akwa ya akwa + ya akwị a
Ihe ọmụmaaatụ niile ndị ahụ niile e depụtara bụcha ihe ịmaatụ
ndị e jiri were kọwaa OLILO MMAKỌ dị ka otu n’ime ụdịrị
olilo ụdaume e nwere.
Ihe ọmụmaatụ ndị ahụ niile e depụtara n’elu bụ iji were nyere
gị aka n’ihe ọmụmụ gị banyere Olilo Mmakọ dị ka o siri dị
n’ahịrịokwu. Chepụtazịa ọtụtụ ihe ọmụmaatụ ndị ọzọ banyere
ya.
68
maọbụ n’ahịrịokwu ọ dabanyere na ya. Ihe ọmụmaatụ ndị ahụ e
deputachara n’elu bụ ọnọdụ ụda olilo mmakọ n’ahịrịokwu.
70
eziokwu na Olilo Azụ bụ olilo ụdaume kacha apụta ìhè n’asụsụ
Igbo, mana e nwekwuazịrị Olilo Ihu.
Olilo Ihu bụ ụdịrị olilo ụdaume nke a na-enweta ma ọ bụrụ na
mkpụrụedemede ụdaume nọdebe onwe ha n’okwu Igbo. Ụdịrị
olilo a bụ Olilo Ihu na-apụta ìhè ma ọ bụrụ na mkpụrụọkwu
abụọ nwechara mkpụrụedemede ụdaume na ngwụcha
mkpụrụokwu bu ụzọ na mmalite mkpụrụokwu na-esota, ejekọọ
ọnụ. a na-enweta olilo ụdaume keihu (olilo ihu) ma ọ bụrụ na
mkpụrụedemede ụdaume bu ụzọ ewere ọnọdụ ya, ọdịdị ya na
ụda ya were gbanwee ọnọdụ, ụdịdị na ụda ụdaume na-esota ya.
N’olilo ihu, mkpụrụedemede ụdaume bu ụzọ na-anọchite anya
mkpụrụedemede ụdaume na-esota ya, n’ụdị ụda na ọdịdị ya.
Ụdaume ahụ na-esota nke bu ụzọ na-ahapụzị ọnọdụ ya were
gbasowezịa ọnọdụ ụdaume nke bu ụzọ. Ọmụmaatụ banyere
olilo ihu bụ ndị a:
72
nwere Olilo Nlocha, a na-esi n’ụda ha were na-amata ha. Lee
ihe ọmụmaatụ ndị a na-esota:
Okwu Igbo Olilo Nlocha
I Ede Orie Edoorie
iii Oke Osisi Okoosisi
iii Akwa Ọsa Akwọọsa
iv Ego Igwe Egiigwe
V Ọgba Ọsọ Ọgbọọsọ
vi Ikwa Emu Ịkweemu
74
1. Kedụ otu e si achọpụta olilo ụdaume n’ụtọasụsụ Igbo?
2. Were aka gị chọpụta mkpụrụokwu iri ndị nwere olilo
ụdaume. E dekwala ndị dị n’akwụkwọ a.
75
NDAPỤ ỤDAUME (VOWEL ELISION)
76
na-ese elu ozigbo ma ọ bụrụ na e jikọọ okwu ụfọdụ ọnụ
n’asụsụ Igbo.
79
Mkpụrụedemede Mgbochiume ndị ahụ a kachara ihe n’okpuru
bụ ndị a na-achọ achọ na mkpụrụokwu ebe ha kwesịrị ịdị nke
mere ka mkpụrụokwu ndị ahụ nwee ndapụ mgbochiume.
Mkpụrụokwu ndị ahụ dịcha n’akpati ihe osise ahụ e sepụtara
n’elu dịka Aịhịa, Ọụmụ, Ụịcha, Aụkọ, Oume, Ougwu, Aịcha,
Ougbu nwechara ndapụ mgbochiume n’ihi na mkpụrụedemede
mgbochiume kwesịrị imezu mkpụrụokwu ndị ahụ adịghị na ha.
Mkpụrụedemede mgbochiume ndị ahụ bụ ndị a: h, m, ch, k,
m, gw, ch, g.
80
NKUZI ỤTỌASỤSỤ NKE ISII
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE MBỤ
NSINANGWAA (VERBAL DERIVATIVES)
A. ÒMEKÀNGWAÀ (PARTICIPLE)
Omekangwaa bụ otu n’ime aha e si na ngwaa enweta. Ọ na-arụ
ọrụ dị ka ngwaa ma ọ kwụrụ onwe ya. Otu e si enweta
omekangwaa bụ site n’itinye mgbakwụnye nganiihu A maọbụ
E n’isingwaa. A na-eme nke a site n’ịgbaso usoro ndakọrịta
ụdaume. A ga-ejide n’aka na ọ dabara n’usoro ndakọrịta nke
ụdaume.
Isingwaa Mgbakwụnye nganiihu Omekangwaa
‘A’(a) maọbụ ‘E’(e)
i je e + je eje
ii ga a + ga aga
iii de e + de ede
iv nwụ a + nwụ anwụ
v chọ a + chọ achọ
vi be e + be Ebe
vii ri e + ri Eri
vii ba a + ba Aba
i
ix ti e + ti eti
81
x re e + re ere
xi kọ a + kọ akọ
xii kụ a + kụ akụ
xii gwụ a + gwụ agwụ
i
xiv gba a + gba agba
xv zu e + zu ezu
xvi zụ a + zụ azụ
82
(xii) Aga m agba egwu awantịrọ echi (agba egwu)
B. MFINITIIVU (INFNITIVE)
Mfinitiivu bụkwa mkpurụokwu nsinangwaa ọzọ e nwere
n’ụtọasụsụ Igbo. Ọ bụkwa aha e si na ngwaa enweta. Ọ kwụrụ
onwe ya, ọ ga-arụ ọrụ dị ka aha. Mkpurụedemede ndị e ji
enweta mfinitiivu bụ I na Ị. A na-agbakwụnyere
mkpụrụedemede ndị a dị ka nganiihu n’isingwaa iji were nweta
nsinangwaa mfinitiivu. A na-esokwuazị usoro ndakọrịta
ụdaume ma a na-eme nke a. Ụdaume ọbụla dị n’isingwaa a
chọrọ isi na ya were nweta mfinitiivu, a ga-agbakwụnyere ya I
maọbụ Ị nke ha abụọ si n’otu òtù.
83
x de i + de ide
xi nwụ ị + kọ ịkọ
xii gọ ị + gọ ịgọ
xiii ri i + ri iri
xiv ke i + ke ike
xv chụ ị + chụ ịchụ
84
Mkpurụokwu ndị a a kachara ihe n’okpuru bụcha mkpụrụokwu
mfinitiivu. Ọ bụ otu a ka ha si arụ ọrụ n’ahịrịokwu. E
nwekwuazịrị mfinitiivu ndị nwere nsonaazụ. Ha bụ ndị a:
85
Isingwaa Mwekọta Isingwaa Mgbakwụny Jerọndụ
isingwaa e si na e nganiihu Ọ
abụọ ahụ ha nweta maọbụ O
ọnụ
i ńụ ńụ + ńụ ńụńụ Ọ +ńụńụ Ọńụńụ
ii kwụ kwụ+ kwụ kwụkwụ Ọ+kwụkwụ Ọkwụkw
ụ
iii sụ sụ + sụ sụsụ Ọ + sụsụ Ọsụsụ
iv gụ gụ + gụ gụgụ Ọ + gụgụ Ọgụgụ
v Bi bi + bi bibi O + bibi Obibi
vi lụ lụ + lụ lụlụ Ọ + lụlụ Ọlụlụ
vii Chu chu+ chu chuchu O + chuchu Ochuchu
vii Ti ti + ti titi O + titi Otiti
i
ix mụ mụ + mụ mụmụ Ọ + mụmụ Ọmụmụ
Lee ihe ahụ e sepụtara n’elu anya nke ọma ka ị mụta otu e si
enweta jerọndụ ụfọdụ. Nke a na-sota ugbua bụ ebe e ji
mkpụrụokwu jerọndụ ndị ahụ were mee ahịrịokwu.
86
O nwekwara isingwaa abụọ ndị ọ na-abụ a chịkọọ ha ọnụ
n’atụmatụ iji ha nweta jerọndụ, mkpurụedemede ụdaume izizi
dị na ya bụ isingwaa e wekọtara ọnụ na-agbanwo.
91
IHE OMUME SITE NA NKUZI ỤTỌASỤSỤ NKE ISII
1. Gịnị bụ nsinangwaa?
2. Kọwaa ihe Jerọndụ pụtara n’asụsụ Igbo. Were ihe
ọmụmaatụ iri kọwaa azịza gị.
A. NGANIIHU (PREFIX)
Nganiihu bụ mkpụrụasụsụ ọbụla a gbakwụnyere n’ihu isingwaa
iji were nweta mkpụrụokwu e bu n’uche. Mkpụrụasụsụ
nganiihu ọbụla na-enwekwuazị ụda na mkpụrụokwu ọbụla ọ
banyere n’ime ya. O na-enyekwuazị mkpụrụokwu ahụ nghọta a
chọrọ. Ghọtakwa nke ọma na nganiihu abụghị mkpụrụedemede
ọbụla bu ụzọ n’okwu. Ọ bụ usoro niile ahụ e depụtara maka
inweta nganiihu ka i kwesịrị ịgbaso ma ị chọọ i nweta nganiihu
n’ihe ọmụmụ asụsụ Igbo.
94
Mkpụrụokwu ndị a na-esota ugbua bụ ndị a ga-esi na ha
gosipụtara otu na ebe mgbakwụnye nganiihu na-adị na
mkpụrụokwu.
96
Ngwaa abụọ Mkpụrụ- Ijikọ ha Mkpụrụ- Nnọnee
bụ otu ụdị edemede ọnụ ka ha okwu si titi
Mgbochiu bụrụ na njikọ
me ga-anọ mkpụrụ- ha ọnụ
n’etiti okwu were pụta
mkpụrụ-
okwu
abụọ
ahụ
i aba, aba m aba+m+aba abamaba M
ii ome, ome k eme+k+ome omekome K
iii esi, esi m esi+m+esi esimesi M
iv aka, aka r aka+r+aka akaraka R
n eri, eri m eri+m+eri erimeri M
vi ebe, ebe l ebe+l+ebe ebelebe L
vi ekwu,ekw r ekwu+r+ek ekwurekw R
i u wu u
vi odu, odu m odu+m+odu odumodu M
ii
ix echi, echi m echi+m+ech echimechi M
i
x oko, oko m oko+m+oko okomoko M
xi aga, aga d aga+d+aga agadaga D
xi mba, mba da mba+da+mb mbadamba Da
i a
(iii) Ihe gbasara esimesi doro nwaada ahụ anya nke ukwu.
(v) Nwoke ahụ chọrọ iji erimeri were merụọ anyị ahụ na
mmemme ahụ e mere.
CH. NSONAAZỤ
Nsonaazụ bụ mkpụrụedemede maọbụ mkpurụasụsụ a na-
agbakwụnyere mkpurụokwu ijiri kọwapụta nghọta e bu n’uche
maka mkpụrụokwu ahụ. Nsonaazụ na-enyere aka na mmebe
okwu n’asụsụ Igbo n’ihi na mkpurụokwu ọbụla ọ batara na ya
ga-ahapụ nghota ọ nọbụ na ya tupu ya bụ mgbakwụnye, ghọrọ
ebumnuche okwu a chọrọ. Mkpụrụokwu ngwaa maọbụ
mkpụrụasụsụ nwere ike inwe mgbakwụnye nsonaazụ.
98
Mkpụrụokw Mgbakwụnye Mkpụrụokw Nsonaaz
u mkpụrụedemede u e nweta ụ
ụdaume maọbụ
mkpụrụasụsụ
nsonaazụ
n’okwu
i zi zi +e zie e
ii sụ sụ + ọ sụọ ọ
iii da da + ra dara ra
iv rụ rụ + ọ rụọ ọ
v di di + e die e
vi me me + e mee e
vii kọ kọ + ọ kọọ ọ
vii be be + re bere re
i
ix kpọ kpọ + ọ kpọọ ọ
x zi zi + ri ziri ri
I. NSONAAZỤ MGBANWE
Nsonaazụ mgbanwe bụ mkpụrụasụsụ mgbakwụnye na-
etinyekwu nghọta na mkpurụokwu. Ọ na-eme ka nghọta
ebumnuche okwu ahụ a gbakwụnyere zuo oke. Ihe ọmụmaatụ
nsonaazụ mgbanwe bụ ndị a:
chọọ kụọ lie mee kpụọ
baa mịa kuo tie pụọ
dụọ bee kwuo rịa mụọ
99
buo fee gbaa
D. NSOKWỤNYE (ENCLITIC)
Nsokwụnye bụkwa mgbakwụnye ọzọ e nwekwara n’asụsụ
Igbo. Nsokwụnye bụ mgbakwụnye ikpeazụ a na-etinye na
mkpụrụokwu ijiri nweta nghọta ihe e bu n’uche. Mgbakwụnye
nsokwụnye na-arụtụ nghọta okwu aka site n’ọnọdụ ya n’okwu.
Mgbakwụnye nsokwụnye nwere ike kwụrụ onwe ya n’azụ
mkpụrụokwu ọ ga-ahụ onwe ya, maọbụ nọnyere mkpụrụokwu
ọ na-akọwa. Ma ọ nọdụụrụ onwe ya, ma ọ na-anọnyere
mkpụrụokwu, ọnọdụ ya na mkpụrụokwu ga-abụrịrị n’azụ
mkpụrụokwu ahụ ọ na-akọwa.
Dị ka otu aha ya siri dị, ọ bụghị na ọ bụrụ na ọ dịghị n’okwu na
okwu ahụ agaghị enwe nghọta; kama ọ na-abụ mgbakwụnye a
gbakwụnyere n’okwu ijiri wetaruo nkọwa okwu ahụ n’isi.
100
Mgbakwụnye nsokwụnye na-adị na mkpụrụokwu mkpọaha,
nnọchiaha na ngwaa.
103
6. Nyochaa nsonaazụ mgbanwe na nsonaazụ mgbatị nke
ọma ka i were ahịrịokwu dị iche iche were kọwaa ọdịdị
ha na ndịiche ha.
104
AMỤMÀMỤ ỤDÀASỤSỤ/FÒNETIIKISI – (PHONETICS)
105
Ụda okwu ọbụla a na-ekwupụta nwere otu e si emewe ya na
kwa ka e si akpọpụta ya. O nwekwara ihe ndị na-ejikọ aka ọnụ
iji were hụ na ụda okwu bụ nke e si n’ebe mmadụ Chukwu kere
were na-anụ. N’ihi nke a, ọ ga-abụ ihe magburu onwe ya ka e
leba anya na mpaghara dị iche iche e nwere n’amụmamụ
ụdaasụ/fonetiikisi. Amụmamụ ụdaasụsụ dị mpaghara atọ.
Mpaghara ụdaasụsụ ndị ahụ e nwere na mmewe okwu Igbo bụ
ndị a:
i) Amụmamụ Mkpọpụta ụda - Articulatory
Phonetics
ii) Amụmamụ Ọdịdị Ụda - Acoustic
Phonetics
iii) Amụmamụ Anụmụda - Auditory
Phonetics
108
2. Gịnị bụ amụmamụ mkpọpụta ụda?
111
iche na mkpụrụedemede mana ọ bụ site na mkpọpụta
mkpụrụedemede ka e si ezipụta mkpụrụụdaasụsụ n’okwu.
NDEPỤTAGHARỊ
OKWU/ MKPỤRỤỤDAASỤSỤ MKPỤRỤỤDAASỤSỤ
MKPỤRỤOKWU (FỌNỊM) - PHONEME
(WORDS) (PHONEMIC
TRANSCRIPTION)
I chee, kee /ts/ /k/ /ch/ /k/
113
Mkpụrụụdaasụsụ nwere nkeụdị abụọ. Ọ bụ nkeụdị abụọ ahụ ka
a maara dị ka mpaghara ụdịrị ụda abụọ a na-ahụtawa ma na-
achọpụtakwa n’ime mkpụrụụdaasụsụ. Ụzọ ụda abụọ a na-ekwu
maka ha bụcha mkpụrụụdaasụsụ, mana o kwesịrị ka a mata ka
ha siri kwụrụ na kwa ka ụda siri dịrị n’ụda mkpụrụụdaasụsụ ha
nọcha na ya. Nkeụdị mkpụrụụdaasụsụ ndị ahụ e nwere bụ
Mkpụrụụdaasụsụ Ụdanke (Segmental Phoneme) na
Mkpụrụụdaasụsụ Ụda Nsokwasị Nke (Suprasegmental
Phoneme). A ga-edepụtazi nkeụdị ụda abụọ n’otu n’otu ma
nyekwa nkọwa ha dị ka o siri kwesị.
114
NDEPỤTAGHARỊ
MKPỤRỤỤDAASỤSỤ MKPỤRỤỤDAASỤSỤ
ỤDANKE ỤDANKE
(SEGMENTAL PHONEME) (TRANSCRIPTION OF
SEGMENTAL PHONEME)
a
ụ
ọ
i i
ị
e e
b b
t ch
d d
f f
g g
r gh
gw gw
L l
m m
n n
.
n
w nw
ny
o o
p p
r r
s s
sh
t t
h h
d j
k k
v v
z z
w w
115
Mkpụrụụdaasụsụ Ụdanke ndị ahụ niile e depụtara ma
tụgharịkwa n’ụzọ onye na-amụ ya maọbụ na-agụ ya ga-esi
ghọta bụ mkpụrụụdaasụsụ na-adị n’okwu. Ọ bụkwa n’ime
okwu ka ha na-arụ ọrụ ma na-aputakwa ihe.
118
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE ISE
MKPỤRỤASỤSỤ (MỌFỊM) – MORPHEME
120
Nnọchiaha niile ahụ a kachara ihe n’okpuru rụchara ọrụ dị ka
mkpụrụasụsụ n’ahịrịokwu ahụ ha nọcha na ya.
(i) NDỊICHE DỊ N’ETITI MKPỤRỤASỤSỤ NA
MKPỤRỤỤDAASỤSỤ
Mkpụrụasụsụ (Mofịm) bụ ụmụ mkpụrụ okwu nwere ike ịkwụrụ
onwe ya ma ọ bụrụ na e kewapụta ya n’okwu maọbụ na
mkpụrụokwu ọ dị na ya. O nwekwara otu mkpụrụokwu ga-esi
dị, ọ gaghịkwa ekwe nkeri. Ọnọdụ dị otu a na-eme
mkpụrụokwu ahụ ọ bụrụ mkpụrụasụsụ n’ihi na e keribe ya
(ụdịrị mkpụrụokwu ahụ) ọ dịghị ihe ọbụla a ga-esi na ya
kewapụtakwa ọzọ. Mkpụrụasụsụ (Mọfịm) na-enwe nghọta ma
nwekwuazị ụda ma ọ bụrụ na ọ kwụrụ onwe ya maọbụ e
kewapụta ya n’okwu.
122
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE ISII
ỤDỊ MKPỤRỤASỤSỤ (MỌFỊM) E NWERE
x jụọ jụ - ọ abụọ
a ị o e ọ i
125
xi so so otu
126
NKUZI ỤTỌASỤSỤ NKE IRI
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE MBỤ
MMEBE OKWU (WORD FORMATION)
MKPỤRỤOKWU (WORD)
MKPỤRỤOKWU (WORDS)
i. Anyị
ii. Echiche
iii. Anyanwụ
iv. Mmadụka
v. Ekwuchabeghị
vi. Pụtakwa
vii. Udu
viii. Ya
ix. Achọpụtabeghịkwa
x. Ọsọ
xi. Gị
xii. Esinyela
xiii. Bi
xiv. Ndụka
xv. Mkpụgharị
xvi. Ndụ
xvii. Odudu
xviii. Etigbuchaala
xix. Unu
128
NDỊICHE DỊ N’ETITI MKPỤRỤEDEMEDE NA
MKPỤRỤỤDAASỤSỤ
Mkpụrụedemede e nwere n’asụsụ Igbo dị iriatọ na isii. Ọ
bụkwanụ n’elu mkpụrụedemede ndị ahụ e nwere ka a na-
agbado ụkwụ na-ede asụsụ Igbo. Mmụta mkpụrụedemede
asụsụ Igbo bụ mmalite mmụta asụsụ Igbo.
130
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE ABỤỌ
NDỊICHE DỊ N’ETITI MKPỤRỤOKWU NA
MKPỤRỤASỤSỤ
131
kewapụta ga-aghọrịrị ihe ọzọ na nghọta ma dịkwa iche na
mkpụrụokwu o siri na ya pụta.
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE ATỌ
NKEBIOKWU/ USOROOKWU – PHRASE
i. Onye ahụ
ii. N’ime itemmiri
iii. Nna ya
iv. Oche nke ya
v. Nwa ewu ahụ
vi. Ọba ji nna anyị ha
vii. Na mgbede anyasị ụnyahụ
viii. Ụbọchị nwanne m
ix. Na mgbada ugwu
x. Tupu nwanne echi
xi. Ego nwata a
xii. Ụmụnne nwunye ya
132
Okwu ndị ahụ niile e depụtara n’elu bụcha
Nkebiokwu/Usorookwu. O nweghị otu n’ime ha nwere ngwaa
ma ya fọdụkwa izu oke na nghọta.
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE ANỌ
ỤDỊRỊ NKEBIOKWU DỊ ICHE ICHE
i. Ụlọ ewu
ii. Azụ mmiri
iii. Ode akwụkwọ
iv. Akị bekee
v. Ụzọ ndụ
vi. Ukwu ụdara
vii. Ụlọ mmadụ
viii. Egwu ọnwụ
ix. Isi anụ
x. Aka ike
xi. Oti mkpu
133
xii. Oke dibịa
i. Nwoke ojii
ii. Olu ogologo
iii. Afọ ọjọọ
iv. Anya mkpọ
v. Ụkwụ ọma
vi. Aka mkpụmkpụ
vii. Olu ọma
viii. Eze akanwụ
ix. Anụ ure
x. Ọkpa atụrụ
xi. Akwa ọcha
xii. Ọnụ ọjọọ
137
(i) Isiokwu: Onye ahụ a na-ekwu maka ya bịara ebe a
Maọbụ
(ii) Nnaara: Onye bịara ebe a taata bụ onye ahụ a na-
ekwu maka ya.
138
amata ihe okwu na-achọ ịkọwa. A ga-edepụta ihe ịmaatụ
ụfọdụ:
i. Ụlọ ahụ unu nọ na ya.
ii. Ji ahụ unu riri
iii. Egwu ọnwa ahụ Uchenna pụrụ n’anyasị
iv. Ego o retere n’ọkụkọ ahụ.
v. Okwu ahụ o kwuru.
vi. Ohi ahụ ha zuru
vii. Ihe o tiri m
viii. Ọsọ ọ gbara.
AHỊRỊOKWU (SENTENCE)
Ahịrịokwu bụ okwu zuru oke, nwee ngwaa ma nwekwuazị
nghọta doro anya. Ahịrịokwu anaghị adị na nkeji okwu. Ọ na-
adị n’okwu zuru oke ma nwekwuazị nghọta zuru oke. Ọ bụ ya
kpatara na nkebiokwu na nkebiahịrịokwu dịcha na nkeji okwu
ezughị oke, ejighị bụrụ ahịrịokwu. Ọ bụghị naanị na nkebiokwu
na nkebiahịrịokwu anaghị ezu oke na nghọta, kama ụfọdụ
n’ime ha anaghịkwa enwe ngwaa dị ka otu o siri dị na
NKEBIOWU (PHRASE). Nke nwekwaranụ ngwaa anaghịkwa
ezu oke na nghọta dị ka o siri dịkwa na NKEBIAHỊRỊOKWU
(CLAUSE).
151
NKUZI ỤTỌASỤSỤ NKE IRI NA OTU
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE MBỤ
OLUNDỊ (OLUMBA)
152
Ọ bụ eziokwu na olu ndị ahụ bụcha asụsụ Igbo mana ka e si asụ
ha dịcha iche. Ọ bụghị otu e siri dowe olu sụọ nke a ka a ga-esi
dowe olu sụọ ibe ya. Ụfọdụ n’ime olu Igbo ndị ahụ e
nwegachara bụ ndị a:
OLUNDỊ/OLUMBA STEETI Ọ DỊ NA
YA
1 Olu Nsụka, Olu Udi, Steeti Enugu
Olu Agbanị, dgz
2 Olu Abakeleke, Olu Afịkpo, Steeti Ebọnyị
Olu Ọhaọzara dgz
3 Olu Ụmụahịa, Olu Ngwa, Steeti Abịa
Olu Ndọkị, Olu Bende,
Olu Mbieri dgz
4 Olu Ọnịcha, Olu Ọka, Steeti Anambra
Olu Orumba, Olu Nnewi,
Olu Agụata dgz
5 Olu Isiokpu, Olu Ikwere, Steeti Rivers
Olụ Ndọkị dgz
6 Olu Ịka, Olu Kwale, Steeti Delta
Olu Anịọma dgz
7 Olu Owere, Olu Mbaise, Steeti Imo
Olu Nkwere, Olu Okigwe,
Olu Ọlụ, dgz
153
Olundị/Olumba (ka ndị si asụ) e nwere. Ha juru eju, bara bara,
kama, ndị ahụ e depụtara bụ naanị ndị e jiri mee ihe ịmaatụ.
werezịa aka gị chọpụtakwa ọtụtụ Olumba/Olundị ndị ọzọ e
nwegachara.
154
Onye ọbụla maọbụ ndị chọkwaranụ ide akwụkwọ n’Igbo bụ
Igbo Izugbe ka ọ ga-eji dee ya. A naghị eji Olundị/Olumba ede
akwụkwọ n’asụsụ Igbo. E were Olundị/Olumba dee akwụkwọ,
akwụkwọ ahụ anaghị ekwe ọgụgụ. Mana, ọ bụrụ n’Igbo Izugbe
ka e dere ya, ịgụ ya ana-aga werewere. Igbo Izugbe mekwara
ka Obodo/Mba dị iche iche na-asụ Igbo, maọbụ na-amụ Igbo
na-anụ ma na-aghọtakwuazị olu okwu ibe ha. Ọ bụ asụsụ Igbo
Izugbe bụ asụsụ Igbo ọ ga-abụ, onye na-asụ asụsụ Abakeleke
sụọrọ onye na-asụ asụsụ Ndọkị, ha aghọta onwe ha ozigbo.
Onye na-asụ asụsụ Ngwa na onye na-asụ asụsụ Nsụka nọdụ, ha
ana-akpọkọrịtara onwe nkata nke ọma na-enweghị ihe
ọgbatauhie ọbụla. E werekwanụ asụsụ Igbo Izugbe dee asụsụ
Igbo, ọ bụ otu onye si Afịkpo ga-esi ghọta ya ka onye si Ọka
ga-esikwuazị ghọta ya.
N’ihi nke a, Igbo Izugbe bụ asụsụ ozuru mba ọnụ nke a na-
enweghị onye, ndị, obodo maọbụ mba nwe ya. Naanị onye, ndị,
obodo maọbụ mba nwe ya bụ onye, ndị, obodo maọbụ mba
mụtara ka e si asụ ya na kwa ka e si ede ya.
OLUNDỊ/OLUMBA
I. OLU NGWA (NA STEETI ABỊA)
Whe le e ji aga/eje mba mbụ ta amụta whe, sita la whe le-eji
achọ la otule ọkụ mbụ azụ. Ma a gwọrọ ụgba ma ọ bụkwanụ
ose la a sụrụ whe liile a maara mbụ la ogiri mbụ isi mmiri.
Nwaalọ/Mwogbede ọ bụlaghị nkwesịrị ịgụsụ akwụkwọ tupu ya
156
ebido/malite chewa whe o chọwa ọ ga ịbụ ya mmee ya e gwere
ya karachaa ibe ya nde o dowe. Ọ bụghụ naanị akwụkwọ na-
ejiwe agụ nńaa/n’ụlọakwụkwọ sita la onye nrịrị elu agaala mba
laabụ. Whe ndị la ejiwe ezhi l’ụlọakwụkwọ mbụ othu la-eji
akpa agwa ọma la ndụ ọmawo/omume ọmawo. E jikwa enweta
amaminhe ke ụwa naanịa l’ụlọ akwụkwọ.
157
ụdịrị ke ndị la-agụfụghụ akwụkwọ. E ji sita la omume/ndụ we
tu chọpụta la mmadụ ndaawe nghere eghe.
IGBO IZUGBE
158
n’ihi na onye rịrị elu agaala mba naabọ. Ụlọakwụkwọ bụ ebe a
na-amụkwuazị maka ezigbo akparamagwa na omume ọma. A
na-enwekwuazị amamihe nke ụwa n’ụlọakwụkwọ.
N’ezie, ọ naghị adị mma mmadụ hụchaa ìsì o jee kpuo ya. O
kwesịkwara ka nwatakịrị ọbụla gụọ akwụkwọ nke ọma n’ihi na
ọ bụ nkụ onye kpara n’ọkọchị ka ọ na-anya n’udummiri.
Chetakwa! na ihe a na-ańụchitere diochi bụ mmanya, a naghị
adachitere ya n’elu. Marakwa!! Na ejula ọbụla kpuru ìsì bụ
onwe ya ka ọ wọrọ nri n’ihi na ntị ọbụla ga-anụ ihe anaghị aha
ka okpu ata.
159
OLUNDỊ/OLUMBA
II. OLU NSỤKA (NA STEETI ENUGWU)
Nwagbọghọ na-esuwe ọ dị ka o ji aka nne nye. Obiọma dị
agbọghọ ọyị ọ ga na-eche na ụwa bụ nke nye. Ọ nịgị
akwanyere mmadụ ugwu. Okwu ọbụle a gwaranị dị ka a na-awị
mminyi na mkpume. Nne nye na nna nye na-adụanị ka ndị ara.
Ọ na-ele ha enya ka ndị amaghị ihe.
160
IGBO IZUGBE
161
OLUNDỊ/OLUMBA
162
IGBO IZUGBE
Aha nwatakịrị ahụ bụ Chike. O jighị ntị ya abụọ anụ ihe. Mana
isi ike ọ na-eme erughị n’akwụkwọ ọ na-agụ. Chike na-emenye
ụmụakwụkwọ ibe ya egwu n’ule ọbụla. Nke a mere ha ji
ekpupụrụ ya okpu n’ụlọakwụkwọ.
163
OLUNDỊ/OLUMBA
IGBO IZUGBE
165
O mechaghị otu izu ụka Ndụbuisi nọrọ be ha, ọ kpọọ nna ya na
nne ya sị ha na ihe a maghị otu a ga-esi mee bụ ọnwụ. Kama ọ
ga-anọ mmadụ mmadụ na-esi mmụọ mmụọ, na ọ kaara ya mma
na o furu efu. Na ya ga-achọrọkwa onwe ya pụọ, isi waba, afọ
rụba, nke ka ibe ya, ya gbuo. Na ya agaghị ekworo mgbagbu
ghara ọgụ.
OLUNDỊ/OLUMBA
166
Ọ bụ n’ụlọ ekwụkwọ bụ ibe Chụma bidoro gbagheri ndị nke ya
na atụrụ mụrụ ebunu gba eka nwa. Klasị ọbụla e tieri Chụma na
ya, na-ahụsi enya maka nke ihe a na-ehuhu na ya. Nke ka ọjọọ
bụ na obu dị Chụma n’azụ. Ebere mmadụ emeghị ye. Ihe nwata
ekwụkwọ ọbụla Chụma ji enya ya hụ abụrụ ihe hụhụrụ ehuhu
na ya ihiom abụọrụ ihe tụfuru alị mie na-atabughu enya.
IGBO IZUGBE
167
Mana otu ụbọchị ka nkata kpudoro ya bụ onye aghụghọ. Chima
gara ahịa were zuru ego mmadụ, ndị ahịa jide ya wee kụọ ya
ihe ụzụ kụrụ ogene. Nke ahụ were gosi ya n’ezie na ụgụrụ na-
atụ oyi.
OLUNDỊ/OLUMBA
168
IGBO IZUGBE
IV. NKỌWAPỤTA OLU ABAKELEKE AHỤ E
DEPỤTARA N’ELU N’IGBO IZUGBE
OLUNDỊ/OLUMBA
Nwayị Ekedị jii ọsọ elu ji ọsọ ala. Naanị nhe ọjọọ gbakọrọ ya
ishi. Nrọ ya niile wụ kpa ọ ga-eji gbọọ di ya ntị na ịhịọfụ ya
ọnụ. O nwehụ mma Ekedi ba’ara n’ụlọ di ya zuo ike. Ọ
gwụchaala nhe obi mghọwa ka nwayị ya na-eme ya. Ke kacha
emekụta Ekedị n’ahụ wụ nwayị ya rụchaa ala ahụ niile ma
fuchaa eze elu nọ ya, o buru ụzọ bema akwa.
170
IGBO IZUGBE
VII. NKỌWAPUTA OLU OWERE AHỤ E DEPỤTARA
N’ELU N’IGBO IZUGBE
Ọ na-abụ okorobịa na-etolite, ọ dị ya ka ọ ga-ebu ụwa n’isi. Ọ
naghịzi echeta na ihe na-eku ume na-anwụ anwụ. Ọ na-eme
ihe, ọ naghị ele anya n’azụ n’ihi na ọ na-echefu na ụwa dị abụọ.
Na ọ bụghị otu akịilu si ada n’ọnụ ka o si atọ.
Nwunye Ekedị ji ọsọ elu, jidekwa ọsọ ala. Naanị ihe ọjọọ kụrụ
ya akwa n’isi. Nrọ niile ọ na-arọ bụ otu ọ ga-esi gbọọ di ya ntị
ma hịọchapụkwa ya ọnụ. O nweghị mgbe Ekedị batara na be ya
ọ na-enwe ezumike. Naanị ihe obi mgbọwa ka nwunye ya na-
eme ya. Ihe kacha eru Ekedị n’ahụ bụ na ọ na-abụ nwunye ya
rụchaa ala ahụ niile, ma puchaa eze elu dị ya, o buru ụzọ bewe
akwa.
171
Na mma niile ọ mara bụ mma ekwensu n’ihi na obi ya kpụ elo
agwọ.
176
IHE OMUME SITE NA NKUZI ỤTỌASỤSỤ NKE
IRINAABỤỌ
177
NKUZI ỤTỌASỤSỤ NKE IRINAATỌ
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE MBỤ
EBE MKPỌPỤTA ỤDA OKWU (PLACE OF
ARTICULATION)
(ỌGAN OKWU)
178
IHE OSISE ỌGAN OKWU
MKPỌPỤTA IHE OSISE
Ọnụ ire
Eze ala
Azụ ire
Imi
Ọdụ akpo
Ọnụ
Akpo ime
Eze elu Asha
Agba
Mkpọụda
Akpo ihu
Ọwa nri
Ogwooro
Ọpiakpịrị
179
Ọtụtụ ihe mejupụtara ọnụ mmadụ. Ọ bụ ihe ndị ahụ mejupụtara
ya na-enyere aka na mkpọpụta okwu. Ụfọdụ n’ime mpaghara
ihe ndị ahụ mejupụtara ọnụ mmadụ ma bụrụkwa ndị nke na-
enyere aka n’imewe ụda okwu, ịkpọpụta ụda okwu na iwepụta
okwu bụ:
180
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE ABỤỌ
MKPỌPỤTA ỤDAUME
Nghezu
(oghe)
a e i ị o ọ u ụ
181
ii) NDEPỤTAGHARỊ CHAATỊ ỤDAUME
(TRANSCRIPTION OF THE VOWEL CHART)
Nghetụ o
(oghetụ)
Nghezu ọ
(oghe)
a
ọ
ụ
Mkpụrụedemede ụdaume werechara ọnọdụ ha dị ka otu o
kwesịrị ma e si n’ọnụ na-akpọpụta ha dị ka o siri dị n’ihe osise
ahụ dị iche iche e sepụtachara n’elu. A ga-ewepụtazị chaatị (ihe
osise) mpaghara ọnụ ebe e si enweta nke ọbụla n’ime ha.
182
iii) CHAATỊ ỤDAUME IHU
(IHE OSISE MKPỌPỤTA ỤDAUME IHU)
a ị e i
Nghetụ
(oghetụ)
Nghezu
(oghe)
Nghetụ e
Nghezu
(oghe)
183
Mkpụrụedemede ụdaume ndị a bụ ndị nke e si n’ihu ọnụ
enweta ụda mkpọpụta ha. Ọ bụrụ na ị na-akpọpụta nke ọbụla
n’ime ha, ị ga-achọpụta na ụda mkpọpụta ha na-esi n’ihu ọnụ
apụta dị ka e siri gosipụta n’ihe osise ahụ dị n’elu. A na-
akpọpụta nke ọbụla n’ime ha, ọnụ na-emeghe emeghe, ghere
oghe. N’ihi nke a, a maara mkpụrụedemede ụdaume ndị a dị ka
ụdaumeihu.
o ọ u ụ
Nghezu
(oghe)
Nghetụ o
Nghezu ọ
(oghe)
185
ị ụ i u
a e o ọ
Nghetụ e o
Nghezu
(oghe)
Nghetụ e o
Nghezu a ọ
(oghe)
Mkpọpụta mkpụrụedemede ụdaume abụọ n’ime
mkpụrụedemede ụdaume anọ ndị ahụ e depụtara n’elu bụ ndị
mkpọpụta ha na-esita n’ihu ọnụ. Mkpụrụedemede ụdaume abụọ
ndị ahụ bụ ndị a:
a e
Mkpụrụedemede ụdaume abụọ ndị ọzọ bụ ndị ụda ha na-esita
n’azụ ọnụ ma a na-akpọpụta ha. Ha bụ ndị a:
o ọ
Ma mgbe e ji enweta ụda na mkpọpụta mkpụrụedemede
ụdaume anọ ndị a bụ mgbe ire hapụrụ ịmetụta akpo elu ma
gbadatazia ala ma a na-akpọpụta ha. Mkpụrụ okwu maọbụ
mkpụrụedemede ndị ahụ ọ na-abụ a na-akpọpụta, ire agbadata
ala, ebe akpọ elu ga-adịkwa n’elu bụ ndị a:
ị u i ụ
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE ATỌ
MKPỌPỤTA MGBOCHIUME
188
Mkpụrụedemede mgbochiume ọbụla nwere ebe na otu e si
akpọpụta ya. E nwere mkpụrụedemede mgbochiume iriabụọ na
asatọ. Nke ọbụla n’ime ha nwere mpaghara ọnụ ebe ụda ya na
mkpọpụta ya si apụta. O nwere akụkụ ọnụ mmegharị ha maọbụ
mmekọrịtaọnụ ha na-ewepụta ma na-egosipụtakwa ụda ha, otu
e si akpọpụta ha na kwa ebe e si akpọpụta mkpụrụedemede
mgbochiume ọbụla. Ihe niile mejupụtara ọnụ mmadụ
tinyekwara akpịrị na-atụta ụtụ nke ha na mwepụta na mkpọpụta
okwu na ụda okwu n’asụsụ Igbo. A ga-edepụta ma kọwakwaa
otu na ebe e si akpọpụta mkpụrụedemede mgbochiume ndị ahụ
e nwere n’asụsụ Igbo. Mkpụrụdemede mgbochiume ndị ahụ e
nwere n’asụsụ Igbo bụ ndị a:
e ch d f g gb gh
gw h j k kp kw l
m n ń nw ny p r
s sh t v w y z
189
Akwụkwọ a ga-ewepụtazi ndepụtagharị chaatị mgbochiume
ahụ iji were mee ka o doo onye ọbụla ọ na-agbasa anya, anya.
190
Ndepụtaghị a ga-enyekwara ma ndị na-akuzi ụdaasụsụ Igbo, ma
ndị na-amụ ụdaasụsụ Igbo, aka n’ikuzi na ịmụta ụdaasụsụ Igbo.
Ndepụtagharị chaatị mgbochiume ga-enyekwuazị aka n’ụzọ
purụ iche ma bakwuazị nnukwu uru n’ihe ọmụmụ banyere
Asụsụ, Ụdaasụsụ na Ụtọasụsụ Igbo.
191
Mkpọpụta Mgbochiume, Mkpụrụedemede Mgbochiume, Ụda ha, Ebe Ụda Ha
Ụda ha na ka e si Akpọpụta ha Si Apụta Na Ebe E Si Akpọpụta Ha
Egbugbere Egbugbere Egbugbere Akpo Ihu Akpo Ime Anyụrụ Akpịrị
Abụọ Na Eze Na Akpo Na Akpo (Eko)
Kendakpu gw kw
ỤDAIKE
Keọkpọrọ p b
(Kendapụta)
k t d
Kemkpọnaakpo
Kemkpọnuume
Kemkpọneegbugbere gb kp
Kensineeko
ỤDARỊỊ Keọkpọrọ
192
Kemkpọnimi
ỤDAYỊỊ w y
.
Keọkpọrọ m ny n n
ỤDAIMI Kemkpọneegbugbere nw
Keegbugberenaakpo
ỤDALỊỊ
ỤDACHỊỊ ch j
Keọkpọrọ f v sh gh z h
ỤDASHỊỊ
Kemkpọnaakpọ
Kemkpọnimi
Kemkpọneegbugbere
Ọnụ ire
Eze ala
Azụ ire
Imi
Ọdụ akpo
Ọnụ
Akpo ime
Eze elu Asha
Agba
Mkpọụda
Akpo ihu
Ọwa nri
Ogwooro
Ọpiakpịrị
I.
MKPỌPỤTA KEEGBUGBERE ỌNỤ ABỤO
m b kp gb p
196
II. M
KPỌPỤTA KEEKO (AKPỊRỊ)
h
197
III. MKPỌPỤTA KEEGBUGBERE NA EZE
198
Nke a bụ mkpọpụta ụda a na-enweta ma ọ bụrụ na egbugbere
ọnụ ala na eze elu ana-emetụta. Eze elu na-arụdo n’egbugbere
ọnụ nke ala, obere ikuku ga-esikwa n’etiti ha na-agafe nke ga-
emezi ka ụda mkpụrụedemede mgbochiume ahụ pụta.
Mkpụrụedemede mgbochiume ndị ahụ bụ ndị a:
f v
199
200
Mkpọpụta keakpo bụ mkpụrụedemede nke a na-esi n’akpo ihu
enweta. Tupu e nweta ụdịrị mkpụrụedemede a, ọnụ na-eghere
oghe, ire na akpo ihu emee ka ha ga-emetụta. Mkpụrụedemede
e si otu a enweta bụ:
ny
201
V.
MKP
ỌPỤTA KEMKPỌNAAKPO IME
202
k b ń gh
203
E nwere mkpụrụedemede mgbochiume ndị a na-enweta ụda ha
na mkpọpụta ha ma ọ bụrụ na ọnụ ire na anyụrụ (ìgbì) na akpo
ana-emetụta ọnụ. Mkpụrụedemede mgbochiume ndị ahụ bụ ndị
a:
l d s r n z t
204
205
A na-enweta ụda na mkpọpụta mkpụrụedemede ndị a ma ọ
bụrụ na etiti ire ana-emetụta akpo ihu na anyụrụ.
Mkpụrụedemede mgbochiume ndị sonyere n’usoro ndị a bụ:
ch y j sh ny
206
207
Ọ bụ site na mmetụta ọnụ nke egbugbere ọnụ na akpo ka e si
enweta ụda na mkpọpụta mkpụrụedemede mgbochiume ụfọdụ.
Oge a na-akpọpụta mkpụrụedemede mgbochiume ndị a
egbugbere ọnụ abụọ na-eme ka ha mechiri emechi, ebe ikuku
na-esi n’akpo apụta, na-esizi n’egbugbere ọnụ pụọ site na
mmeghe n’ike nke egbugbere ọnụ abụọ. Mkpụrụedemede
mgbochiume a na-enweta n’otu a bụ:
k gw w nw
ỤDỊRỊ ỤDA MGBOCHIUME
w
E NWERE
Ụda Mgbochiume ndị a niile a na-ede maka ha nwere ụdịrị ụda
e jiri mara ha n’ụdaasụsụ na mkpọpụta okwu. Ọ bụ site
n’ọnọdụ ụda nke ọbụla n’ime ha na-agosipụta ka e si amata
ụdịrị ụda ya. Ụdịrị ụda ndị ahụ bụ ndị a:
I. ỤDACHỊỊ
Ụda Mgbochiume ndị e jiri mara ụdachịị bụ ụda ndị a:
/ts/ /tЗ/
II. ỤDAIMI
208
Ụda ụdaimi bụ ụda Mgbochiume ndị a:
/m / / n / / / / / / /
Ụda ha na-esikanarị n’imi apụta ma a na-akpọpụta ha.
III. ỤDALỊỊ
Ụdalịị bụ ụdịrị ụda nke ọ bụ naanị otu ụda ndapụta
mgbochiume mebere ya. Ya bụ ụda Mgbochiume bụ nke a:
/l/
IV. ỤDAYỊỊ
E nwere ụda mgbochiume ndị ọ bụ ha mebere ụdayịị. Ụda
mgbochiume ndị ahụ bụ ndị a:
/w/ /j/
V. ỤDASHỊỊ
Nke a bụ ụdịrị ụda mgbochiume ụfọdụ mebere site n’ụdịrị ha
na mkpọpụta ha. Ọ bụ site n’ụda ha na mkpọpụta ha ka e si
enweta ụdashịị. Ụda mgbochiume e ji ụdashịị were mara bụ:
VI. ỤDARỊỊ
Ụdarịị bụkwuazị ụdịrị ụda a na-enweta site na mkpọpụta ụda
Mgbochiume. Ụda Mgbochiume bụ ụdalịị bụ:
/r/
209
IHE OMUME SITE NA NKUZI ỤTỌASỤSỤ
NKE IRINAATỌ
7. Mkpọpụta kempọnaamkpoime
210
10. Depụta ma kọwapụta ihe dị iche n’etiti ụdashịị na
ụdachịị
211
Nigel, F. (1997). Linguistics and Literature: Language in the
Verbal Arts of the World. Oxford: Blackwell
Publishers Ltd.
Nwadike, I.U. (2002). Igbo Language In Education – An
Historical Study. Obosi: Pacific Publishers Ltd.
Nwaozuzu, G.I. (2008). Dialects of Igbo Language. Nsukka:
University of Nigeria Press Ltd.
Ohiri – Aniche, B. (2013). Igbo Speech Varieties. Abuja:
Centre for Igbo Arts and Culture.
Osuagwu, B,I.N et al (1997). Fundamentals of Linguistics.
Owerri: Colon Concepts Ltd.
Uzoezie, R.U. (1992) Phonetics and Phonology of English for
Undergraduate and Teachers. Onitsha: Hybrid
Publishers Limited.
NKUZI ỤTỌASỤSỤ NKE IRINAANỌ
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE MBỤ
NKWE NA NJỤ
NKWE NJỤ
1 Ọ chọrọ iti m ihe 1 Ọ chọghị iti m ihe
2 Kụọ nwata ahụ osisi 2 A kụkwala nwata ahụ
n’azụ osisi n’azụ
3 Amadi nwere ụgbọala 3 Amadi enweghị ụgbọala
abụọ abụọ
4 Bee akwa ntị ga-anụ 4 E bela akwa ntị ga-anụ
5 Chere m n’ụlọ ụka, ana
5 Echekwala m n’ụlọ ụka,
m abịa anaghị m abịa
6 Uchenna ji ego bịa ebe a.
6 Uchenna ejighị ego bịa
ebe a.
7 Nkịta ahụ atagbuchaala 7 Nkịta ahụ atagbuchaghị
mmadụ. mmadụ.
8 Amaka kwere ka nwoke 8 Amaka ekweghị ka
ahụ lụọ ya. nwoke ahụ lụo ya.
9 Ụsụ ahụ amala n’ọnya. 9 Ụsụ ahụ amaghị n’ọnya.
10 Ńụọ mmanya ahụ m 10 Ańukwala mmanya ahụ
dọwara. m dọwara.
213
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE ABỤỌ
NKEJIOKWU
a e i ị o ọ u ụ
m, n
Mkpụrụedemede abụọ a bụ M na N na-arụ ọrụ n’okwu dị ka
nkejiokwu ma ọ bụrụ na ha enwee ụda na mkpụrụokwu ha nọ
na ya. N’ihi nke a, tupu M maọbụ N arụọ ọrụ dị ka nkejiokwu,
ọ ga-enwerịrị ụda na mkpụrụokwu e ji ha were mebe. Ọ bụrụ
na ha enweghị ụda, ha agaghịkwa arụ ọrụ dị ka nkejiokwu.
N’ọnọdụ dị otu a, tupu ha arụọ ọrụ dị ka nkejiokwu, a ga-
agbakwụnyere ha mkpụrụedemede ụdaume. Ọ bụ
mkpụrụedemede ụdaume ahụ ga-enye ya ụda ga-emezi ka ọ rụọ
ọrụ dị ka nkejiokwu.
A ga-edepụtazị ihe ọmụmaatụ iji were kọwaa nke ọma ihe a na-
ekwu maka ya banyere nkejiokwu.
MKPỤRỤOKW NKEJIOKWU
U
I Mụnachim mụ - na - chi - m
1 2 3 4
ii opi o - pi
1 2
iii chụfuchaa chụ - fu - cha a
1 2 3 4
iv anwụ a - nwụ
1 2
V ụgụrụ ụ - gụ - rụ
1 2 3
vi chefuo che - fu - o
1 2 3
vii ntu n - tu
1 2
viii egwuregwu e - gwu - re - gwu
1 2 3 4
ix achọpụtaghịkwa a - chọ - pụ - ta - ghị - kwa
1 2 3 4 5 6
216
X mkpụgharị m - kpụ - gha - rị
1 2 3 4
xi ụmụntakịrị ụ - mụ - n - ta - kị - rị
1 2 3 4 5 6
xii ọsịịsọ ọ - sị - ị - sọ
1 2 3 4
xiii njedebe n je de be
1 2 3 4
xiv akwụnakwụna a - kwụ - na - kwụ - na
1 2 3 4 5
xv ogwe o - gwe
1 2
xvi umejiakụ u - me - ji - a - kụ
1 2 3 4 5
xvii idide i - di - de
1 2 3
xviii ejidechaala e - ji - de - cha - a - la
1 2 3 4 5 6
xix mmegide m - me - gi - de
1 2 3 4
xx njakịrị n - ja - kị - rị
1 2 3 4
xxi ịtụpụtakwa ị - tụ - pụ - ta - kwa
1 2 3 4 5
xxii ndetọ n - de - tọ
1 2 3
xxiii amamihe a - ma - m - ihe
1 2 3 4
xxiv mbọ m - bọ
1 2
217
xxv usoro u - so - ro
1 2 3
xxvi igodo i - go - do
1 2 3
1. Gịnị bụ nkejiokwu?
Asụsụ Igbo bụ asụsụ okwu nka jupụtara n’ime ya. N’ihi nke a,
atụmatụ okwu bụ okwu nka dị iche iche e nwere n’asụsụ Igbo.
Okwu nka ndị a bụ okwu ndị Igbo ji akọwa onwe ha ma ha na-
asụ asụsụ ha. Ha na-ejikwa okwu nkà ndị a achọ asụsụ ha
maọbụ okwu ha mma. E jikwuazị atụmatụ okwu ndị a amata
onye maara asụsụ Igbo nke ọma. A na-ejikwuazi atụmatụ okwu
ndị a dịgasị iche iche amata onye maara ihe nke ọma. Mgbe
ọbụla a na-ekwu maka atụmatụ okwu, ihe a na-ekwu maka ya
bụ okwu nkà dị iche iche n’asụsụ Igbo.
A. MYÌYÌ (SIMILE)
Myiri bụ otu n’ime atụmatụ okwu e nwere n’asụsụ Igbo. Myiri
bụ ihe e ji atụnyere okwu n’asụsụ. Myiri na-egosipụta na ihe
yiri ibe ya, na ihe dị ka ibe ya mana ọ bụghị na ihe abụọ ahụ e
ji atụnyere ibe ha bụ otu kpọmkwem. Okwu e ji enweta myiri
n’asụsụ Igbo bụ DỊKA maọbụ KA. Mgbe ọbụla mmadụ na-
ewku okwu were sị na ihe dị ka ----’ maọbụ na mmadụ na-eme
ihe ‘ka ----’, okwu ahụ onye ahụ kwuru abụrụla okwu myiri.
N’ihi nke a, e nwekwuazịrị ike ịkọwa na myiri bụ ịma atụ otu
ihe na ibe ya siri yite, ma chetakwa na ọ bụghị otu ihe na ibe ya
siri bụrụ otu. Ụfọdụ n’ime myiri e nwere n’asụsụ Igbo bụ ndị a:
i) Chioma dị ka mamịwọta.
ii) Emeka na-agba ọsọ ka agwọ.
iii) Chijioke dị ime ka ndị Fulani.
iv) Nwata ahụ mere ọkpụrụkpụ anya ka enwe.
221
v) Aka ya abụọ na ọkpa ya abụọ dịcha ka mkpara ekwe.
vi) Ọ dị isi ka ogbe akị oyibo.
vii) Uchenna na-asapụta ire ka agwọ.
viii) Nwaada ahụ jọrọ njọ ka udele.
ix) Nwoke ahụ na-ebe akwa ka ehi.
x) Ọnwụzuruike na-arị elu ka enwe.
xi) Dimkpanaabọ na-ańụ mmiri ka anyịnya.
xii) Nwaanyị ahụ dị ka ụsụ.
224
D. ỌGHARAOKWU (IRONY)
Ọgharaokwu bụ atụmatụ okwu na-eji ihe jọrọ njọ were na-
akọwa ihe dị mma, maọbụ were ihe dị mma na-akọwa ihe dị
njọ. Ọ bụ okwu ọ na-abụ e kwuo, ọ bụghị ihe ahụ e kwuru ka ọ
bụ, kama ọ na-akọwa ihe ọzọ. Mgbe ụfọdụ, okwu e kwuru
nwere ike bụrụ okwu ọjọọ mana nkọwa ya ga-abụ okwu ọma.
Dịka otu aha ya siri dị, ọ bụ okwu ọ na-abụ e kwuchaa, nghọta
ya ahapụ otu ahụ e siri kwuo ya tụgharịa na-akọwa ihe ọzọ. E
nwere ike kwuo ọgharaokwu na njọ, nghọta ya aghagharịa bụrụ
mma. E nwekwuazịrị ike kwuo ya na mma, nghọta ya
aghagharịa bụrụ njọ. E nwere ọtụtụ ọgharaokwu n’asụsụ Igbo
nke ụfọdụ n’ime ha bụ ndị a:
225
nwụla. I mere nke ọma”. Nke a bụ okwu ọma nne Obi kwuru
iji were gosi na óbì adịghị ya mma n’agwa ahụ Òbí kpara.
E. NKWUSARA (APOSTROPHE)
Nkwusara bụ okwu a na-ekwuru onye a nọghị ya, ihe a naghị
ahụ anya, maọbụ onye nwụrụ anwụ maọbụ onye furu efu ka a
ga-asị na onye ahụ nọ ebe ahụ mgbe ahụ a na-ekwu ya.
Atụmatụ okwu a bụ nkwusara, kacha apụta ìhè n’ábụ (poem),
226
n’ọha, n’ákwá àrịrị. Ọ bụrụ na a na-ekwu ya, ọ na-adị ka onye
ahụ a na-agwa ya ọ nọ ebe ahụ na-anụ ihe a na-agwa ya. Mana
onye a na-agwa okwu ahụ anọghị nso. Ọ noghị ebe ahụ. Lee
ụfọdụ nkwusara:
227
F. NSINỤỤDA/ỤDAỤDA (ONOMATOPEIA)
Nke a bụ nghọta e si n’ụda ihe dara were na-enweta. Ọ bụ
atụmatụ okwu e sitere n’otu ihe siri mee, otu o siri daa ụda,
mkpọtụ maọbụ ụzụ merenụ, otiti mkpu e tiri, mkpu daranụ,
ụdịrị akwa mmadụ bere na otu o siri bee ya, anya mmadụ lere
na otu o siri lee ya. Ihe ọbụla mmadụ mere maọbụ ihe ọbụla
merenụ na ụda si na ya puta, bụ ihe a maara dịka
nsinụụda/ụdaụda. Ọbụrụ na mmadụ akụọ isi n’aja, ọ bụ ụda si
n’isi ahụ ọ kụrụ n’aja pụta bụ nsinụụda/ụdaụda. Ọ bụghị isi
ahụ ọ kụrụ n’aja. Nsinụụda/ụdaụda ga-esi n’isi ahụ ọ kụrụ
n’aja pụta, ga-abụ ihe dị ka kakpọọ maọbụ kakpọị.. Ọ
bụrụkwanụ na mmadụ dara ada were gbajie aka, ọ bụ kwaa aka
ya ahụ dara mgbe ọ gbajiri ya bụ nsinụụda/ụdaụda. Okwu
ụfọdụ ndị a na-esota bụcha atụmatụ okwu nsinụụda/ụdaụda.
G. NTAKWÙ (SOLILOQUY)
Ntakwu bụ okwu nkà mmadụ na-ekwuru onwe ya enweghị
onye ya na ya na-ekwu. Onye na-atakwu ntakwu bụ naanị ya
na-anọ ma ọ na-eme nke a. Ọ na-eme ya, ọ dị ka o nwere onye
ọ na-agwa mana ọ dịghị onye ọbụla ọ na-agwa. Ọ bụ onwe ya
ka ọ na-agwa. E si na ntakwu amata ihe bụ obi mmadụ. Ọ bụrụ
na o nwere ihe na-enye mmadụ nsogbu n’uche, ihe na-anyị ya
arọ na mmụọ, ihe obi ya anabataghị, ihe chọrọ ime, a na-esi na
ntakwu onye ahụ na-atakwu amata nke a. Mgbe ụfọdụ, onye
na-atakwu ntakwu anaghị ama mgbe ọ malitere mewe ihe dị
otu ahụ. A na-achọpụta nke a site n’ụdị nkụja onye ahụ na-
akụja ma mmadụ bịakwute ya na mberede. Ihe na-akpata nke a
bụ na echiche onye ahụ niile na-adị na ntakwu ahụ ọ na-
atakwu. Mgbe ụfọdụ, ụfọdụ mmadụ na-abụ ha nụ ebe mmadụ
na-atakwu ntakwu, ha ezoro ezoro gaa n’akụkụ ebe ahụ, ebe
onye ahụ agaghị ahụ ha, agaghị ama na ha nọ ya, ha ezoo were
na-egere ihe onye natakwu ahụ na-atakwu. Ndị na-eme ụdịrị
ihe a na-esikwa otu ahụ amata uche onye ahụ.
(iii) Gbuo nza, bọọ nza, nyara akpa nza nyawa nza, nza
efere.
(v) Mama Magị zụtara magị, Magị rachaa magị mama Magị
zụtara.
(vii) Esi m ukpo fere Aba, pụta n’Aba ụmụagbọghọ Aba na-
agbara Aba abịa.
H. AHAỌNỌCHỊ (METONYMY)
Ahaọnọchi bụ okwu ndị Igbo ji edochi aha ihe. Ọ bụ okwu ha
ji eto mmadụ site n’ụdị akparamagwa onye ahụ, ọdịdị onye
ahụ, na ịgba mbọ ya. Ndị Igbo ji okwu ahaọnọchi aja mmadụ
mma. Ọ bụ aha ọ na-abụ a kpọọ mmadụ, obi ekolie ya elu.
Mgbe ụfọdụ ha na-ewekwuazị ya dị ka aha otutu. Ọ na-
emekwu onye a na-akpọ ya ka o were onwe ya dị ka onye a
maara nke ọma, onye ndị obodo nabatara omume ya nke ọma.
E jikwuazị ụdịrị aha a eme ka onye a na-akpọ ya ghọta nke ọma
na mbọ niile ọ na-agba n’inyere ndị be ha aka, inyere ndị
mmadụ na ndị obodo ha aka, na ụtụ ọ na-atụnye na mmepe
obodo n’ụdị ọbụla dị iche iche bụ ihe a nabatara nke ọma. E
nwere ọtụtụ ahaọnọchi dị iche iche n’asụsụ Igbo ma na ọ bụ
ụfọdụ n’ime ha ka a ga-edepụta ugbua:
239
(i) Ụkpaka gbagburu enyi
(ii) Ike ekwo aba
(iii) Nwa ka ibe ya
(iv) Ọgbụ na-eche ndo
(v) Ọnwa na-etiri ọha.
(vi) Omepụrụ onye ọ dịịrị
(vii) Agụ na-eche ibe ya.
(viii) Ọ chịrị ọ zụọ
(ix) A gbakpo dike izu
(x) Ugo naabọ
I. ÒRÙRÙGHAOKWŪ (CLIMAX)
Nke a bụ okwu e ji nkwugo were mara. Ọ bụrụ na a na-ekwu
ya, okwu ahụ na-ebido n’oge izizi e bidoro kwuwe ya were
buru ibu na-arịgo tutu na e kwuchaa ya. N’atụmaatụ okwu
orurughaokwu, okwu ọbụla a na-ekwu maka ya bụ ụzọ ga-
epekanarịcha, nke na-esota nke ahụ ga-aka nke ahụ ọ na-eso.
Otu a ka ha ga-esi na-akarị ibe ha tutu wee ruo na njedebe
okwu ahụ, ebe onye na-ekwu ya kwudebere ya. Ọ ga-enwerịrrị
usoro ọkịka n’usoro e si ekwu ya. Ịmaatụ orurughaokwu bụ ndị
a:
(ii) Anyị achọghị ego ise, ihe anyị chọrọ bụ ego iri.
241
(iv) Nwanne m nwoke gara ahịa ụnyahụ zụtara m ude,
akpụkpọụkwụ na akwa.
Ị NHAÀGIDEOKWŪ (ANTITHESIS)
N’atụmatụ okwu nke a, okwu e kwuru ekwu na-ahagide ibe ya.
Ọ bụrụ na e kwuo ya, onye na-echebaghịrị ya uche ime ga-eche
na okwu ikpeazụ dị n’okwu e kwuru emebichaala maọbụ
kwubichaa nke izizi e kwuru n’ahịrịokwu ahụ. Na nkọwa
242
nkenke, nhagideokwu bụ okwu ọbụla na-abụghị otu na nghọta
na-ekwugide maọbụ na-aghagide onwe ha. Ụfọdụ atụmatụ
okwu nhagideokwu bụ ndị a:
(i) Nwokorobịa ahụ anaghị ezu ohi mana ebe ọbụla ọ gafere
ihe efuo.
(ii) A zọta ndụ e dobere ọnwụ.
(iii) Nwoke ahụ ji ọsọ na ije abịa.
(iv) Buru ite ahụ chuo mmiri ị lọtawa ị kụwaa ya n’ụzọ.
(v) Azụtaara m gị akwa ọzọ ị ga-adọkacha tupu o kwee izu.
Ahịrịokwu ndị ahụ niile e depụtara bụcha atụmatụ okwu
nhagideokwu n’ihi na ọ bụrụ na ị gụọ ha ị ga-ahụ na okwu dị
ebe ahụ na-aghagide ibe ha. Mana nke a apụtaghị na ha
enweghhị nghọta. Nghọta ha zuchara oke nke ọma. Ha
nwechara ezigbo nghọta ma nwekwuazị ihe ha na-akọwa n’otu
n’otu.
J. MGBUDÀOKWŪ/MWETÙOKWŪ (ANTI-CLIMAX)
Nke a bụ usoro a na-agbaso ma a na-ekwu okwu site na-isi
n’okwu kacha wee ruo na nke a kacha. A na-eme nke a site
n’idobe nke a kacha n’ihu, ebe nke kacha ha niile na-anọ n’azụ.
Ọmụmaatụ ya bụ ndị a:
Okwu ndị ahụ niile e depụtara sitere na nke kachanụ were ruo
na nke a kacha. Ọ bụ ya bụ atụmatụ okwu
mgbudaokwu/mwetuokwu.
K. EGBÈOKWU (HYPERBOLE)
Egbeokwu bụ atụmatụ okwu e ji ama atụ ihe mana ihe ahụ a
na-ama atụ ya anaghị aharu ka ihe e ji ama atụ ya. Atụ e ji
okwu a ama bụ i ji kọwaa otu ihe a na-ekwu maka ya, ha, otu ọ
ha n’ibu, otu o siri peka mpe, na otu ihe ahụ siri dị. Mana mgbe
ọbụla e kwuru ya, ihe e jiri kwuo ya na-akarị ihe e jiri maka ya
were kwuo ya. E nwekwuazịrị ike ịkpọ egbeokwu òtùtù ọnụ.
N’ihi na onye na-ekwu egbeokwu bụkwuazị onye a maara dị ka
onye na-etu ọnụ maọbụ onye na-emetụ ọnụ aka. Atụmatụ
okwu egbeokwu ụfọdụ bụ ndị a:
245
A na-achọ ndị ga-eri ego achọ? A naghị achọ ha achọ n’ihi na
ha juru eju, bara abara. Egbeokwu a na-akọwa na ụdịrị ego
onye ahụ atụghị anya ya batara ya aka.
246
(i) Ọ bụ nwatakịrị ahụ bụ na ha na-eri nri na be ha.
Ị gụọ atụmatụ okwu akpụokwu a, i nwere ike ị na-ajụ kedụ otu
o siri bụrụ nwatakịrị na-enye ndị be ha ihe ha na-eri. Na nke
ahụ agaghị ekwe omume. I leruo akpụokwu ahụ anya nke ọma,
ị ga-achọpụta na okwu ahụ bụ ihe ziri ezi. Na ọ bụ ihe ga-ekwe
omume. Ihe ya bụ akpụokwu na-akọwa bụ na nwatakịrị ahụ bụ
nwatakịrị hụrụ ndị be ha n’anya site n’ịdị na-enyere ha aka na
mkpata akụ. Ọ bụ nwatakịrị na-agbasi mbo ike, na-enyere ndị
be ha aka ọ kachasị nne ha na nna ha n’ihe ọbụla ha na-eme iji
were kpata ihe ha ga-eri.
247
KW. NKWUMA (EUPHEMISM)
Atụmatụ okwu nkwuma bụ usoro e ji ụzọ dị iche iche na ụzọ
na-atọ ụtọ na ntị were na-akọwa okwu dị njọ maọbụ okwu siri
ike. Ọ bụ okwu ọma e ji ekwudaru okwu ọjọọ, ala. Ọ bụrụ na ị
na-anụ ya ka a na-ekwu ya, ọ ga-adị gị mma na ntị mana i
lebara okwu ahụ anya ị chọpụta na ọ bụghị ezigbo ihe ka a na-
ekwu maka ya. Lekwa atụmatụ okwu nkwuma ndị a:
L. OKWUNKWUTÙ (LITOTES)
Atụmatụ okwu nke a bụ atụmatụ okwu anaghị ekwuwaru okwu
n’isi. Ọ na-akpatụ okwu obere aka. Ọ bụ atụmatụ okwu na-
ekwutu okwu ala karịa otu okwu kwesịrị ịdị. Site n’ụdị ya
n’okwu, ọ na-ewedata ihe karịa iweru ya n’isi. Ndị a bụ
ọmụmaatụ atụmatụ okwu okwunkwutu ụfọdụ:
249
(i) Ọ machasịghị ihe ike
(ii) Ọ fọdụrụ nwantakịrị ihe ka ọ daa n’ule ha lelere.
(iii) Isi ezuchaghị ya oke.
(iv) Ume jisi ike wee ruo be ha.
(v) O nwere ihe fọdụrụ ya n’uche.
(vi) Nwoke ahụ ji ịwị ara ụgwọ.
M. ILU (PROVERB)
N’ala Igbo, a na-ewere ilu dị ka ezigbo okwu nka ndị Igbo ji
achọ asụsụ Igbo mma. Ọ bụ ilu ka ndị Igbo ji eme ka okwu ha
dị ụtọ na ntị ma kakwuazị aka na nghọta. A sị na ọ na-abụ a
chụchaa aja a hụghị udele a mara na ihe mere na be ndị mmụọ.
Ọ bụrụ na e kwuchaa okwu Igbo, dechaa maka asụsụ Igbo ma a
kpọtaghị ilu aha, a mata na ihe a na-ede maọbụ na-ekwu,
ezubeghị oke. N’hi nke a, a ga-asị na ilu bụ okwu miri emi na
nghọta, ndị Igbo ji akọwa onwe ha, asụsụ ha, na ebumnuche ha.
N’ihi na ilu na-adị omimi na nghọta, ọ na-enyere aka iji were
na-ekpokọta okwu ọnụ. Otu ilu nwere ike kọwaa okwu nwere
ike iwe mmadụ oge ma a kọwaba ya. Ọ bụ ya kpatara e jiri
kwuo na ilu Igbo bụ atụmatụ okwu ndị Igbo ji edozi okwu ha.
A na-eme nke a site n’iji ilu mee okwu ka o bee nkenke, ka
ofeke ghara ịma ihe a na-ekwu, ka okwu were dị ebube na ntị.
Ndị Igbo na-eji ilu egosipụta otu ndụ ha dị, ụdịrị agwa ha na-
akpa, ebumnuche ha, nghọta ha, ofufe ha, omenaala ha, echiche
ha banyere ndụ, otu ha siri were ụwa ha, ịgba mbọ ha, amamihe
ha, nkwenye ha, nghọta ha na mmekọrịta ha, dgz. Ọ bụ site
n’ilu okwu ndị Igbo ka ị ga-esi chọpụta ihe ndị a niile. Ilu ọbụla
e nwere n’ala Igbo nwere ihe ọ na-akọwa. Nke ọbụla n’ime ha
250
mmadụ tụrụ nwere ihe kpatara onye ahụ jiri tụọ ya. O nwere
ihe ọ na-arụtụ aka. N’ilu, ka anyị ga-esi chọpụta na uche ndị
Igbo emika. Ọ na-egosi na ndị nna anyị ha wepụtachara ilu ndị
ahụ bụ ndị riri amosu. Ọ bụkwa amamihe ka e ji were mara ilu
n’ihi na a na-ewere onye amaghị ilu n’ala Igbo dị ka onye na-
ańụjughị mmiri ara nne ya afọ nke ọma. Ọ bụ ya kpatara ndị
Igbo ji atụ ilu na-asị na onye ọbụla a tụọrọ ilu kọwaara ya mara
na ego e jiri lụta nne ya lara n’iyi. Ilu nke a na-akọwa na onye
ọbụla bụ onye Igbo kwesịrị ịma ka e si atụ na ka e si akọwa ilu
n’ihi na ọ bụ ilu ka e ji amata onye maara ihe nke ọma n’ala
Igbo. N’ala Igbo, a na-ewe onye ọbụla amaghị ihe ọbụla
banyere ilu dịka onye ihe fọdụrụ n’uche ya nke ga-eme a
gbawa izu a gaghị akpọ ya n’ihi na a na-ewere onye ahụ dịka
ọbịara n’izu amaghị okwu. Nke a pụtara na onye bịara ebe a
na-ekwu okwu mana ọ dịghị ihe ọbụla ọ ghọtara e kwuru. Ọ
naghị abụ naanị ihe ihere onye ahụ mana ọ na-abụkwuazị nke
ndị nwe ya n’ihi na ọ na-abụ anya bewe, imi ebwe maka na ihe
ọbụla ruturu anya erutula imi.
N’ihi nke a, kọwaa ilu site na nghọta ya. A kọwala ya site n’otu
e siri depụta ya. Ọ bụrụ na e nye gị ilu dị otu a ka ị kọwaa:
ILU NKỌWA HA
1 E jide ibe ji n’aka e Ọ bụ onye nwee ihe ọ ga-eji
were sawa ndị mmụọ mee ihe, o were chetawa
okwu maka ihe omume dịịrị ya. Ọ
bụghị i nweghị ego, ị na-achọ
ihe ego ị ga-eme.
E nwere ọtụtụ ilu ndị ọzọ. Ilu juru eju bara abara. A naghị achọ
ha achọ. Gbaa mbọ mụta ọtụtụ n’ime ha ma marakwa nke ọma
otu e si akọwa ha (ya bụ nkọwa ha n’otu n’otu).
ỊTỤ ILU
Ihe a ga-eji leba anya n’isi okwu a bụ na ọtụtụ amaghị otu e si
atụ ilu, mgbe e ji atụ ilu, na ka e si atụ ya. Ilu ọbụla e nwere
n’asụsụ Igbo nwere ihe ọ na-akọwa, ihe ọ na-arụtụ aka. N’ihi
ya, o kwesịrị ekwesị nke ọma na ọ bụrụ na ị chọọ ịtụ ilu ọbụla
n’asụsụ Igbo, ị ga-agba mbọ tụọ ya bụ ilu ka ọ daba adaba nke
ọma n’ihe ị na-ekwu.
261
ị chọrọ iji were dee ihe. Ọ bụrụ na ị maghị nkọwa ilu ahụ ị
chọrọ iji dee ihe, a tụkwala ya. Mana ị nwaa anwa dekanya ya
ebe ahụ, ị mara na Okokporo debichaala ihe ị na-ede. N’ihi ya,
ọ kaara gị mma na ị tụghị ilu chaa n’ihe ị na-ede karịa ịtụ ilu
adabaghị n’ihe ị na-ede, ilu ga-achịpụta gị ụkwụ ezi, ilu ga na-
akọwa ihe ọzọ, edemede gị a na-akọwa ihe ọzọ.
262
4. A kaa ụtụ ogbenye akaa ọkpọ.
5. Ị chọwa ọchị nkịta i nye ya ji dị ọkụ.
6. Okokporo anaghị ama mgbe ọ gafere ama ọgọ ya.
7. A kụkata aka n’obi e gosi ndị mmụọ ebe ndụ dị.
8. Ebe onye dara ka chi ya kwaturu ya.
9. Ọ bụ a na-eso mma, ndụ nwamkpi a na-eto ogologo.
10. Aka jie agụ mgbada abịara ya ụgwọ.
11. Ugo anaghị ebu ọkụkọ mana ọ na-egosi egbe ebe ọkụkọ
nọ.
12. Oke sị na ọ nọghị n’ụlọ mgbe a mara iwu ohi.
13. E lelịa nwa ite ọ gbọnyụọ ọkụ.
14. Mmiri e jiri sie agwọ na-atọ agwọ agwọ.
15. Nkwụ na nkwụ tokọọ, ha ajụkọọ igu.
16. A naghị ahụ mmụo ghewe ọnụ oghe.
17. O nweghị obodo ihe na-ata akwụ adịghị.
18. E sowe okukoro anya enwe ji agwụ n’ọba.
19. Nkịta na-agbọ ụja sị na ọ na-azọ ndụ ekperima, na-
azọkwuazị ndụ onye nwe ya.
20. Ihe adịghịrị adụ mma kpatara o jiri mịa n’elu.
21. Onye chi ya wọrọ ọcha na-acha ka anyarị
22. Ebe onye dara ka chi ya kwaturu ya.
23. Arụsị e jiri akwa ọkụkọ chụọrọ aja mara na ụkwụ ọkụkọ
na isi ya dị n’akwa ahụ.
24. Ọ bụ nwata amaghị ihe ka a na-egosi oke ala ugboro
abụọ.
25. Nwaanyị sị na ikpe ya na di ya abụghị nke mmadụ ga-
ekpe, ndị mmụo kpeere ha ọ ga-akara ya mma?
26. Onye chọọ igbu nkịta o nye ya aha ọjọọ.
263
27. Onye a na-afụrụ ụsụrụga ọ na-agba amaghị na
ụsụrụgada bụ egwu ndị mmụọ.
28. Ọ bụrụ na a na-egbu anụ ndị merụrụ ala, a ga-ebu ụzọ
gbuo nwamkpi.
29. A gbaa aja, a gbaghị okoro ya, ọ wachikwa n’afa.
30. Arụsị chị ụmụ na-eri ọtụtụ akpara ji.
31. E buru ọnụ na-achụ aja, ọ na-ada ọnwụ ọnwụ.
32. Ọ bụ a kwanyere ụtara ugwu ọ dị ka o juru afọ.
33. Ihe e ji apụ egwu ọnwa bụ ka a hụkọrịta n’ihi na o
nweghị onye ọnwa anaghị eti be ya.
34. Ọ bụghị a hapụrụ nwata ụlọ a chọwa onye ga-eledo ya
anya.
35. Onye zụrụ egbe ọhụrụ na-eji ya aga akwa onye toro afọ.
36. Ada m, ada m, na-adabanye n’ọkụ.
37. Apịtị amaghị onye ọbịa.
38. Ọ bụ ka a bịa, ka a bịa, ka awọ ejighị puo ọdụ.
39. Mgbada nyụọ ka enyi ukwu awaa ya.
40. Onye isi nkwọcha anaghị atụ okwute.
41. A bachanyekarịa ji n’ọgwụ, ọ ghọọ ji awaị.
42. A naghị ere ọkụkọ ọkpa gbajiri n’ụlọ.
43. Ugwu bụ nkwanye nkwanye nwaanyị ji amụta ibe ya.
44. Onye ji ihe nwata wellie aka elu, aka rowe ya o wetuo
ya.
45. Anụ niile na-afụ opi mana nke nkapị na-apụ iche.
46. Nwamba sị na mmetụta ahụ bụ ụtọ ndụ.
47. Ọ bụ oke nọ n’ụlọ gwara oke nọ n’ọhịa na ngwugwu
ogiri dị n’anya ọkụ.
48. Agwọ na ihe o loro atọgbọrọla.
49. Akụ fechaa ọ daara awọ.
264
50. Ughere abụghị ọrịa ọ bụrụ agụụ.
51. Nwata na-ebe akwa na-enyeghị ya akịilu ndị tara ata
kedụ otu ihu dị ha.
52. E buru ozu dike gazuo ebe ọ kpara ike o rekaa n’abọ.
53. Igwurube buru uru ya abịarala m.
54. Agụụ bịa, ọrịa bịa, ọnwụ adịzịa onye ụbịam ka okpu eze.
55. Onye amaghị onye karịrị ya anaghị ama onye ọ karịrị.
56. Mba mekarịa arụ, ọ bụrụ omenaala be a.
57. Ọ bụghị ụbọchị e gbuturu osisi ka a na-akpa ya nkụ.
58. Ngwere nyụchaa nsị ọ nyụnyeghị ya nzu ọ naghị adị ka
nsị ngwere.
59. Ọ bụghị ụbọchị nwatakirị kwafuru mmanụ ka a na-eti ya
ihe kama ọ bụ ụbọchị ọ kwafuru oguru akwụ.
60. Ebe ọkụ nyụrụ a wụsa ọwa.
NKỌWA AKPAALAOKWU
Ọ bụghị otu ahụ e siri kwuo akpaalaokwu ka nkọwa ya na
nghọta ya na-adị. Ị gaghị esi otu ahụ i siri nụ ya were kọwaa ya.
Ọ bụrụ na i mee otu ahụ, ị bụrụ ofeke. Iji maa atụ, ọ bụrụ na a
sị gị kọwaa ahịrịokwu akpaalaokwu a:
Ọ na-eme aka abụo.
Ị gaghị enye nkọwa gị site na-ịsị,
266
Ị hụla na nkọwa ya ahịaghị ahụ ọbụla. Ọ bụkwuazị otu ahụ ka
nkọwa ndị ọzọ ga-esi were dị.
267
ọjọọ.)
10 Ọnụ ịdị n’ọkụ Agụụ ịgụ.
(Ọnụ dị ya n’ọkụ) (Agụụ na-agụ ya.)
11 Ịchị obi n’aka Iche uche
(Ọ chị obi n’aka) (Ọ na-eche uche. Uche
erughị ya ala.)
12 Obi ịkpọ nkụ N’ekwetaghị arịrịọ niile a
na-arịọ ya.
(Obi kpọrọ nwoke ahụ (Nwoke ahụ atụgharịghị
nkụ.) obi n’arịrịọ a na-arịo ya.)
13 Ụwa ịsa aka Ihe ịgara mmadụ nke ọma.
(Ụwa saara Nweke (Ihe na-agara Nweke nke
aka) ọma.)
14 Ime aka n’ọnụ. Iri ihe.
(Uche gara ime aka (Uche gara iri ihe)
n’ọnụ).
15 Ịnya isi Ịkpa nganga. Ime ngala
(O ji mmá ya anya isi)
n’ihe ị maara eme.
(O ji mma ya akpa nganga,
eme ngala.)
16 Anya ịka aka Atụghị egwu
(Anya kara m aka) (Egwu anaghị atụ m).
17 Agụụ ibe ntị Agụụ ịgụsi ike.
(Agụụ bere ha ntị (Agụụ gụsiri ha ike
ụnyahụ.) ụnyahụ).
18 Ịta akwa ndụ. Izuzu ezuzu.
(Ọ na-ata akwa ndụ). (Ọ na-ezuzu ezuzu).
19 Ịta ntụ ọkụ. Ịta oke ahụhụ.
268
(Nwakọ ataala akwa (Nwakọ ataala oke ahụhụ).
ndụ).
20 Anya erughị ala. Akpachapụghị anya.
(Anya erughị nwata (Nwata ahụ anaghị
ahụ ala). akpachapụrụ ihe anya).
21 Ikwo ọdụ na-akpụ n’ala Ịkwụsị mmadụ ajọ omume
(E kworo ya ọdụ ahụ ọ ya.
na-akpụ n’ala). (A kwụsịla ya ajọ omume
ya ahụ).
22 Ịhịọ ọnụ Imesi ike
(Ịzụ ụmụaka ahịọla (Ịzụ ụmụaka emesiela
nwaanyị ahụ ọnụ) nwaanyị ahụ ike).
23 Ịhụsi anya Ịta ahụhụ.
(Emeka ahụsiela anya). (Emeka ataala ahụhụ n’ije
ahụ)
24 Ideji mkpịsị akwụkwọ. Ideta ihe nke ọma
(Chinwe dejiri mkpịsị (Chinwe detara ihe nke
akwụkwọ ya n’ule ahụ) ọma n’ule ahụ).
25 Ịbụ ọkụkọ udummiri. Ịrịa oke ọrịa.
(Nwunye nwoke ahụ (Nwunye nwoke ahụ na-
bu ọkụkọ udummiri). arịa ọrịa mgbe ọbụla).
26 Ịtakasị anya. Ịdị njọ n’ile anya.
(Ahịhịa ahụ na-atakasị (Ahịhịa ahụ dị m njọ
m anya ebe ahụ ọ dị). n’anya ebe ahụ ọ dị).
27 Inwe ogologo akpịrị Ịsa oke ụsa.
(Uche nwere ogologo (Uche na-asa oke ụsa)
akpịrị.)
28 Isi ịkpọ nkụ. Ime isi ike.
(Isi kpọrọ ya nkụ). (O na-eme isi ike.
269
29 Ịkpụ iku anya. Ihere ịpụ mmadụ n’anya.
(Ngozi akpọula iku (Ihere adịghị Ngozi n’anya
anya). ma ọlị).
30 Iji ntị chọọ mmadụ Mmadụ ime isi ike.
mma. (Ogbonna na-eme isi ike
(Ogbonna ji ntị chọọ nnukwu)
mma)
31 Ire ịdị nkọ. Ikwu oke ekwurekwu, ịgba
(Ire dị Amuche nkọ). asịrị.
(Amuche na-ekwu oke
ekwurekwu. Ọ
na-agbatanwu asịrị.)
32 Ipu eze elu Ime arụ
(Nwata ahụ epuola eze (Nwata ahụ mere arụ)
elu)
33 Ibu ọkụkọ ụzọ lakpuo Ịnwụchu anwụchu.
ụra. (Nwokorobịa ahụ
(Nwokorobịa ahụ bu nwụchuru anwụchu)
ọkụkọ ụzọ lakpuo ụra).
Ń. ỤKABỤILU
272
Ụkabụilu bụ ilu e tinyere na nwatakịrị akụkọ. Ọ bụ obere akụkọ
ndị Igbo na-akọ n’ụzọ ilu ijiri kọwaa maọbụ chọọ okwu mma.
Ụkabụilu bụkwuazị nkà okwu ndị Igbo ji akọwa okwu ha. A
na-akọ akụkọ ụkabụilu, a na-ege ntị nke ọma ka a mara ihe
akụkọ ahụ na-achọ ịkọwa. Ọ bụrụ na a kọchaa akụkọ ụkabụilu,
ọ ga-enwerịrị ihe kpatara e jiri kọọ ya.
ỤKABỤILU
1. Icheoku gara na nke dibịa ka ọ gbaara ya afa ka ọ mara
ihe o ji abụ ọ mụọ nwa, nwa ya anwụọ. Dibịa were
malite gbawara icheoku afa. Ọ chịrị mkpụrụ afa ya wụọ
n’ala, otu n’ime mkpụrụ afa ahụ tụọ icheoku n’ọnụ.
Dibịa lee icheoku anya, fee n’isi were sị icheoku na
egwu dịkwa na ihe ọ hụrụ karịrị ya. Icheoku were sị ya ọ
274
mara ihe ahụ ọ hụrụ ya kwuo ya. Ọ bụrụ ihe ga-eri isi
mmadụ, ọ gwa ya na ọ ga-eme ya mmaji kwuru mmaji.
Dibịa kwee n’isi were malite ịgbara icheoku afa. Ka ọ
wụrụ mkpụrụ afa ya nke ugboro abụọ n’ala, mkpụrụ afa
tụliekwa elu ọzọ daa icheoku n’ọnụ. Dibịa ahụ tie sị
icheoku ma ije nke a ma a ga-ejekwa ya eje, na ihe ọ na-
ahụ n’afa ahụ ekweghị ya okwukwu. Icheoku sị dibia ọ
mara otu ọ ga-esi kwuo ya, o kwuo ya ka ọ nụ n’ihi na o
nweghị ihe ntị nụrụ chie. Dibịa were kwee n’isi sị ya na
nsogbu adịghị, ka ọ nwakwaa ọzọ. ka dibịa chịlitere
mkpụrụ afa ya wụọ n’ala nke ugboro atọ, mkpụrụ afa
tụọkwa icheoku n’ọnụ nke ugboro atọ. Dibịa were
mkpụrụ afa ndị ahụ o ji were na-agbara icheoku afa
chịsa, were sị icheoku na ọ gbachaalara ya afa, na ọ ga-
ege ntị ka ọ nụ ihe ọ gbatara n’afa. O were sị icheoku na
ihe na-eme ya si ya n’ọnụ.
ỤKABỤILU
2. Udele ghụcara ahụ were jụọ ụmụnna ya kedụ ka ọ dị
ugbua, ụmụnna ya were zaa ya sị na ọ bụ ugbua ka njọ
malitere rịwa ibe ya elu.
NKỌWA ỤKABỤILU
3. Nke a pụtara mmadụ inweta ihe ọ na-achọ na ntụmadị,
n’atụghị anya ya.
ỤKABỤILU
4. Mbekwu nwa anịga ka ụmụnna ya bịara ịkpụrụ n’ihi na
o nwere ihe o mere. Ka ụmụnna ya batara na be ya ka ha
kpụrụzịa ya pụọ, mbe rịorọ ha ka ha chetụ nwantakịrị
n’ihi na o nwere ihe ọ chọrọ ịgwa ha. Ha kwetara n’ihe
mbe gwara ha n’ihi na ha sị na o nweghị mgbe mbe ga-
agbanahụ ha. Ha niile kwụrụ na-ele mbe ka ha mara ihe
ọ chọrọ ime. Mbe wakwa ọgọdọ ya. Ka ọ wakwachara
ọgọdọ ya, o were ụkwụ ya abụọ na aka ya abụọ malite
bọkasịwa ala. Ụmụnna ya na-ele ya ka ha mara ihe bụ
uche mbe n’ihe ahụ ọ na-eme. Ka mbe bọsachara ala, o
were gwa ụmụnna ya sị ha na ha mara ebe ha ga-akpụrụ
ya gaa, ha kpụrụzịa ya gawa n’ihi na onye ọbụla bịara
ebe ahụ, ga-ama na nwoke na ibe ya mere ihe.
NKỌWA
4. Nkọwa ụkabụilu ahụ were bụrụ na amaka mmadụ ahala
(otu mmadụ ahala), e lelịkwala ya anya n’ihi na o nwere
276
ihe ọ ga-emenwu. Maka ọ bụ e lelịa nwa ite ọ gbọnyụo
ọkụ.
ỤKABỤILU
6. Onye nchiche na onye ekpenta gara ọrụ n’ugbo. Ha
rụkata ọrụ, onye ekpenta sị onye nchiche, ya mee ngwa
ngwa ka ha laa ka ihe nghọrọ ghara ịghọrọ ha. Onye
nchiche were sị onye ekpenta ekwuzila maka ihe nghọrọ
n’ihi na ọ bụ ha bụ ihe nghọrọ.
ỤKABỤILU
7. N’otu obodo ka eze ha ziri ozi ka a kpọkọọ ụmụnwaanyị
ha niile a na-alụ alụ n’ihi na o nwere ozi dị mkpa a
277
chọrọ ka e zie ha. Ka oge e jiri kpọọ oku ahụ ruru,
ụmụnwanyị niile a na-alụ n’obodo ahụ gbakọo n’ama
ebe a kpọrọ ha oku, dịka ndị obodo ha siri chọọ. Eze
obodo ha gwa ha na ihe kpatara e jiri kpọkọọ ha bụ ka a
gwa ha na o nweghịzi onye ọbụla n’ime ha a chọrọ ka o
si na be di ya pụọ apụ. Na a chọghị ka a na-ahụzi onye
ọbụla n’ime ha n’ezi. Na ọ bụ naanị n’ime ụlọ ebe a na-
alụ ha ka ha ga na-anọ. Ka eze kwuchara okwu ahụ, otu
agadi nwaanyị welie aka ya elu na o nwere ihe ọ chọrọ
ka o kwuo. E were sị ya kwuo. O were sị na oku a a
kpọrọ ha dị mma, kama na ọ chọrọ ka ha mata na onye
ọbụla achọghịkwa ka ewu ya na-akpapụ akpapụ, ga-agba
mbọ na-ahụ na ọ na-akpatara ya nri. Na ọ bụghịkwa
maka ya n’ihi na ọ bụrụla agadi nwaanyị. Na ihe ọ na-
ekwu bụ maka ụmụagbara nwaanyị ndị ọzọ.
NKỌWA ỤKABỤILU AHỤ
7. Tupu mmadụ emewe ihe, maọbụ chọọ ime ihe, o kwesịrị
ịma ma ọ ga-emenwukwa ihe ahụ ka ọ ghara ịgbaji ya
aka. Ọ bụ ọnọdụ dị otu a kpatara ndị Igbo ji atụ ilu were
na-asị na tupu mmadụ eloo mkpụrụ ụdara, o kwesịrị ka ọ
mara otu ike ya ha.
280
E deela maka ndịiche dị n’etiti Ilu na Akpaalaokwu. Nke a ga-
elebazi anya na ya ugbua bụ Myiri dị n’etiti ilu na
akpaalaokwu. E nwere myiri dị n’etiti ha abụọ. Ọ bụ ha ka a
ga-eleba anya ugbua.
281
maka ilu anaghị atụ ilu. Onye amaghịkwanụ maka
akpaalaokwu anaghị ekwu ya. Ilu na akpaalaokwu bụcha okwu
ndị nke e mebere maka ndị maara ekwu okwu nka n’asụsụ
Igbo. Ilu na akpaalaokwu abụghị okwu nkà a na-ekwu otu onye
siri chọọ. Ha na-enwe usoro ma nwekwuazị otu kwesịrị ka e si
were na-ekwu ha.
282
Ihe ọzọ akwụkwọ a ga-eleba anya bụ ndịiche dị n’etiti ilu na
ụkabụilu. Ilu na ụkabụilu abụghị otu. Ha nwere ihe ndị mere ha
jiri dị iche n’etiti onwe ha. Ihe ndị ahụ mere ha jiri dị iche ka a
ga-elebazi anya.
283
Ndịiche ọzọ bụ na ọ bụ site n’okwu e ji ilu were kwuo ka e si
amata nghọta ya na kwa ihe ọ na-arụgara aka; mana ọ dịghị otu
ahụ n’ụkabụilu. Ọ bụ site n’akụkọ ụkabụilu ka e si enweta
nkọwa ụkabụilu ma na-amatakwa ihe ọ na-arụgara aka. Ọ bụ
onye ghọtara akụkọ ụkabụilu na-aghọta nkọwa ya. Ọ bụ onye
ghọtara okwu e ji ilu were chọọ mma na-aghọta ihe ilu ahụ na-
akọwa.
284
E lebala anya na ndịiche dị n’etiti ilu na ụkabụilu. Nke a ga-
elebazi anya ugbua bụ myiri dị n’etiti ilu na ụkabụilu.
Ilu na ụkabụilu bụcha okwu nka ndị Igbo ji achọ asụsụ ha mma.
Ọ bụ otu ahụ ndị Igbo ji ewere ilu were na-eti okwu ha ịgba ka
ha sikwuazị ewere ụkabụilu were na-eme ka okwu ha bụrụ
kpoo ma kwụrụkwa chịm. Okwu Igbo ọbụla e ji ilu maọbụ
ụkabụilu were ghụọ ahụ na-abụ sọ mma ma tọgbọrọkwa ka
okporoụzọ. Ilu maọbụ ụkabụilu na-edozi okwu nke ọma ma
mekwaa ya ka ọ daa ụda.
286
Asịniilu so n’otu n’ime atụmatụ okwu nkà dị iche iche e nwere
n’asụsụ Igbo. Asịniilu bụ okwu nka na-eyitebe ilu mana ọ dị
iche n’ilu. Mana ya na ilu bụcha okwu nka ndị Igbo ji edozi
okwu nke ọma.
289
12 Awọ sịrị na ihe o ji agba ọsọ Onye ọbụla kwesịrị
ka ọkpa ya ha mgbe ọbụla ọ ịkpachapụ anya na ndụ
hụrụ ndị mmadụ bụ maka na ya ma kee ezigbo
ihe e ji nnu na ose eri kacha nkwụcha n’ihi na
ha mma n’ọnụ. nkwụcha abụghị ụjọ.
290
Ilu na asịniilu bụ nka okwu ndị a ga-elebakwa anya ma
zipụtakwa ndịiche dị n’etiti ha n’ihi na ilu na nsịniilu abụghị
otu. Ha dị iche. Ọ bụ ihe ndị ahụ mere ha jiri dịrị iche ka a ga-
amalite depụtawa n’otu n’otu.
291
ilu. N’ezie, asịniilu yiri ilu. Ha abụọ bụ nwanne. Mana, asịniilu
abụghị ilu n’ihi na anụmanụ ọbụla na-akpa n’ọwarị ya.
292
Ihe ọmụmụ ọzọ a ga-eleba anya n’akwụkwọ a bụ myiri dị
n’etiti ilu na asịniilu. E nwere ọtụtụ myiri dị n’etiti ha abụọ. A
ga-amalite lebawa ha n’otu n’otu.
Ilu na asịniilu bụ okwu nkà e ji amata ndị maara ihe n’ala Igbo.
Onye ọbụla maara ihe nke ọma bụ onye a na-ewere dị ka onye
jupụtara n’amamihe. Ọ bụkwa otu ahụ ka e si ewere onye
maara maka asịniilu. Ofeke maọbụ onye amaghị ihe anaghị
ama maka ha. N’ihi nke a, onye ọbụla maara ilu na asịniilu bụ
onye a mụrụ nke ọma, o too nke ọma, a zụọ ya nke ọma, o wee
bụrụ onye obodo ji eme ọnụ ma werekwa na-anya isi.
293
Ilu na asịniilu bụkwa okwu nka e ji eduzi mmadụ, e ji adụ
mmadụ ọdụ, ma werekwa ha na-adọ mmadụ aka na ntị. Ọ bụrụ
na a tọghebe ilu maọbụ asịniilu, ihe na-ejupụta n’ime ha bụ
okwu nkuzi dị iche iche na kwa okwu mmụta, na okwu
enyemaka. Onye ọbụla na-eji okwu ilu na asịniilu eme ihe,
anaghị enwe ọgbatauhie ọbụla na ndụ ya. Ụdịrị onye dị otu ahụ
anaghịkwa azọhie ụkwụ na ndụ ya. Ihe niile na-eme n’ụwa na
ndị merela eme bụ ihe ndị Igbo ji ilu na asịniilu were kọwapụta.
Onye ọbụla na-aghọta ilu na asịniilu nke ọma na-akpachapụ
anya nke ọma na ndụ, na kwa ihe ọbụla ọ na-eme.
294
1. Gịnị bụ atụmatụ okwu? Kedụ uru dị iche iche ọ na-abara
anyị n’asụsụ Igbo?
2. Myiri ọ pụtara gịnị n’asụsụ Igbo? Were ahịrịokwu
kọwaa azịza gị. e dekwala ndị dị n’akwụkwọ a.
3. Depụta ihe ọmụmaatụ iri were kọwaa atụmatụ okwu
mbụrụ.
4. Were ihe ọmụmaatụ kọwaa ihe dị iche n’etiti myiri na
mbụrụ.
5. Kọwaa ihe bụ mmemmadụ. Were ahirịokwu dị iche iche
were chọọ nkọwa gị mma.
295
13. Kedụ ihe bụ Ahaọnọchi? Kọwaa nke a nke ọma?
297
AGWỤGWA (GWA M GWA M GWA M)
A na-eji nzata agwụgwa amata onye maara ihe nke ọma n’ala
Igbo. Mgbe ọbụla a jụrụ ‘Gwa m gwa m gwa m’ (agwụgwa), a
na-eji ya amata otu nghọta na echiche ndị mmadụ ha. Onye
amaghị agwụgwa na-amụ ya iji were mata ha. E depụtara ọtụtụ
agwụgwa (Gwa m gwa m gwa m) n’akwụkwọ Ndezu
Ụtọasụsụ Igbo a iji were mee ka ị mata ọtụtụ n’ime ha ma
marakwa ha, ma marakwa ekwu ha. Lee ụfọdụ n’ime ha:
300
erie
46 Gwa m ọnọ n’ugwu eche aka Apịtị
mgba
47 Gwa m nwaanyị nodụrụ okwu Oche ahịa
48 Gwa m ihe mara mma dara Ọkụ
mmiri, mma ya arụọ
49 Gwa m agbọghọbịa bu ite mmiri Akị bekee
nọdụ n’elu
50 Gwa m okoro ọcha na-eti ịgba Ideghi
n’ugwu
51 Agbọghọ mara mma ma ọ lụghị Okpete
di
52 Agbọghọ abụ na-agba n’isi Ụdara
53 Ihe nọ n’elu ụlọ nna gị agọrọ gị Ngwere
ọfọ
54 Gwa m ogirisi ngidingi A naghị eli dike nli
naabọ
55 Gwa m si nga ruo nga a Ili onye mkpụmkpụ
56 Agbọghọ tere uhie kwụrụ Akwụoru
n’agịga ụzọ
57 Gwa m isi ji ekweghị ntake Ọnwụ nne enweghị
nchezọ
58 Akwụkwọ ugiri ada n’ukwu Nwanne anaghị alụ
ugiri nwanne ya
59 Gwa m gwujiri gwujiri, sụkara Isi ji, etiti ya na ọdụ ya.
sụkara, a tụpuo ala a hụ ndị
mmụọ
60 Gwa m anụ nwere otu ụkwụ Ero
301
IHE OMUME SITE NA NKUZI ỤTỌASỤSỤ NKE
IRINAISII
10. Gwa m a a! o o!
302
11. Gwa m gwa m gwa m, gwa m gwujiri gwujiri, sụkara
sụkara, a tụpuo ala a hụ ndị mmụọ.
303
NKUZI ỤTỌASỤSỤ NKE IRINAASAA
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE MBỤ
OKWUNTỤHỊ (OKWUMGBAWAỌNỤ/
OKWUNTABIIRE)
305
17. Nwaanyị nọ n’ukwu mgbamgba gbagharịa baa
mgbamgba mgba.
18. Mgbeke zụtara eke n’ahịa Eke dị n’obodo Eke.
19. Manye aka n’akpa akakpọ chịpụta akị dị n’akpa akakpọ
ka i nye akakpọ ka ọ taa.
20. Ọ bụ achara ka ata nkọ ka ọ bụ ata ka achara nkọ.
E nwere ọtụtụ okwuntụhị ndị ọzọ n’asụsụ Igbo. Kedụ ndị nke ị
maara? Chọta ha ma depụtakwa ha.
307
NKUZI UTỌASỤSỤ NKE IRINAASATỌ
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE MBỤ
ỤDAOLU
(i) Ụdaelu
(ii) Ụdansụda
(iii) Ụdaala
Ụdaolu ndị a bụ ụdịrị ụda e nwegachara n’asụsụ Igbo. Nke
ọbụla n’ime ha nwere akara e ji ezipụta ya. Akara ndị ahụ bụ
ndị a:
309
(i) Akara Ụdaelu (/)
(ii) Akara Ụdansụda (–)
(iii) Akara Ụdaala (\)
Okwu ọbụla ụda ya daliri elu bụ akara ụdaelu (/) ka e ji
ezipụta ya. Nke ụda ya adalighị elu ma ọ datughị ala bụ akara
ụdansụda (–) ka a na-eji egosipụta ya. Mana okwu ọbụla ụda
ya daturu ala bụ akara ụdaala (\) ka e ji ezipụta ya.
a ị ụ ọ e i u o
m n
310
Mgbe a na-eji etinye M maọbụ N akaraụda bụkwa mgbe ha na-
arụ ọrụ na mkpụrụokwu dị ka myiriụdaume. Ọ bụghịkwa mgbe
ha na-arụ ọrụ dị ka mgbochiume.
ébé (place)
ánú (meat)
ígwú (lice)
úsú (bat)
ákwú (palm fruit)
ájí (hair)
ésú (millipede)
ńkú (firewood)
ónyà (trap)
ákwà (cloth)
édè (cocoyam)
áfù (half kobo)
úlò (house)
ézè (king)
ńchà (soap)
mbè (tortoise)
úkwù (waist)
úkwà (breadfruit)
ázù (fish)
ókà (maize)
ébé à (here)
àtó (three)
àkwá (egg)
ànó (four)
ònyé (who)
ùwé (attire)
òzó (again)
313
ìgbé (box)
ùchá (colour)
Èké (market day)
òsú (outcast)
mkpó (staff)
ògbú (deep)
ùtó (sweet)
òké (rat)
314
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE ABỤỌ
ỤDACHI NA ỤDAUSORO
I. ỤDACHI
Dị ka e siri kọwaa na mbụ n’akwụkwọ a, asụsụ Igbo bụ asụsụ
ụdaolu. Ọ bụghị asụsụ ndebeolu. Asụsụ Igbo bụ asụsụ e ji ụda
ya were na-amata ihe ọ na-akowa. Nke a pụtara na ọ bụ otu
okwu siri daa n’asụsụ Igbo ka nkọwa ya ga-esi were dị. Okwu
ọbụla e nwere n’asụsụ Igbo nwere otu o si ada, ma nwekwuazị
otu e si akpọpụta ya. Okwu Igbo ọbụla anaghị ahapụ ụda ya na
mkpọpụta ya. Okwu Igbo ọbụla hapụrụ ụda ya na mkpọpụta ya
mata nke ọma na nghọta ya adaala mmiri.
315
Ịmaatụ ụfọdụ banyere ụdachi dị ka o siri metụta okwu Igbo bụ
ndị a na-esota:
(II) ỤDAUSORO
Ụdausoro bụ ụdịrị ụda a na-enweta n’okwu maọbụ na
mkpụrụokwu, mgbe ọbụla okwu maọbụ mkpụrụokwu nwere
ụdachi nọnyeere okwu, maọbụ mkpụrụokwu ndị ọzọ. Ọ bụrụ na
mkpụrụokwu nwere ụda e jiri mara ya banye n’ahịrịokwu
maọbụ banye n’ogbu okwu, ụda ahụ o nwere na-enwe
mgbanwo. Ọ bụghịzikwa otu ahụ ụda ya siri dị mgbe ọ kwụ
naanị ya ka ọ ga-adịzi. Mgbe ọbụla mkpụrụokwu na ibe ya
nọkọrọ, ụda ha ga na-adazi bụ ụda ga-enyere aka ka nghọta na
ebumnuche okwu maọbụ ahịrịokwu ha hụrụ onwe ha na ya zuo
oke ma kwụrụkwa chịm dị ka e siri chọọ. Ọ bụ mgbe okwu
nọzirị n’ụdị ka nghọta dị n’okwu ọ kwụ na ya pụta ìhè nke
316
ọma, ka a maara dị ka ụdausoro. Ọ bụrụ na mkpurụokwu hapụ
ịkwụrụ onwe ya, were banye n’etiti ọtụtụ mkpụrụokwu ndị ọzọ
ga, ụda ya na-esizi n’ụdachi banye n’ụdausoro. Mgbe ọbụla
okwu si n’ụdachi banye n’ụdausoro, akaraụda okwu ahụ ga-
ebuzi ga-adị iche na mgbe ọ bụ ụdachi. Ọ bụghịzikwa otu e siri
tinye akaraụda n’okwu bụ ụdachi ka a ga-esi tinye ya n’okwu
bụ ụdausoro. Ọ bụ otu ahụ ụda okwu ga-esi gbanwoo ma ọ
banye n’etiti ọtụtụ okwu maọbụ mkpụrụokwu ka akaraụda ya
ga-esi gbanwoo. A ga-eji ihe ịmaatụ were zipụta nkọwa ihe
omụmụ a nke ọma. Ọ bụkwa mkpụrụokwu ndị ahụ e depụtara
bụcha ụdachi, ka a ga-eji gosipụtakwa ịmaatụ maka ihe ọmụmụ
a banyere ụdausoro. Ngwa lee ka ha siri kwụrụ:
(i) Ọ sị m kwuo ihe mụ hụrụ.
(ii) Anadi achọtala ebe nwoke ahụ bi.
(iii) Obiekwe achọghị isoro duo Amadi n’ije ahụ.
(iv) Hapụ ya ka ọ rahụ ụra.
(v) Tinye nnu n’ofe ahụ.
(vi) Ego ahụ dị n’ime akpati
(vii) Ụzọ ụgbọala adịghị na be ha
(viii) Ọ naghị ebi ndụ ọjọọ
(ix) Si n’elu nkwụ ahụ wụtuo
(x) Anyị chọrọ udo Chukwu ebe a.
317
IHE OMUME SITE NA NKUZI ỤTỌASỤSỤ
NKE IRINAASATỌ
319
NKUZI ỤTỌASỤSỤ NKE IRINAITOOLU
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE MBỤ
ỊTỤ OKWE
Tupu ndị ọcha abata n’ala Igbo, ndị be anyị nwekwara ọtụtụ
egwuregwu ndị nke ha na-egwuri n’ime ụlọ ha. Ịzụ lido,
dụrafụtụ, cheezi, wọọtụ, sụkrabụl na kwa ndị ọzọ ga bụ
egwuregwu ime ụlọ so ndị ọcha were bịa. Ha abụghị
egwuregwu ndị Igbo. Ha bụ egwuregwu wụrụ mmiri naasa na
ịkpa naasaa were wụbata n’ala Igbo. Mana tupu egwuregwu ndị
a niile abata na be anyị, anyị nwere egwuregwu ime ụlọ nke
anyị na-egwuri. Egwuregwu ime ụlọ ndị Igbo nwere magburu
onwe ha na mma ma bụrụkwa sọ ụtọ.
320
Mkpụrụ okwe na-adị asaa n’ọnụọgụ. Ọ bụrụ na a nọkọchaa ịtụ
okwe, mmadụ naabọ karịa, onye ọbụla n’ime ndị ahụ na-atụ
okwe o ruoro ịtụ okwe, ga-achilite mkpụrụ okwe asaa ahụ, chịrị
ha n’otu aka, n’obo aka nri ma kwuchikwaa aka ya. Onye ahụ
ga-atụli otu mkpụrụ okwe elu site n’ime mkpụrụ okwe asaa ahụ
ọ chị n’aka. Tupu ọ ghọrọkwa nke ahụ ọ tụliri elu, ọ ga-
ebugosu ụzọ wụsa mkpurụ okwe isii ndị ahụ ọ chị n’aka, n’ala.
Ọ ga-awụsa ha, ọ ga-ahụ na ọ chịkọdoro ha ọnụ, maka ha
gbasachaa agbasa mgbe ọ na-awụsa ha, ọ ga-ahịa ya ahụ
ikporokwa ha ma ọ tụliekwa otu mkpụrụ elu.
Ọ bụrụ na onye na-atụ okwe, chịsa mkpụrụ okwe isii ahụ n’ala
ma nwekwaa ike ghọrọkwa otu mkpụrụ okwe ahụ ọ tuliri elu, ọ
ga-amalitezi ịtụtụrụba okwe isii ahụ n’otu n’otu. Tupu ọ tụtụrụ
otu mkpụrụ okwe ọbụla n’ime mkpụrụ okwe isii ahụ kposa
n’ala, ọ ga-atụli otu mkpụrụ okwe elu ma ghọrọkwa ya ozigbo
ọ tụtụụrụ otu mkpụrụ okwe n’ime mkpụrụ okwe isii ahụ. Nke
ọbụla ọ tụtilitere, ọ ga-agbakwa mbọ dowe ya n’otu akụkụ tupu
ọ ghọrọkwa nke ahụ ọ tụliri elu. Ọ bụrụ na ọ tụtụrụchaa okwe
ndị ahụ, mkpụrụ okwe isii ndị ahụ, otu, otu, ọ malitekwa
chịrịwa ha mkpụrụ abụọ, mkpụrụ abụọ. Ọ bụrụkwa na ọ
chịrịchaa ha mkpụrụ naabọ, mkpụrụ naabọ, wụsakọọ ha ọnụ,
na-adaghị iwu ịtụ okwe ọ dara, ọ ga-amalitekwa ịchịrị mkpụrụ
okwe isii ndị ahụ niile chịsa n’ala, tupu ọ ghọrọkwa nke ahụ ọ
tụliri elu. Ọ bụrụ na ọ chịlite mkpụrụ okwe isii ahụ ma
ghọrọkwa nke ahụ ọ tụliri elu, ndị ha na ya na-atụ okwe, ga-
amata ozigbo na ọ laferela site n’adaghị iwu ọbụla. Ndị ha na
ya na-atụ okwe na-eji ọńụ anabata ụdịrị ọnọdụ a.
321
Otu e si ada iwu ịtụ okwe bụ ọ bụrụ na onye na-atụ okwe ahapụ
ka okwe danahụ ya were daa n’ala, ma mgbe ọ na-atụli okwe
elu ma mgbe ọ na-aghọrọkwa ya, ma mgbe ọ chịlitere okwe
elu, ma mgbe ọ wụsara ha n’ala, onye ahụ na-akwụsị ịtụ okwe
ozigbo, onye ọzọ amalite. Naanị ahụhụ ndị na-atụ okwe na-ata
onye ha na ya na-atụ okwe dara iwu ịtụ okwe bụ ịkwụsị ya ịtụ
okwe ozigbo, onye ọzọ o ruoro ịtụ okwe amalite. Onye ahụ
dara iwu ịtụ okwe ga-echerekwa tutuu o rutukwa ya ọzọ.
322
N’ezie, ịtụ okwe bụ egwuregwu ọma ma bụrụkwa nke anyị
agaghị ekwe ka mmiri rie ya. Onye Igbo ọbụla kwesịkwara
ịmata na nke anyị bụ nke anyị, nke ha bụrụ nke ha. Lekwa
ọmarịcha egwuregwu ime ụlọ ndị gboo tara ahụhụ were
chepụta ma hibere anyị, ka anyị gbachiri nkịtị, ụlọ were na-
achọ ka ọ dado elu uko.
323
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE ABỤỌ
ỊZỤ NCHỌRỌKỌTỌ
324
were otu maọbụ abụọ karịa anọ. Mba! A naghị eme ya eme
n’egwuregwu ịzụ nchọrọkọtọ.
Ịzụ nchọrọkọtọ malite, ọ bụ otu onye n’ime ndị ahụ chọrọ ịzụ
nchọrọkọtọ ga-amalite ya bụ egwuregwu site na-isi n’oghere
nke ya were chịlite mkpụrụ okwe nchọrọkọtọ anọ, ndị nke ọ
ga-amalite tụnyebe n’ime nchọrọkọtọ ahụ niile n’otu n’otu.
Oghere ọbụla mkpụrụ okwe nchọrọkọtọ ọ chị n’aka nọ were
gwụ, ọ bụrụ na ọ nwere mkpụrụ okwe nchọrọkọtọ dị n’oghere
ahụ, ọ ga-achịliri ha, ma na-agakwa n’ihu na-atụnye ha otu,
otu, n’ime oghere niile ahụ tutuu mkpụrụ okwe nchọrọkọtọ o ji
n’aka agwụnahụ ya n’oghere mkpụrụ okwe nchọrọkọtọ
atọgbọghị n’ime ya chaachaa. Ọ zụrute n’ụdịrị oghere dị otu
ahụ, ọ kwụsị ịzụ n’ihi na aka amala ya. Ọ bụrụkwanụ na
mkpụrụ okwe nchọrọkọtọ o ji n’aka gwụnahụ ya n’oghere
mkpụrụ okwe dị na ya dị mkpụrụ okwe atọ, ọ ga-atụnye naanị
otu mkpụrụ okwe ahụ o ji n’aka n’ime mkpụrụ okwe atọ ahụ, ọ
ga-esi n’oghere ahụ chịpụta mkpụrụokwe anọ ahụ n’ihi na o
riela ha.
325
Mgbe ọbụla a na-azụ nchọrọkọtọ, oghere ọbụla okwe dị n’ime
ya dị atọ bụ okwe dị ime, nke onye ọbụla so were na-azụ
nchọrọkọtọ na-achọ ka ọ bụrụ ya ka ọ dabaara site n’ịchịrị ya.
Onye so azụ nchọrọkọtọ na-eji aka ya achụ onwe ya n’ụgbọ ma
ọ bụrụ na ọ zụtaghị ọnụ ya. Ọ bụ site n’okwe nchọrọkọtọ ahụ a
na-eri ka e si amata onye a napụrụ oghere ndị nke ruoro ya.
Maka na ọ bụ mkpụrụ okwe nchọrọkọtọ ụzọ anọ ole i ritara na
nchọrọkọtọ unu na-azụ ga-egosi ma ị ka nọ n’egwu ka ị ga-
achịli aka.
Ịzụ nchọrọkọtọ na-enyekwa obi ụtọ n’ụdị pụrụ iche. Ndị Igbo
si n’egwuregwu ịzụ nchọrọkọtọ were na-eme onwe ha obi ụtọ,
ma werekwa ya na-ahụkọrịta onwe ha n’anya. A naghị ese
326
okwu ebe a na-azụ nchọrọkọtọ. Naanị ihe a na-ahụ ebe a na-azụ
nchọrọkọtọ bụ egwu na amụ, ìzù ọma na nkàta ọchị.
1. Gịnị bụ Ọjị?
2. Kedụ ka ndị be unu si awa ọjị?
3. Dee ma kọwaa EKELE n’omenaala Igbo.
4. Gịnị bụ Ọmụgwọ?
5. Ọ bụ naanị nwaanyị na-eje ọmụgwọ ma na-elekwa
ọmụgwọ?
6. Dee ma kọwaa ihe bụ Iru Mgbede
7. Kedụ ihe kpatara Iru Mgbede ji were bụrụ ihe a na-
emere ụmụagbọghọbịa?
8. Dee ma kọwaa Nrọ
9. I kwetakwara na Nrọ? Kọwaa onwe gị nke ọma.
10. Olee ihe bụ Ụmụọkpụ n’ala Igbo?
11. O nwere uru Ụmụọkpụ bara? Kọwaa nke a nke ọma.
12. Gịnị bụ Ịtụ okwe? Kedụ ka e si atụ okwe n’ala Igbo?
13. Dee ma kọwaa otu e si azụ Nchọrọkọtọ n’ala Igbo.
327
NKUZI ỤTỌASỤSỤ NKE IRIABỤỌ
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE MBỤ
EDEMEDE
I dechaa edemede gị, jisie ike gụgharịa ihe ahụ ị dere ka i were
nwee ike degharịchaa ndehie niile dị na ya bụ edemede. Nke a
ga-emekwa ka edemede gị sụrụ gedee. Ọ ga-emekwa ka i
tinyekwa akaraedemede n’ebe i chetaghị tinye ha mgbe ị na-
ede ha.
331
A ga-eji edemede ịmaatụ were gosipụta edemede akọmakọ a
na-ekwu maka ya.
332
Tupu chi ụbọchị na-efochasị nke ọma, ahịa ejupụtala n’ọnụ.
Ụzụ na-esi n’elu adabiri tụọ n’ala. Mkpọtụ na-arị ibe ya elu.
Naanị ihe ị ga na-anụ bụ: Ọ bụ onye kpọbara ahịa? Ị na-ere ego
ole? Kedụ ebe m ga-azụta nke a maọbụ nke ọzọ? Goonụ ahịa!
Onye chọrọ ya?
Ụbọchị Orie anaghịkwa abụ ụbọchị ọrụ maka ndị ọrụ ugbo na
be anyị n’ihi na ọ bụ ụbọchị ahụ ka ha ji ere ihe ndị ha rụpụtara
n’ubi ha na mkpụrụ ụbọchị atọ ndị garala aga tupu ụbọchị ahịa
Orie..
333
Ndị nke na-ere ere ọ kachasị ndị na-ere ihe mmebi, na-achọ otu
ha ga-esi rechaa ihe ha buuru bịa ahịa tupu chi ejibido ha na ya.
Ọsịịsọ niile ahụ ndị na-azụta ihe na ndị na-ere ihe na-eme, na-
ewetakwuazị ụdịrị ụzụ nke ya. Ndị na-abịakwanụ ahịa mgbede
na-abịa ọsọ ọsọ ka ha were kwụdo ihe ha chọrọ. Ọ bụ oge dị
otu a ka ọtụtụ ndị na-ere ahịa na-eji mgbịrịmgba agwa ndị
mmadụ ka ha bịa zụrụ ha ahịa ebe ndị na-enweghị mgbịrịmgba
ha na-akụ, na-eji olu ha eti mkpu na-agwa ndị mmadụ ka ha
gbara ọsọ bịa na nke ha, n’ihi na ọ na-agwụ agwụ. Ọ bụ otu a
ka ahịa ga-esi kwokata ekwo tutuu chi ejie nke ọma. Otu a ahịa
Orie be anyị si eju n’ọnụ ụbọchị Orie ọbụla malite n’ụtụtụ were
ruo na mgbede kpatara ndị be anyị ji ekwu okwu na-asị na Orie
Ikuma amaghị na otu onye abaịghị ya.
Ihe ọma ọ na-esi n’elu ada n’ala? Mba! O nwere onye a mụrụ
mụọ ya na ọgaranya, akụnaụba na inwe ańụrị? Mba! N’ihi nke
a, ndụ onye ọbụla na-ebi bụ otu o siri were tọọrọ onwe ya
ụkpụrụ ọ na-eso. Onye ọbụla Chineke Nna kere nọ ndụ n’ụwa a
ga-atarịrị ahụhụ tupu ọ kpata ihe o riri. Onye achọghịkwanụ ịta
ahụhụ wee kpata ihe ọ ga-eri agaghịkwa ahụ ihe o riri n’ihi na ọ
bụ otu onye siri dowe àkwà ya ka ọ ga-esikwa rahụ ụra na ya,
maka mmiri e jiri sie agwọ na-atọ agwọ agwọ. N’ihi nke a,
335
onye ọbụla ihe ọma, ihe dị mma, iriju afọ, inwe ańụrị na-adị
mma maọbụ na-agụ agụụ ga-abụ onye ịgba mbọ na ịrụsi ọrụ ike
na-adịkwuazị mma n’ihi na ọ bụ aka mere azụ ọ gbaa
nkụrụnkụ. Onye iri ụkwá na-adị mma asọkwala ya oyi ma o ruo
na mpịcha ya maka na ọ bụ aka gwọchapụtara egwusi o jiri dị
mma oriri.
337
EDEMEDE ARỤMỤKA (ARGUMENTATIVE ESSAY)
Edemede arụmụka bụ ụdịrị edemede ọzọ na-enye
ụmụakwụkwọ nsogbu. Ọ na-abụrụ ha ihe mgbagwoju anya
mgbe ọbụla ha na ya jekọrọ. Nke a bụ edemede gị onwe gị na-
ede iji akọwapụta otu i chere na ihe (isiokwu) e nyere gị dee dị,
maọbụ otu ọ dịghị. Ụdịrị edemede a bụ edemede a na-esi ngọ
na ya. A na-anọ n’ime ya anagha maọbụ agbagha okwu ọbụla e
wepụtara dị ka isiokwu. Onye na-ede ụdịrị edemede a ga-agba
mbọ hụ na o kwụghị naanị n’otu akụkụ mgbe ọ na-agbagha
isiokwu ọ na-ede maka ya n’edemede ya. Ọ ga na-esi ngọ ya
n’akụkụ isokwu naabọ. O kwuo na ọ bụ ya, o kwuo na ọ bụghị
ya. Nke ọbụla o kwuru o nye nkọwa ihe kpatara o jiri kwuo otu
ahụ. Mana n’ikpeazụ, na ngwụcha edemede ya, ọ ga-agbazi
mbọ kwuo kpọmkwem ebe ọ kwụ akwụ. Nke a bụ otu edemede
arụmụka nke ga-enyere gị aka na nkọwa na mmụta banyere ya.
Ọ bụ eziokwu na ndị nwụrụ anwụ
Na-apụta n’ụdị ndị mmụọ?
338
ụfọdụ ndị mmadụ na-ahụ sị na ọ bụ mmụọ ndị nwụrụ anwụ bụ
oke egwu ọtụtụ ha na-enwe, eyimnuche ha na nkwenye ha, na-
ebutere ha nke a, na ọ bụ onye kwetara na mmụọ ndị nwụrụ
anwụ na-apụta na-abụ ọ hụ ihe dị ka ukwu osisi n’abalị maọbụ
akpa ọchịchịrị, nnukwu egwu ejide ya, isi ebuo ya, ọ sị na ya
ahụla mmụọ. Onye ahụ ahụghị mmụọ kama ọ bụ eyimnuche ya
mere ya ọ dị ka ọ bụ mmụọ ka ọ hụrụ.
341
ndị mmadụ ha jiri kweta ma kwenyesie ike na ndị nwụrụ anwụ
na-apụta n’ụdị ndị mmụọ.
Mana ajụjụ wee bụrụ: Ọ bụrụ na ọgwụ ndị ahụ apụta n’ụdịrị
onye ahụ gwọrọ ha nwụrụla anwụ were na-akpagharị, kedụ ihe
onye hụrụ ya n’ụdịrị onye ahụ nwụrụ anwụ ọ dị ka ya wee pụta,
ga-asị na ọ hụrụ? Ọ bụ mmụọ onye nwụrụ anwụ ka ọ ga-asị na
ọ hụrụ? N’ihi ya, ọ bụ eziokwu na ndị nwụrụ anwụ na-apụta
n’ụdịrị ndị mmụọ?
343
nkọwami a bụ ihe dị ka: Ọnwụ, Ańụrị, Ịhụnanya, Isi ike,
Echiche, Iwe dgz. Ọ bụrụ na e nye gị ụdịrị isiokwu a ka i dee,
ihe ị ga-eme bụ na ị ga-agba mbọ kọwaa ya bụ isiokwu mee ka
omimi ahụ ọ dị, na nghọta ya, pụta ìhè site n’ịkọwa ụdịrị agwa
ọ na-akpa, ihe o merela, na otu ndị mmadụ siri hụ ya. Mgbe
ụfọdụ n’ụdịrị edemede a, i nwere ike iwebata ihe ịmaatụ ma ọ
dị na mkpa n’edemede gị. Kama jidekwa n’aka na ihe
ọmụmaatụ gị adịghị iche n’ihe a sịrị gị dee maka ya.
Ọnwụ nyịrị onye ukwu, nyịa onye nta. Ị ga-ejide ihe n’aka,
ọnwụ abịa gbaghee gị aka nara gị ihe ahụ i ji. Ọ dịghị ihe ị ga-
eme. Ụdị dimkpa ọ masịrị gị bụrụ, ụdịrị ike ọ sọrọ gị sie, ọnwụ
bịa a gaghị agwa gị na ọ bịara n’ihi na a naghị agwa ochi ntị na
agha esula. Ọ bụghị mmadụ na-agwa gị na ihe karịrị gị
abịakwutela gị maka na ọ na-egbu gị, ọ dịghị ihe ọbụla ị maara
ị ga-eme ya karịkwaa n’ikweta na nke o kwuru.
Ọtụttụ ndị ọkammụta emeela ihe dị iche iche ha nwere ike ime
iji were meminaa ọnwụ, mana mbọ niile ha gbara bụ mmiri ka
ha wụsara na mkpume n’ihi na nwata na nna ya anaghị esi
ogologo. Ihe karịrị mmadụ karịrị chi ya. Ọ dịghịkwanụ onye
ọbụla maara ihe a ga-eme ka ọnwụ laa. Ime nke a nyịrị mmadụ
otu ịnyụ amịrị si were nyị ọkụkọ.
346
Mana naanị nchekwube dị na ya bụ na ọnwụ agaghịkwa adị
mgbe ọbụla ọnwụ nwụrụ.
350
Nọnso: Ka o ree ka i si were kwuo. Ka anyị gụwa
akwụkwọ anyị gụsiwe ya ike n’ihi na ọgba ọsọ
anaghị agbadebe ọsọ naanị ma ihe na-achụ ya ọ
chụdebere ya.
351
Mana na nrụrịtaụka, onye na-eme ya na-akwụ otu ebe, kwụsie
ike. Ọ naghị agbagharị agbagharị. Ọ nwaa anwa hapụ ihe ọ na-
ekwu maka ya were kwuwe ihe ọzọ, ọ mara na o werela aka ya
gwuo ili onwe ya na nrụrịtaụka ahụ. Nke a bụ otu ha
(nrụrịtaụka na arụmụka) siri dị iche na nghọta ha.
Ndị ọma m ji eme ọnụ, onye hụchara ozu ele were na-achọ
nzọụkwụ ya mara na ọ bụrụ na o nweghị ihe na-eme ya n’isi, o
nwere ihe ọ na-eme. Ọ bụghị onye hụchaa ọcha ọ sị na ọ hurụ
oji. Onye hụkwaranụ eziokwu were na-agbakpo ya aja mara na
ọ bụ nwaanyị chọọ ịchọ nwunye di ya okwu ọ sị ya nye ya
352
mmanụ ka o were taa akwụ. Uru ọbịbịa ndị ọcha bịara n’ala
Igbo anyị baara anyị adịghị obere.
Tupu ndị ọcha bịa be anyị, anyị nwere ihe a na-akpọ ohu na
osu. Ohu bụ mmadụ a zụtara azụta na-eme ihe ọbụla a gwara ya
ka o mee. A na-eji ohu ekpo ahịhịa n’ala Igbo mgbe ahụ ma
werekwa ya na-ehicha ike. A naghịkwa ewe ohu dị ka mmadụ
ndị ọzọ. Onye ọbụla bụ ohu anaghịkwa eme ihe ọbụla onye
abụghị ohu ga-eme. Onye nwere ohu na-ejikwa ohu ya eme ihe
masịrị ya. Osu bụkwa onye a gọọrọ arụsị. Osu na mmadụ nkịtị
anaghịkwa emekọrịta. Ya na nwaamaala anaghị anọkọ n’otu
ụlọ. Ọ bụ n’okwu arụsị ahụ a gọọrọ ya ka ọ ga na-anọ. Ọ
bụkwa ebe ahụ ka ọ ga na-arahụ. Ohu na Osu chọọ ịlu nwaanyị
maọbụ chọọ inwe mmekọrịta mmadụ na ibe ya, ha achọwa ohu
353
na osu ibe ha. Mana ọbịbịa ndị ọcha na be anyị mere ka anyị
ghọta na ohu na osu bụ mmadụ ibe anyị. Ọ dịghị ihe ọbụla dị
iche. Na ọ bụ otu Chukwu siri kee anyị ka o siri kee ha. Ịkpa
oke na nkewa n’ebe ha nọ bụ ime arụ megide Chukwu anyị.
Onye ọbụla kwesịrị iwere mmadụ ibe ya dị ka nwanne ya.
Ọbịbịa ndị ọcha nyekwaara anyị aka n’iwulite ọrụ ugbo. Ọbịbịa
ndị ọcha mere ka anyị ghọta na ọ bụghị naanị ọgụ na mma ka
mmadụ ga-eji rụpụta erimeri na gbanyụụ. Ha mere ka anyị
chọpụta na o nwere ihe a ga-eme ala achọghị imepụta nri ka o
meta nri nke ọma. E nwekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị ka igwe dị
iche iche e ji arụ ọrụ ugbo ọbịbịa ha weteere anyị. Ọbịbịa ha
mekwara ka anyị kwụsị ịdị na-arụ ọrụ ugbo n’ìsì site n’ụdịrị
nkuzi na ihe ọmụmụ dị iche iche banyere ọrụ ugbo.
354
Ndị ọcha ji agụmakwụkwọ were wụchie na be anyị. Kedụ uru
ka nke a? Ugbua, ọtụtụ ndị Igbo amarala ka e si agụ na ka e si
ede. Mana tupu ndị ọcha abịa, ọ dịghị onye maara ede aha ya.
Ụfọdụ amaghịkwa ihu ha nke ha na-ama azụ ha.
Agụmakwụkwọ nyekwaara ndị be anyị aka ka ha
bawanyekwuo n’amamihe ha, na nghọta ha, na mmekọrịta ha.
Mgbe ochie, mgbe ndị ọcha abịabeghị n’ala Igbo, amamihe ndị
be anyị nwere njedebe. Mana ugbua, agụmakwụkwọ emeela ka
echiche na ncheta anyị nwere n’ime anyị na-atụ nkọ ka agụba.
Ọ bụghịzi naanị n’isi ka ndị be anyị na-ebu ihe niile ha maara,
ihe ha mere, na nke e mere ha, nke ọ na-abụ o tee aka ha
echefuchaaa. Ha chetagodu ya echeta, ihe dị iche ga-adịrị n’ime
ya. Mana, ọbịbịa ndị ọcha wetaara anyị ọgụgụ akwụkwọ emela
ka anyị malite detuwe ihe n’akwụkwọ maka ncheta n’oge ọbụla
a chọrọ ya.
Ndị nna nna anyị ha na ụmụ anụmanụ na-azọ ụzọ mgbe ochie
n’ihi na ọ dịghị ezigbo okporo ụzọ dị. Naanị warawara ụzọ bụ
ihe dị. Warawara ụzọ ndị ahụ dịchakwu n’etiti ọhịa. Ọ bụ naanị
ọkpa ka e nwere ike iji gaa n’ụzọ ndị ahụ n’ihi okoroto ọhịa
dịcha n’akụkụ ha. Mgbe ụfọdụ, ajọ anụ ụfọdụ dị ka agụ, ọdụm,
agwọ, eziọhịa na anụ ndị ọzọ na-atagbu ndị chi ọjọọ ụfọdụ ma
ha na ha zuo n’ụzọ. Mana ugbua, e nweela okporoụzọ bekee so
ndị ọcha were bata. Anụ ọbụla pụtakwaranụ n’ụzọ bekee, egwu
356
na-atụ ya maka igbu ya. N’ihi nke a, onye ọbụla nwere ike
isoro ụzọ bekee gaa ebe masịrị ya ugbua.
Tupu ndị ọcha abịa, ndị be anyị niile bụ ndị oji ụkwụ eje Aba.
Ha bụcha ndị ọgara na Nkwọ lọta n’Eke. Nke a na-akọwa na ọ
bụ ọkpa ka ha ji eje ebe ọbụla ha chọrọ ije. Anyịnyaigwe
adịghị. Ụgbọala adịghịkwa ma ya fọdụkwa ụgbọelu. Ihe ọbụla
ndị be anyị chọrọ ịga mgbe ahụ na-eri ha oge nnukwu n’ihi na
tupu ha ewere ọkpa ruo ebe ha na-aga, oge agalahụ ha. Ọ
bụghịkwa naanị nke a, ụfọdụ ka ọ na-abụ ha were ọkpa gachaa
ebe tere ezigbo aka lọta, ọkpa ha azachaa. Mana ugbua, ọbịbịa
ndị ọcha ewetarala anyị ọtụtụ ihe dị iche iche e ji aga njem
ngwa ngwa dị ka anyịnyaigwe, ụgbọala, ụgbọmmiri, ụgbọelu
na ụgbọigwe (òlòkó).
Ọ bụrụ na e sowe ụtọ agbọnọ, anyị arahụ n’ukwu adụ. N’ihi ya,
anyị ga-ahapụ ụtọ nkwụ na isi nkwụ ka anyị ńụọnụ ihe nkwụ
gbatara. Anyị agaghị agbasoro na nna anyị bịara anyị ụwa were
nyegbuo ya na nri. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị kọrọkwanụ uru
ọbịbịa ndị ọcha bịara na be anyị gawa, anyị agaghị akọcha ya
akọcha n’ihi na ha bụ aja dị n’ala. Mana ka o sila dị, ana m asị
357
na ebe ọ bụ na a naghị ericha otu ụbọchị, ụbọchị nta ka anyị
chụọnụ n’owere nchi. Ndewo nụ!!!
359
chetara, e debata. A na-akwado ya akwado, mara usoro e ji ede
ya tupu a malite ide ya.
Leta keụdị na-ebu adreesị abụọ. Otu adreesị bụ nke odee leta,
mana adressị nke abụọ bụ nke onye a na-edegara leta ahụ.
Adreesị onye na-ede leta keụdị na-adị na mpaghara isi mbido
aka nri nke akwụkwọ e ji ede ya. Na leta keụdị, odee leta na-
ebu ụzọ ede adreesị ya tupu ọ malite dewe nke onye ọ na-
edegara leta ahụ.
360
A. ADREESỊ LETA KEỤDỊ NWERE AKARAEDEMEDE
OTU O KWESỊRỊ
Nnamukwu,
Abụ m
Nweke Nwafọ
361
B. ADREESỊ LETA KEỤDỊ NA-EBUGHỊ
AKARAEDEMEDE
(Ọ bụ otu a ka o kwesịrị ka i si were dee ya)
Nnamukwu
Abụ m
Nweke Nwafọ
362
Ka e wepụta ihe odide nzipụta maka edemede leta keụdị ijiri
wetaruo nghọta ya n’isi.
Nnamukwu,
Abụ m,
Uchechukwu Nnanna.
364
LETA KEMPỤNỤỤDỊ (INFORMAL LETTER)
Ọ bụghị ụdịrị usoro a na-agbaso ma a na-ede leta keụdị ka a
na-agbaso ma a na-ede leta kempụnụụdị. Edemede leta ndị bụ
leta kempụnụụdị bụ leta ị na-edegara nwanne gị, ikwu na ibe
gị, nne gị, nna gị, enyi gị, nwataakwụkwọ ibe gị dgz.
Ezigbo enyi m,
___________________________________________________
___________________________________________________
___________________________________________________
___________________________________________________
___________________________________________________
___________________________________________________
___________________________________________________
___________________________________________________
___________________________________________________
___________________________________________________
___________________________________________________
_______________________________________
Abụ m,
Ezigbo enyi gị,
Chinwe.
366
B. Lee otu adreesị leta kempụnụụdị na-ebughị
akaraedemede ọbụla na-adị
Ezigbo enyi m
___________________________________________________
___________________________________________________
___________________________________________________
___________________________________________________
___________________________________________________
___________________________________________________
___________________________________________________
___________________________________________________
___________________________________________________
___________________________________________________
___________________________________________________
_______________________________________
Abụ m
Ezigbo enyi gị
Chinwe
367
Dị ka e siri kọwaa na mbụ n’akwụkwọ a, ọ bụghị naanị leta ị
na-edegara enyi gị bụ leta kempụnụụdị, leta ndị ahụ ị na-
edegara nne gị na nna gị, ụmụnne gị na ụmụnna gị, ikwu gị
na ibe gị dgz, bụcha leta kempụnụụdị.
Ezigbo enyi m,
369
Nri, ụdị ọbụla ị chọrọ gbara kọsaa. A naghị achọ ihe oriri achọ
na mkpụrụ ụbọchị anọ ahụ e riri oriri Ihejiọkụ nke afọ a.
Ezinaụlọ ọbụla ị banyere, e were ihe oriri, ma anụ ma azụ, na-
achụ gị ọsọ. Ihe oriri, ụdị ọbụla ị chọrọ, ma osikapa, ma nri ji,
ma ji awaị dịcha na be onye ọbụla ụbọchị ahụ. Anụ bụ ị takarịa,
ị rịakarịa n’izu ahụ. Ọ baghịkwa uru ịjụ ma mmanya ọ dịkwa
n’izu ahụ n’ihi na mmanya na-arị ibe ya elu. Onye
kworokwanụ otu mmanya siri jupụta ebe niile n’izu ahụ were
ńụọ ya, o gbunye onye ahụ nzuzu n’ahụ. Ọtụtụ ndị kama ọ ga-
adọ n’ite ka ọ dọrọ n’afọ ńụchara mmanya n’izu ahụ na-
akpọregharị n’ụzọ.
Bido n’ụbọchị Eke ahụ a malitere iri ji ahụ were ruo ụbọchị
Nkwọ bụ ụbọchị ikpeazụ, mmọnwụ ghachiri ọhịa na ụzọ niile
dị na be anyị. Nke a soro mee ka obodo anyị kpoo ọkụ karịa. Ọ
dịghị ụdịrị mmọnwụ apụtaghị n’Ihejiọkụ nke afọ a. Ma
mmọnwụ ndị mere afọ ise ma ndị merela afọ asaa ha
pụtadebere, pụtachara n’oriri Ihejiọkụ nke afọ a. Mmọnwụ ndị
nke a gbara ọhụrụ bụkwa aja dị ka ala. Ọtụtụ obodo ndị ahụ
gbara anyị ọkirikiri sikwa be ha tiri mmọneụ ndị nke ha zọchie
n’obodo anyị. Ebe niile were na-ahịọ n’elu, na-ahịọ n’ala.
Uche, n’ezie, ọ dịghị ụdịrị ihe mụ ejighị anya mụ hụ n’Ihejiọkụ
nke afọ a. Ọ gaara amagbu onwe ya ma ọ bụrụ na i jiri anya gị
were hụrụ ihe merenụ, nke ga-eme ka ihe m na-ekwu were kwe
gị nghọta. Ụfọdụ mmọnwụ bụ ndị mụ ahụtụbeghị kemgbe a
mụrụ m. Amakwa m na ọ bụ otu ahụ ọ dị m ka ọ gaara ịdị gị
ma ọ bụrụ na i so m hụ mmọnwụ ndị ahụ m na-ekwu maka ha.
N’ezie, ha na-atụcha egwu ile anya.
370
Ụbọchị Nkwọ bụ ụbọchị e riri oriri ahụ dịzị ka a ga-asị na ọ bụ
ya kacha ụbọchị oriri ndị ọzọ mma. Ọtụtụ òtù na ndị ọgbọ dị
iche iche nke ndị ọgbọ gị so n’ime ha bupụtachara egwu ha
mụrụ ọhụrụ ụbọchị ahụ. Ama m na ọ bụrụ na ị nọ n’ụlọ, na ị
gaara ịbụ obu ụzọ egwu ndị ọgbọ gị. E nweghị ụdịrị egwu a
gbaghị ụbọchị ahụ. Ndị ọbụla na-agba ka ọ bụrụ ha
gbanahụchara ndị ọzọ. Ebe niile ụbọchị Nkwọ ahụ bụ naanị obi
ụtọ, obi ụtọ. Iji kwuo eziokwu, ańụrị nke ụbọchị ahụ chọrọ igbu
mmadụ. Obi ọcha riri ibe ya elku! Amaghị m na ọ bụ maka na
ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ikpeazụ maka oriri Ihejiọkụ nke afọ a
kpatara ya. N’ihi na onye ọbụla nọ n’elu a gbachaa a lawa ndụ’,
were chebirikwa afọ ọzọ.
Abụ m,
Ezigbo enyi gị,
Ugoo.
371
IHE OMUME SITE NA NKUZI ỤTỌASỤSỤ NKE
IRIABỤỌ
EDEREDE
376
IHE OMUME SITE NA NKUZI ỤTỌASỤSỤ NKE
IRIABỤỌ NA OTU
ABỤ
377
ONYE ỤWA AHỤHỤ
Onye ụwa ahụhụ
Mmiri niile zoro
Malite n’afọ ruo n’afọ
Na-ala gị n’ahụ
Anwụ niile kere n’afọ
Malite n’ọnwa ruo n’ọnwa
Achanwụchaala gị ntutu isi
Iji eze ekpere ekwere
Akwọchaala gị isi
380
Onye ụwa ahụhụ
Ị jụọla chi gị ajụjụ?
Ugboro ole?
Ọ bụ gị
Ka o si n’aka
Ka ọ bụ chi gị?
Kedụ azịza gị?
I nwere olileanya
N’ụwa a?
Ka ọ bụ n’ụwa ọzọ
Ka nchekwube gị dị?
Onye ụwa ahụhụ
Naanị ihe ọ na-abụ i cheta
Obi esie gị ike
Bụ na o nweghị
Onye na-echere gị
Ọnwụ ike
Mana ọnwụ chi gị
Mechaa gbuo gị
Ndị ga-asị
Na ọnwụ kaara gị mma
Na-aka
Ndị na-asị ọnwụ:
O mekwaranụ gịnị?
Gị
Onye ihe ọjọọ
Nọ n’ime ụwa ahụhụ
Werezịa aka gị
Ghọta ihe i mere
Onwe gị
N’ezie, igbu isi
Na-adị mma n’okorobịa
Mana
Nnukwu ịta ikikere eze
382
Na obi mgbu
Na-ewere oche n’agadi
Maka na ọ bụ
A gbachaa egwu
Ọ laa n’ukwu
Nkụ onye kpara
N’ọkọchị
Ka ọ na-anya n’udummiri
Maka
Na ọ bụ mkpụrụ
Onye kụrụ
Ka ọ ga-aghọrọ
N’ihi na ọ bụ
Ihe onye metara
Ka ọ ga-eji
Isi ya buru
Chetakwa
Na ị gbanahụ
Ihe i metara
Na
Ụmụ gị ejechaala
Ọ fọdụ ha ụla
Maka
Na agadi nwaanyị
Bute ụkwara
O zuo ọha niile, ọnụ.
Onye ụwa ahụhụ
Jụọ onwe gị ajụjụ
Ka ị mara
383
Ebe mmiri
Siri baa n’opi ụgbọgụrụ
Chinedum E. Ofomata
Ọdị m n’Obi (1997)
Gụọ ederede abụ a dị n’elu ka ị zazịa ajụjụ ndị a na-esota:
1. Kedụ mgbe onye ụwa ahụhụ ji enwe ezumike?
384
2. Ị nụ olu ya; Ọ bụ olu onye ka ọ ga-anụ dị ka e siri
kọwaa n’abụ a?
385
(b) ‘Na ị gbanahụ ihe i metara, na ụmụ gị ejechaala ọ
fọdụ ha ụla.’
389
As soon as the marriage is completed, and the bride has come
to her husbnad’s house, custom compels her to confess the
misdeeds of which she has been guilty since the day of her
betrothal. She is bound to divulge the name of any and every
man with whom she has been in terms of intimacy. This
confessioin is first made to the umuada, i.e relatives of the
husband. The confession takes place before the Idol awfaw, an
idol which is kept in the house of the head of the whole family.
The woman, holding a fowl in her hand, makes her confession
before the idol and then the fowl is killed, and its blood poured
upon the awfaw in expiation of her misdemeanors. The
husband is satisfied with her confession and sacrifice. He then
calls the men who have been named as accomplices in order
that reconciliation may be between himself and them. This is
accomplished by the offenders offering the prescribed
sacrifices and paying fines, if any should be assessed. Finally,
all eat kola nut, and drink palm wine together to signify that
the reconciliation is complete.
391
mechaa si n’ụzọ dị otu ahụ were mụta ụmụ, ụmụaka ndị ahụ
ga-abụ nke di ya n’ụdị na ọ bụ di ya mụtara ha.
Legends and myths themselves are scanty and only a few have
anything to do with God, idols or the gods.
393
Ihe ọmụmụ ọzọ akwụkwọ a ga-eleba anya bụ Nnyocha Abụ.
Nnyocha abụ bụ ọnọdụ a na-agbaso iji were leba anya n’abụ e
dere na kwa otu e siri dee ya. Ọ bụ eziokwu na e nwere ọtụtụ
abụ e derela n’asụsụ Igbo. Mana ọ bụ otu abụ ka a ga-ahọpụta
n’akwụkwọ a ma lebakwa ya anya dị ka o siri kwesị. A na-
agbasokwa usoro kwesịrị ekwesị ma a na-eme nnyocha banyere
ederede abụ.
1983
1983
Ị bụdị afọ
Ka ị bụdị nọmba nkịtị?
Ị bụdị agwọ abalị
Ka ị bụdị isikiriisi?
I zoro isi gị n’ebee?
Chetakwa na ị pụrụ iche n’afọ:
Ị bụrụ ụgụrụ ruo na Maachị
Kọọ ọkọchị banye n’udummiri
Mee udummiri alaa ka naị
Lee ihe a kụrụ n’ubi kpọnwụchaa
1983
Ị bụdị Nkebụeziokwu
Ka ị bụdị ọkpụrụkpụokwu?
Ime a ị dị ọ bụdị onye
394
Tụwara gị ya?
Ọ bụdị Nwachinemere Akọbụije
Ka ọ bụdị Ahamefula Ụzọigbo?
Ị ga-amụ onye:
Ọ bụdị Udodịrị
Ka ọ bụdị Nzọgbu?
1983
Elekshon nke a i buru bịa
Ihu ọ ga-adị ya ańaa?
Ị chọrọ ka ọ gaa werewere
Ka ị chọrọ ka ọ kpafara akpafara?
Ị chọrọ ka anyị kwụrụ
Ka ị chọrọ ka anyị gbafuo?
Ị na-ekwu ka a nụ
Ka ị na-ekwu ka e kwe?
1983
Olee ebe i chere ihu:
N’ụzọ gara Ịdịnootu
Ka n’ụzọ gara Ntisasị?
Ị chọrọ udo ka ị chọrọ katakata?
1983
1983 nke Naijirịa
Ọ dịdị iche na 1983 nke Briten?
Kọnzavetiv, lebọ, kọmụnisti na Demokrats
Ewerela anya udo, ịhụnanya na ezi nghọta
Rie anụ nwa nkịta ha ara gbagburu
395
A nụghị gidigidi
A zọgbughị Nwaogwugwu
A zọgbughị Nwanọsike
1983
1983 ndị Naịjirịa
Ọ chọrọ ka NPP, UPN na NPN
PRP, GNPP na NAP mee gịnị?
Ọ chọrọ ka ha kwuo Nkebụeziokwu
Ka ọ chọrọ ka ha kwuo Ọkpụrụkpụokwu?
1983
Ị ga-atọkwa nwa?
Ị chọkwara ịtọta 1984 nke ndị Naịjirịa dum,
Tinyere George Orwell na-atụ anya ya?
Biko, gaa jụọ 1959 na 1979 ajụjụ
Maka na onye ajụjụ anaghị efu ụzọ.
“1983.
Olee ebe ichere ihu:
N’ụzọ gara Idịnootu
Ka ọ bụ n’ụzọ gara Ntisasị
Ị chọrọ udo
397
Ka ị chọrọ katakata?”
“1983,
Ị ga-atọkwa nwa?
Ị chọkwara ịtọta 1984 nke ndị Naịjiri?”
(ii) 1983,
Olee ebe i chere ihu?
(iii) 1983,
Ị ga-atọkwa nwa?
401
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE ABỤỌ
NNYOCHA AKWỤKWỌ AGỤMAGỤ
‘ỤKPAKA MỊỊRỊ ONYE ỤBỊAM’
403
Chinyere werezịa aha nwata akwụkwọ ọzọ were na-anatazi leta
Amadi.
Nke kacha nke bụ na nwoke ọbụla maara ihe, onye ọbụla kpọrọ
onwe ya ezigbo nna, ekwesịghị ịkwanye nwa ya nwaanyị ka ọ
lụọ onye na-abụghị obi ya. Alụmdi na nwunye na-akacha ụtọ
ma ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị ga-alụ onwe ha kwekọrịta
n’etiti onwe ha.
N’ikpeazụ, ndị Igbo tụrụ ilu were sị kama m ga-eriju afọ were
dachie ụzọ, ka m buru ọnụ. N’ezie, ọchọ ihe ukwu ga-ahụrịrị
agba enyi maka na ọ bụ ihe onye tụrụ n’ahịa ka a ga-azụtara ya.
Onye ọbụla riri amụ ebulu ji ibi ụgwọ. Maka na ajụghị ajụ were
rie na-ebute a rịaghị arịa were nwụọ. Mkpurụ onye kurụ ka ọ
na-aghọrọ. Nna maọbụ nne ọbụla chọrọ agamnihu ezinaụlọ ya
tọọ ntị n’ala ka ọ nụ ụya agbịsị n’ihi na ntị ga-anụ ihe anaghị
aha ka okpu ata.
405
USORO E SIRI DEE ỤKPAKA MỊỊRỊ ONYE ỤBỊAM.
Usoro e siri dee akwụkwọ agụmagụ a bụ ỤKPAKA MỊỊRỊ
ONYE ỤBỊAM dabara nke ọma. Akụkọ dị na ya bụ akwụkwọ
gara n’usoro n’usoro dị ka o siri kwesị. A ga-aghọta nke ọma
na odee agụmagụ a bụ Akaochie n’ihe gbasara ide agụmagụ
Igbo. Asụsụ Igbo o jikwanụ dee agụmagụ a bụ asụsụ Igbo
Izugbe. Igbo o jiri dee agụmagụ ya bụ nke na-aga werewere.
407
Odee akwụkwọ agụmagụ a bụ Tony Uchenna Ubesie ji nka
okwu were ghụọ agụmagụ a ahụ. Agụmagụ a bụ nke nka okwu
jupụtara n’ime ya. Odee agụmagụ a bụkwa onye eji iji nka
okwu achọ ederede ya mma, wee mara. A ga-edepụta ụfọdụ
n’ime nka okwu ndị o jiri dee agụmagụ a bụ ỤKPAKA MỊỊRỊ
ONYE ỤBỊAM.
ILU (PROVERBS)
Ubesie bụ onye a maara na-eji ilu ata atụ n’agụmagụ ederede
ya. Ọtụtụ ilu jupụtara n’akụkwọ agụmagụ a. Ụfọdụ n’ime ha ka
a ga-ewepụta. Ha bụ ndị a na-esota:
iii) ‘Nne, abịa adịghị adị, a kụwa aka n’obi. Iyi adịghị adị, a
ńụwa ikpere aka’ - (ihu akwụkwọ nke iri na anọ.)
iv) Ndị Igbo tụrụ ilu na-asị na onye rie nke a, rie nke a, nke
a egbughị ya, nke a egbuo ya.’ – (Ihuakwụkwọ nke iri
atọ na asatọ)
408
vi) ‘Ndị Igbo tụrụ ilu sị onye hụrụ ozu lie ozu, ma ya ajụla
ihe gburu ozu, maka na mmadụ jupụtachaa ihe gburu
ozu, ike kwe, egwu agaghị ekwe ndị mmadụ lie ya.’ –
(ihuakwụkwọ iri asaa na asatọ.)
AKPAALAOKWU (IDIOMS)
Ụfọdụ akpaalaokwu dị n’agụmagụ a bụ ndị a:
i) ‘Ha abụọ ji anya agba izu’ – (Ihuakwụkwọ nke iri na
asaa)
MYIRI (SIMILE)
A ga-edepụta ụfọdụ myiri dị n’agụmagụ a:
409
i) ‘Obi dị ya ka ọkụkọ e megheere mpio ya ka o nwerekwa
onwe ya ọzọ’- (Ihuakwụkwọ iriabụọ)
ASỊNIILU (WELLERISMS)
Lee ụfọdụ asịniilu dị n’agụmagụ a:
i) Anụ ọhịa a na-akpọ ururu sị na egwu nrụkọnye ụkwụ
na-aka mma n’ugbo akịdị - (Ihuakwụkwọ iri na atọ)
ii) ‘Maka na ụtaba sị na anya na imi bụ nwanne maka na e
nye imi ka o rie, anya ebewe akwa’ – (Ihuakwụkwọ iri
anọ na ise
NKWUMA (EUPHEMISM)
A ga-edepụta nkwuma ụfọdụ dị n’akwụkwọ a:
i) ‘A kpachaghị anya, nna Chinyere na nwoke ahụ nwere
ike bụrụ ọgbọ’ – (Ihuakwụkwọ iriatọ na atọ.)
ii) ‘Onye ọ bụla na-akụ ngaji n’eze, na-apapụ ihu’ –
(Ihuakwụkwọ otu narị na iri anọ na otu.)
410
EGBEOKWU (HYPERBOLE)
Okwu ndị a a ga-edepụta bụ okwu egbeokwu ụfọdụ dị
n’agụmagụ a:
i) ‘Ọ bụ naanị Chinyere bụ akụ ọ kpara n’ụwa a’
(Ihuakwụkwọ iriise na anọ.)
IGBUDUOKWU (PARADOX)
A ga-edepụtakwa ụfọdụ Igbuduokwu dị n’agụmagụ a bụ
ỤKPAKA MỊỊRỊ ONYE ỤBỊAM.
411
ii) ‘Onye hụrụ ozu lie ya. Ya ajụla ase ihe gburu ozu n’ihi
na e mechaa ihe gburu ozu ga-egosi onwe ya’ –
(Ihuakwụkwọ iriisii na abụọ.)
iii) ‘N’ihi na ndị ji uche ha ahụ ụzọ ewerela anya kee nkụ
ụkwa, tupu a bia gwawa ofeke’ – (Ihuakwụkwọ iri na
isii)
AKPỤOKWU (EPIGRAM)
412
ii) ‘Ị ga-eji maka ndị na-abịara ya di, were jụ onye a na-
abịara di? – (Ihuakwụkwọ iriisii na abụọ.)
ORURUGHAOKWU (CLIMAX)
Ngwa, lee ụfọdụ orurughaokwu ndị a dị n’agụmagụ a:
NHAGIDEOKWU (ANTITHESIS)
Ụfọdụ nhagideokwu dị n’agụmagụ a bụ ỤKPAKA MỊỊRỊ
ONYE ỤBỊAM bụ ndị a:
413
MGBUDAOKWU (ANTICLIMAX)
Mgbudaokwu bụkwa atụmatụ okwu ọzọ a ga-arụtụ aka
n’akwụkwọ a. Ngwa, lee nke a:
414
NTAJIANYA
Chi jie
Nlakpu m bụ
Maka na chi ejiela
Na ibe m alakpuchaala
Ọ bụghị na ụra na-atụ m
Malite n’abalị ruo na ndeeri
Were pụta n’ụzọ ụtụtụ
Mụ na echiche ihe echi ga-abụ
Na-etikọrịta nku.
415
Mana
Ha lakpuo
Ọ dị ha ka chi efola efo
Ha mụchie anya
Ụra buru ha
Ha na nrọ
Otu ha siri nọdụ n’alaeze
Ana-ekwekọrịta n’aka
N’Ikpeazụ
Mụ mechaa chọta awele m
Chukwu Nna bi n’eluigwe
Hichaa m anya were sị
Ahụhụ m hadebe otu ahụ
Ha agaghịzị alakpu rahụ ụra
Mgbe ọbụla ha nụrụ maka m
Ụtụtụ, ehihie, abalị, ndeeri anyasị
Ha ataa aka n’ọnụ
A kọta akụkọ m ebe ha nọ
Ha ekponye ya aja
Ma zọtọọ ya
M gafee ebe ha nọ
Ha efifie n’isi
Ha nụ ọnụ okwu m
Obi ana-agbọwa ha
Ncheta m
Iwe eju ha obi
Ikuku m kuo
416
Ha emee, ‘Tụfịakwa’
Anya ha hụrụ m
Na-egbu ha emeri
Mụ kuru mmiri ńụọ
Ekpere ha abụrụ ka ọ gbado m
N’ezie, Agamniihu m
Na-ata ha mmiri n’ahụ
Ekpere ha mgbe niile n’ebe m nọ
Bụ ka ụzọ m chie
N’ezie, Ntajianya
Ị bụghị ezigbo mmadụ
Ọnwụ kwesịrị gị
Mana naanị mgbe ọnwụ ga-ewere gị
Bụ mgbe ị kwụsịrị
Ile anya agbamụmbọ
Mmadụ ibe gị
Ma nwekwaa afọ ojuju
Na nke gị onwe gị.
417
Ma chetakwa
Ọ bụrụ na i meghị otu ahụ
Ụmụ ụwa akpọgbuo gị n’ọnụ
E were mbazu gwuo ili gị
Ma werekwa nkịrịnka ute
Lie gị n’ajọ ọhịa.
Si n’akwụkwọ Abụ,
ỌDỊ M N’OBI
(1997)
Chinedum E, Ofomata
Enugu.
418
NKUZI ỤTỌASỤSỤ NKE IRIABỤỌ NA ANỌ
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE MBỤ
AGỤMAGỤ ỌDỊNAALA
Agụmagụ ọdịnaala bụ akụkọ ndị ahụ ndị Igbo ji ọnụ were na-
akọ banyere ụwa, ndụ ha na nghọta ha n’ime ụwa. Agụmagụ
ọdịnaala bụ akụkọ ndị ahụ ndị Igbo ji ọnụ akọ ma na-
egosipụtakwa maka ọnọdụ ụwa ha, otu ha siri malite, omenaala
419
ha na kwa ka ha si ebi ndụ. Mgbe gboo, ndị Igbo bụ ọnụ ka ha
ji akọ maka ụwa ha na ndụ ha n’ụ’ụwa. Ide ihe n’akwụkwọ
apụtabeghi mgbe ahụ. Akụkọ niile na mmụta niile bụ ọnụ ka e
ji eme ya. Akụkọ na-emekwa o si n’aka, o fere n’aka. Maka na
ọkpụkpụ nna tafọọrọ nwa ya bụ ọfọ. Ọ bụ akụkọ niile ahụ ha
na-akọ nke e sighị n’akwụkwọ ebe e dere ya were na-akọ ka a
maara dị ka agụmagụ ọdịnaala.
Ihe ọbụla Chukwu kere n’ụwa a nwere ihe e jiri mara ya. Ụwa
anyị nọ n’ime ya nwekwara ọtụtụ ihe e jiri mara ya. Ọ bụ ihe
ndị ahụ e jiri mara ya kpatara e ji aghọta na ọ bụ ụwa. Ebe
ọbụla na kwa mgbe ọbụla e jiri kọta maka ihe ndị ahụ e jiri
mara ụwa, a marala na ọ bụ maka ụwa ka a na-akọ maka ya.
A. ASỤSỤ
Otu n’ime njirimara ndị Igbo bụ asụsụ. Ihe izizi e ji amata
mmadụ, ogbe, obodo maọbụ mba bụ asụsụ. Ọ bụ site n’asụsụ
mmadụ sụrụ ka e si amata ebe o si na kwa onye ọ bụ. Onye
ọbụla nọ n’ụwa a nwere asụsụ ọ na-asụ. Ọ bụkwa asụsụ ahụ ọ
na-asụ na-akọwa ya ma na-emekwuazị ka a mata ya. Otu ahụ
kwa ka o siri dị n’ebe obodo dị. Obodo niile dị n’ụwa nwere
asụsụ e jiri mara ha. Ọ bụkwa asụsụ ahụ e jiri mara ha jikọrọ ha
ọnụ dịka otu obodo. Ọ bụkwa otu ahụ ka o siri dị n’ebe mba dị
iche iche e nwere n’ụwa a dị. O kwesịkwara ka anyị mata na ọ
423
bụ n’ime mba dị iche iche ka e si enweta agbụrụ dị iche iche.
Asụsụ sokwa n’ọkpụrụkpụ ihe ndị na-ehibe agbụrụ.
B. EKIKE
Njirimara ọzọ a ga-arụtụ aka n’akwụkwọ a bụ Ekike. Ekike bụ
usoro mmadụ si akwado onwe ya maọbụ dozie onwe ya n’ụdị
ọchịchọ na nnabata nke agbụrụ ya. Ndị Igbo nwere otu ha si
akwado onwe ha ma na-edozikwa onwe ha n’ọchịchọ na kwa
nnabata nke agbụrụ Igbo. Ọ bụ ụdịrị ọnọdọ ahụ ka a maara dị
ka ekike ndị Igbo. Ndị Igbo nwere otu pụrụ iche ha si akwado
onwe ha. Ọ bụkwa otu ahụ ha si akwado onwe ha na-egosipụta
ekike ha. Ndị Igbo nwere ekike e jiri mara ha. Ma nwata, ma
okenye, ma nwoke, ma nwaanyị, ma agbọghọbịa, ma okokporo,
ma ndị agadi, nwechara ụdịrị ekike ha. Mana ekike ha niile
424
gbadoro ụkwụ na ndụ ndị Igbo. N’ala Igbo, n’ekike ndị Igbo,
mgbe elu bụ ala ọsa, nwoke na-eke uwe n’ukwu ya ma yirikwa
uwe mkpụda nke a ga-akwakwa n’ọdịdị uwe ndị Igbo. Ọtụtụ
mgbe ka ndị nwoke na-eke akwa ma yirikwa eluakwa aka
gịrịgịrị. Ụmụaka, ụmụnwoke na ụmụokorobịa na-awa ọgọdọ.
Mana ugbua, ha na-eyizi nịka na uwe eluahụ maọbụ uweọkpa
ogologo na kwa akwa eluahụ. Ụmụnwaanyị, ma ndị
nnenwaanyị, ụmụagbara nwaanyị na-ama ọgọdọ, yiri akwa
eluahụ ma kekwaa ịchafụ isi. Ụmụagbọghọbịa na-eyi akwa
mkpụcha. Mana, oge ochie, ụmụagbọghọbịa na-eyi jigida ma
werekwa mgbaaka na mgbaọkpa were chọọ onwe ha mma.
N’ala Igbo, ekike ndị chiri echichi na-adịkwa iche. Ha kacha
eme ekike ha ka ọ dị iche nke na ha na-ekpu okpu mmee
mmee, na-eyi ákà ma n’olu, ma n’áká. N’obodo ụfọdụ n’ala
Igbo, ndị chiri echichi na-agba òwú n’ọkpa ma na-etekwa nzu
n’anya.
CH. NRI
Ihe ọzọ kwa e jiri mara ndị Igbo bụ nri ha na-eri. Nri bụ otu
n’ime ọkpụrụkpụ njirimara agbụrụ ọbụla. Ụdịrị nri agbụrụ a na-
eri abụghị ụdịrị nri agbụrụ ọzọ na-eri. Iji were maa atụ: Ọ bụghị
ụdịrị nri ndị Awụsa na-eri ka ndị Yoruba na-eri. Ọ bụghịkwa
ụdịrị nri ndị Yoruba na Awụsa na-eri ka ndị Igbo na-eri. Nri
sokwa n’ihe ndị na-akọwa agbụrụ ma na-egosipụtakwa ebe
onye si. Ndị Igbo nwere ọkpụrụkpụ nri dị iche iche e jiri mara
ha. Ụfọdụ n’ime nri ndị e ji mara ndị Igbo bụ:
425
NRI NDỊ IGBO NA KA E SI ESI HA
NRI KA E SI ESI YA
1 Akpụ A na-ayọ ya ayọ, sụọ ya asụ n’ikwe tupu e
riwe ya. A na-elo ya elo. Ọ bụkwa ofe ka e
ji elo ya
2 Akịdị Akịdị na-adị ka agwa mana ọ bụghị agwa. A
na-ebio ya ebio tupu e riwe ya. E ji achịcha,
ji maọbụ nri ọ dabaara ha na ya were na-eri
ya.
3 Ji Ji ka ndị Igbo maara dị ka eze nri. A na-esi
ya esi, e sichaa ya, e riwe ya. A na-ahụkwa
ji n’ọkụ. A hụchaa ya, a kpachaa ya, were
mmanụ rie ya. A na-ejikwa nri were na-ebio
ji. E nweghị otu e sighị eri ji. E nwekwara
ike sụọ ya nri otu ahụ e si asụ akpụ ma
werekwa ofe rie ya maọbụ loo ya. Ọ bụrụ na
e mee ji otu ahụ, a kpọọ ya nriji.
4 Fịọfịọ Fịọfịọ na-adịkwa ka agwa mana ọ bụghị
agwa. A na-esikwa ya otu ahụ e si esi agwa.
E jikwa ji maọbụ achịcha were na-esi fịọfịọ.
Ọ bụkwa nri e jiri mara ndị Igbo.
5 Abacha Abacha bụ otu n’ime nri ndị Igbo ejighị egwu
egwu. A na-agwọ ya agwọ ma were kwa
ụkpaka, anara, azụ, ịsha dgz were taa ya
6 Achịcha Achịcha bụkwa nri ọzọ e jiri mara ndị Igbo.
Ọ bụ site n’ede e beriri eberi ma chekpọọ
n’anwụ ka e si enweta achịcha. E jikwa ji
426
maọbụ fịọfịọ were na-esi ya.
7 Arịbọ Arịbọ bụ nri ndị Igbo na-ese ese tupu ha
eriwe ya. Ọ bụ otu ahụ e si elo akpụ ka e si
elo ya.
8 Ọka Ndị Igbo ji ọka eme ọtụtụ nri dị iche iche.
Ndị Igbo nwere nri a na-akpọ nriọka,
ịgbagwụọka, akamụ dgz. A na-ahụkwa ọka
n’ọkụ were ùbé taa ya.
9 Ụkwa Ụkwa bụkwa nri ọzọ magburu onwe ya e ji
were mara ndị Igbo. Ịkwado ya na-ahịa ahụ
mana oriri ya na-atọ ụtọ.
10 Mbụgụrụ N’ezie, ọtụtụ ndị Igbo ugbua amaghị nri bụ
mbụgụrụ. Mbụgụrụ bụ ezigbo nri nke e si
na jimmiri na-enweta. A kwọrie jimmiri, e
kee ya n’akwụkwọ, sie ya n’ọkụ. O ghee, ọ
fụọ afụ, e riwe ya.
11 Ọkpọoged Ọkpọogede bụkwụazị nri ndị Igbo. Ọ bụ
e jioko (ogede) chadere achade ka e ji eme ya.
12 Ede Ede sokwa na nri ndị Igbo. E ji ede eme
ụtara olilo, ụtara ofe, achịcha, na kwa nri dị
ka ji. Mana tupu e sie ede were rie ya dịka
ji, a na-esite ya aka n’ọkụ ka ọ chaa acha iji
were mee ka ọ tọọ ụtọ ma hapụ ịgbaka onye
riri ya agbaka, n’akpịrị.
D. OMUME (ÁGWÀ)
Njirimara ọzọ kacha mma e ji mara ndị Igbo bụ omume. N’ala
Igbo, ndị Igbo na-ekwu okwu were na-asị na àgwà bụ mma. Na
ọ bụ ire ọma ka ejula ji aga n’ogwu. Maka na nwa ewu gbuo
ikpere naabọ n’ala, ọ ńụọ nne ya ara. Iluokwu Igbo ndị m
depụtara bụ okwu ndị na-akọwa maka omume na kwa
akparamagwa. Ndị Igbo na-ahụta onye na-eme ezigbo omume
dị ka onye Chukwu keziri ekezi ma gọziekwa nke ọma. Ndị
Igbo kpọrọ ajọ omume asị ma na-agbapụkwara omume ọjọọ,
ngịrị.
E. OMENAALA
Ihe e ji ama ndị maọbụ agbụrụ, maọbụ mba, maọbụ obodo,
maọbụ onye, bụ omenaala. Omenaala na-egosipụta ka ndị si ebi
ndụ ha. Ndụ anyị nọ na ya nwere usoro kwesịrị ka e were na-
ebi ya. O nwekwara ụzọ e kwesịrị isi were na-ebi ya. Mgbe
ọbụla a gbahapụrụ usoro ndị ahụ, ndụ agaghịzikwa adị ka e siri
chọọ ya.
Ndị Igbo nwere ọtụtụ omenaala dị iche iche. Otu niile ndị Igbo
si ebi ndụ nwere usoro ya. Ọ bụkwa omenaala bụ usoro ndụ
ahụ. Ụfọdụ n’ime omenaala ndị Igbo bụ: alụmdinanwunye,
echichi, ọmụgwọ, oriri, ipu eze, mmọnwụ, ekike, ịgba afa,
afaagụ, ekele, ịgba mgba, egwu ọnwa, mmemme dgz.
Omenaala Igbo juru eju ma bara abara. Omenaala Igbo gbasara
omume na kwa akparamagwa ndị Igbo. Ihe ọbụla ndị Igbo na-
eme na kwa otu ọbụla ndị Igbo si eme omume gbadoro ụkwụ
n’omenaala ha. Maka na ngwere gbawa ọsọ were hapụ ukwu
osisi, aka akpara ya.
F. ỌRỤAKA
Ndị Igbo na-atụ ilu were na-asị na ọ bụ aka aja aja na-ebute ọnụ
mmanụ mmanụ. Maka na ngana kpuchie ute agụụ ekpughee ya.
Ilu a bụ ilu okwu tọrọ mụ na gị. Ilu okwu dị tupu anyị pụta
ụwa. Ọ bụ ndị gboo wepụtara ya. Ihe ilu okwu a na-egosi bụ na
ndị Igbo ekwenyeghị n’umengwụ. Ha ekwenyeghị n’ịnọ nkịtị.
Ha kwenyesịrị ike na mmadụ ga-agba mbọ nke ọma tupu ọ
kpata ihe ọ ga-eri. Na onye nọrọ nkịtị, agụụ egbuo ya. Ọ bụ
nkwenye dị otu a kpatara ndị Igbo ji wee bụrụ ndị na-arụsị ọrụ
ike ma bụrụkwa ndị e ji ịgba mbọ n’ụzọ pụrụ iche wee mara.
430
Tupu ugbua, ndị Igbo nwere ọrụaka dị iche iche. Ọrụaka ndị
ahụ bụkwa ọrụaka e ji wee mara ha. Ọ bụkwa ọrụaka ndị ahụ
ka ha ji were bie ndụ ha ma werekwa kwadoo maka echi ha. Ọ
bụ eziokwu na ọtụtụ ọrụaka ọgbaraọhụrụ dị iche iche abatala
n’ala Igbo na kwa n’etiti ndị Igbo, mana tupu ọrụaka ndị ahụ
abata, e nwere ọrụaka ndị Igbo ji wee biri. Ụfọdụ n’ime ọrụaka
ndị ahụ bụ ndị a:
ỌRỤAKA
DỊ ICHE NKỌWA HA
ICHE
1 Ọrụugbo N’ala Igbo, ọrụugbo ka e ji wee mara ndị
Igbo, ma nwoke ma nwaanyị, ma ụmụaka.
Ọrụugbo n’ala Igbo bụ ịkọnye nri dị iche
iche n’ala, ma werekwa ya ma oge isikwa
n’ala wepụta ya, ruo. Ụfọdụ ihe ndị ahụ
ndị Igbo na-akọnye n’ala bụ ji, ede, ọka,
akwụkwọnri, jioko, une, dgz.
2 Ịkpa anụ E jikwa ịkpa anụ wee mara ndị Igbo. Aha
ọzọ e jikwa wee mara ịkpa anụ bụ anụ
enunu. Ịkpa anụ bụ ịzụ anụ. Ha too e ree
ha ma were kwa ego e retara na ha were
gboo mkpa. Ụfọdụ n’ime anụ ndị ahụ ndị
Igbo na-akpa bụ: ewu, ọkụkọ, ọbọgwụ,
nwamba, ezi, ehi, nkịta, dgz. Anụ ndị a
bụcha anụ enunu ma bụrụkwa anụ e ji
akpata ego.
431
3 Ite mmanya E nwere mmanya e ji were mara ndị Igbo.
Mmanya ahụ bụ nke a maara dị ka
mmanyaọcha. Ya bụ mmanyaọcha dị kwa
n’ụdị dị iche iche. N’ime ya ka e nwere
mmanya nkwụ na mmanya ngwọ. Ọ bụ
iwepụta mmanya ahụ ka a ńụọ ka a maara
dị ka ite mmanya. Onye na-ete mmanya
n’ala Igbo bụ onye otenkwụ. E sikwa n’ite
mmanya akpata ego
4 Ịchụ nta Ịchụ nta bụ igbu anụ dị n’ọhịa maka oriri
na kwa maka ịkpata ego. Usoro e ji egbu
anụọhịa ndị a ka a na-akpọ ịchụ nta. Onye
Igbo na-achụ nta ka a maara dị ka dinta.
N’ihi nke a, ịchụ nta sokwa n’ọrụaka ndị
Igbo.
5 Ọkụazụ Ọkụazụ bụkwa ọrụaka ndị Igbo. Ọkụazụ
bụ igbu azụ na mmiri maka oriri na kwa
maka inweta ego. Maka na onye Igbo
gbuo azụ, ọ bụrụ na o righị ya eri, o ree ya
ere were nweta ego.
6 Ịkpa nkata Ma ruo taa, ịkpa nkata bụkwa nnukwu
ọrụaka n’ala Igbo. Aha ọzọ e jiri mara
nkata bụ èkètè. A na-akpazị nkata n’ụzọ dị
nnukwu maka na a na-ebujezi ya ugwu
Awụsa ebe a na-azụ ya n’ukwu maka iji
were na-ebudatara anyị azụ, tomato,
oroma na ihe ndị ozọ ga. Ndị na-akpa
nkata na ngịga bụkwa ndị na-eriju afọ.
432
7 Dibịa Dibịa bụ mmadụ n’ala Igbo. Onye dibịa
n’ala Igbo bụ onye nwere nnukwu ọrụaka
maka na ndị mmadụ na-esi na mba were
chọrọ onye ahụ na-abịa. Ọrụ dibịa n’ala
Igbo bụ ịgba afa, inye ọgwụ, ịgwọ ndị ọrịa
na kwa ịhụ ọhụ. Dibịa n’oge gboo sokwa
na ndị nwere àgbà
8 Ịdụ akanya N’oge gboo, ụlọ a na-enwe mgbe ahụ na-
abụ ụlọ akanya. Akanya bụ akwụkwọ osisi
ngwọ ka e ji adụkọ ya ọnụ. Ọ bụ akanya
ka ndị Igbo ji ekpuchi elu ụlọ ha tupu
gbamgbam apụta. N’ihi nke a, ndị Igbo
ọkachasị ụmụnwoke ji ịdụ akanya were
na-enweta ego.
9 Ịkpụ ụzụ Ịkpụ ụzụ bụkwa ọrụaka kajara akaja e jiri
mara ndị Igbo. Otu n’ime obodo ndị e ji
ịkpụ ụzụ wee mara n’ala Igbo bụ Ọka. E
nwekwara obodo ndị ọzọ kwa. Ịkpụ ụzụ
bụ iji igwe arụ orụ maọbụ nweta ihe ndị
ga-enyere aka n’ọrụ. Onye na-akpụ ụzụ ka
a maara dị ka ọkpụụzụ. Ihe ndị ọkpụụzụ
na-arụpụta bụ: ogene, anyụike, ọnyaigwe,
oji, ube, mmaoge, opio, ọgụ, obejiri,
mbazụ, mmaakpa, dgz. Ndị na-akpụ ụzụ
n’ala Igbo n’oge gboo bụ ndị na-enwe ego
mgbe ahụ. Ha na-enwekwa ọtụtụ ụmụọrụ
n’oge ahụ.
10 Ịtụ osisi Ịtụ osisi bụ ọrụ nka. Ndị Igbo bụkwa ndị e
433
ji ịtụ osisi wee mara. Ịtụ osisi sokwa
n’ọrụaka n’ala Igbo. Ịtụ osisi bụ iji osisi
were wepụta echiche mmadụ na ọdịdị
ụwa. Ụfọdụ n’ime ihe ndị e si n’ịtụ osisi
were na-enweta bụ: ikenga, ọja, okpesi,
ikoro, ihummọnwụ, ikwe, odo, oche, ịgba,
ọkwaọjị, ọkpọga, ọkpọkọrọ, ịgbaogidi,
ọkwa, akpati, mgbo, àkwà.
11 Ịsụ akwụ Ịsụ akwụ bụkwa akaọrụ ọzọ e ji wee mara
ndị Igbo. Ọ bụ osisi nkwụ na-ewepụta
mkpụrụakwụ ka e si enweta mmanụnri. Ọ
bụkwa site n’ịsụ akwụ ka e si apịpụta
mmanụnri. N’ihi nke a, ọtụtụ ndị Igbo bụ
ịsụ akwụ ka ha ji were mere akaọrụ. Ruo
ugbua, ịsụ akwụ ka bụkwa nnukwu akaọrụ
n’ala Igbo. Mmanụnri ndị Igbo si n’osisi
akwụ jupụtara n’ala Igbo niile were na-
enweta bụkwa ihe ha ji eri nri. Ha na-
erekwa ya ere n’ahịa were na-ereta ego ma
bụrụkwa nke ha na-ebuje n’obodo ndị ọzọ
dịcha n’ugwu Awụsa na kwa obodo
Yoruba.
12 Igbu nkwụ I si n’elu osisi nkwụ were gbutuo isiakwụ
n’ala adịghị mfe chaachaa. O nwere ndị
Igbo ọ bụ ọrụ ha. Ndị Igbo ndị ahụ ji
igbutu akwụ were mere akaọrụ, na-eji ete
were na-arị elu osisi nkwụ. Matakwa na
osisi nkwụ bụ nke na-eto ogologo nke
434
ukwu. N’ihi ya, ọ bụghị ihe onye amaghị
maka ya ga-emenwu. Ọ bụ ọrụ dịịrị ndị o
doro anya na kwa ndị ji ya mere akaọrụ.
Ndị ọrụaka ha bụ igbutu akwụ na-anata
ego tupu ha egbutuo akwụ maọbụ mgbe ha
gbutuchaara onye kpọrọ ha ọrụ, akwụ ya.
13 Ide uri Uri bụ ihe ndị Igbo ji achọ onwe ha, ụlọ
ha, obi ha, ụlọezumezu ha, mma. O nwere
ndị ide uri bụ ọrụ ha. N’ezie, ọ bụghị taa
ka ịchọ mma na kwa iji ịchọ ndị mmadụ
mma were mere ọrụaka malitere. O teela
kemgbe ọ dị. Ịchọ mma n’ala Igbo bụ nwa
tolite o tokwuru. Ọ bụ nnukwu ọrụaka
n’ala Igbo bụ ide uri. Ndị na-ede uri na-
anata ego ma ha dechaa uri. Ide uri bụ ụzọ
pụrụ iche ndị Igbo ji achọ onwe ha mma
ma werekwa ya na-achọ ụlọ ha na
gburugburu ha, mma.
E nwekwara ọtụtụ ọrụaka ndị ọzọ dịgasị iche iche e nwere n’ala
Igbo n’oge ochie. Mana, ugbua ọtụtụ ọrụaka dị iche iche
apụtala ma sonyekwara ndị nke dịbụ adị n’etiti anyị. Werezịa
aka gị chepụta ọrụaka ndị ọzọ e nwegachara n’ala Igbo ma
kọwaa ha.
N’ezie, ndị Igbo kwuru okwu were na-asị na ihe na-eku ume
na-anwụkwa anwụ. Mana, mgbe mmadụ nọ n’ogo ntorobịa, ọ
naghị aghọta okwu a. Kama nsogbu ọbụla adịghị ya n’ihi na
mgbe ọbụla ọmụnkwụ ghọọrọ igbegiri ka ọ ga-eji ghọta na ahụ
mmadụ jupụtara n’ogwu ma na-adụkwa onye ọbụla na-amaghị
were bie ya aka, ogwu.
440
Ndị Igbo tụkwara ilu were na-asị na ọ na-abụ onye mara gbuo,
onye ahụ amara zee. Onye bie ndụ ya nke ọma n’oge ntorobịa,
onye ahụ ga-agbanahụ ihe ọdachi dị iche iche na-adakwasa
ndịntorobịa. N’oge ntorobịa, ọtụtụ ihe ọghọm dị iche iche na-
adakwasa ndịntorobịa. Ọtụtụ ihe ọghọm na ọdachi ndị ahụ na-
adakwasa ha bụkwa ihe ha ji aka ha kpatara onwe ha. N’ihi ụtọ
ndụ na-atọ ha, ha na-eji maka ya daba na nsogbu ahụike nke ha
ga-anụ ụda ya ma a gbachaa egwu.
Ihe ọghọm dị iche iche na-esi na ndụ ọjọọ ndị a were dakwasa
ndịntorobịa ma ọ bụrụ na ha adanye n’ime ha, maọbụ danye na
nke ọbụla n’ime ha. Mana ọdachi kacha adakwasa ndịntorobịa
bụ ọdachi e si na mmekọrịta nwoke na nwaanyị were na-
enweta. Ọ na-abụ nnukwu ọrịa dịịrị onye nwetara ya. Ihe
kpatara ọrịa mmekọrịta nwoke na nwaanyị jiri ahịọpụ
ndịntorobịa ọnụ bụ maka na ndịntorobịa anaghị akpachapụrụ
onwe ha anya n’ihe gbasara mmekọrịta nwoke na nwaanyị.
Ụdịrị ọrịa ha na-esi n’ọnọdụ dị otu a enweta na-emetụta ha nke
ukwu. Ọ bụ site na mmekọrịta nwoke na nwaanyị ka e si
441
enweta ọrịa nsinwaanyị. Mana ọrịa kacha njọ n’ọrịa nsinwaanyị
niile a na-enweta bụ ọrịa mmịnwụ nke ndị bekee kpọrọ
HIV/AIDS. Ihe ọrịa a jiri karachaa ibe ya njọ bụ maka na o
nwebeghị ọgwụ e ji agwọ onye butere ya. Onye ọbụla butere ya
bụ ọrịa amarala na ya bụ ọrịa ga-eso ya were baa n’ime ili. Ọrịa
mmịnwụ anaghị ele anya n’azụ ma o gbuwe onye ọ na-arịa.
Mana ihe kacha ewute n’ọrịa mmịnwụ bụ na ọ na-ebugodu ụzọ
metọọ onye ọ na-arịa tupu o gbudaruo onye ahụ, ala. Ụmụnne
m na ụmụnna m, n’ezie, mmịnwụ bụ ọrịa ọjọọ. Onye ọbụla, ma
ntorobịa, ma nwata, ma agadi kwesịrị ka o zeere ọrịa mmịnwụ.
442
Onye ekwekwala ka ụwa chịa ya ọchị. Maka na onye ụwa chịrị
ochị bụ onye ụwa meriri.
443
N’ezie, ụbịam na agụụ abụghị ndị ọbịa n’ụwa. Kemgbe anyị
pụtara ụwa ka a malitere nụwa maka ụbịam na agụụ. Ụbịam dị
n’ụwa, agụụ dịkwuazị n’ụwa. Mana o kwesịkwara ka anyị mata
na ụbịam na agụụ bụ ụmụnne. Kama ọ bụkwa agụụ tinyere
mmadụ n’ọnọdụ ụbịam. Maka na ọ bụ onye agụụ na-abụ onye
ụbịam. Ebe ọbụla agụụ na ụbịam dị, ndụ dị ebe ahụ na-ada
ọnwụ ọnwụ n’ihi na agụụ na ụbịam adịghị mma ịbata na be
mmadụ.
N’ezie, ụwa a siri ezigbo ike. Ọ bụkwa onye sikwara ike na-eji
ọńụ were na-anọ n’ụwa. Onye esighị ike ụwa eloo ya. Onye
445
ọbụla pụtara ụwa, tolite ma bụrụ mmadụ n’obodo, kwesịrị ka ọ
bụrụ onye aka siri ike n’ezigbo ọrụ ọbụla ọ na-arụ. Onye
enweghị ihe ọ na-arụ kwesịkwara ka ọ chọta ihe ọ na-arụ. N’ihi
na onye ọbụla nọ ndụ kwesịkwara ka ọ chọta ihe ọ na-arụ.
Maka na onye ọbụla nọ ndụ nwere onyinye Chukwu nyere ya
nke ọ ga-esi na ya were na-enweta ihe ọ na-eri. Onye gụchara
akwụkwọ kwesịkwara ka o nweta ọrụ ọ ga na-arụ iji were na-
enyeju onwe ya afọ. Onye mụrụ ahịa kwesịkwaranụ ka ọ zụwa
ahịa ọ mụrụ ma sikwa na ya na-azụta ihe ọ na-eri n’ihi na ndị
Igbo sị na ọ bụ mma onye nwere ka o ji ana aka.
446
onwe ya. N’ihi na ọ bụ aha onye nyere nkịta be ya ka ọ ga-aza
ya. Maka na ọ bụ ebe onye gbaruru mbọ ka ude ya ga-ederu.
1. Gịnị bụ ụbịam?
2. Ụbịam na agụụ, ha bụ otu ?
3. Dee ma kọwaa ụdịrị ihe ọjọọ na ọghọm ụbịam na agụụ
na-ewetara mmadụ.
4. Kọwaa otu gọmentị ga-esi nyere aka n’ikpochapụ ụbịam
na agụụ n’etiti anyị.
447
Ọ ga-adị mma ka anyị mara ihe bụ òtù na kwa nzuzo na ndụ
anyị tupu anyị abanyewazịa n’ịkọwa ihe bụ out nzuzo. Gịnị bụ
òtù n’asụsụ Igbo? Òtù bụ nnọkọ ọnụ mmadụ abụo maọbụ karịa
na-anọkọ kwa mgbe kwa mgbe n’usoro iji were mezuo
ebumnuche ha, nghọta ha na kwa ọchịchọ ha banyere ndụ ha
hụrụ onwe ha na ya. Otu na-abụkwa nnọkọ ọnụ ndị ghọtara
onwe ha na kwa ndị nwere mmasị n’ime onwe ha banyere ndụ
ha nọ na na ya na kwa usoro e ji ebi ndụ n’ụwa ha nọ na ya.
Gịnị kwanụ bụ nzuzo? Nzuzo bụ ihe ọbụla maọbụ omume
ọbụla a na-eme nke a chọghị ka anya hụ maọbụ ka ntị nụ ya, ka
a ghara ịmata ihe ihe ahụ bụ maọbụ mata ihe a na-eme.
Mgbe elu bụ ala ọsa, tupu dibịa bekee abata n’ala Igbo, ọ bụ
dibịa ọdịnaala ka ndị be anyị ji agwọ onwe ha ọrịa. Ma ruo
ugbua, dibịa bekee batarala n’ala Igbo n’ụzọ pụrụ iche, dibịa
453
ọdịnaala ka ewukwa ewu ma kwusịekwa ike ka ọ dị na mbụ.
Ọtụtụ ọrịa na be anyị ka ndị be anyị nwere nkwenye siri ike na
ọ bụ naanị ndị dibịa ọdịnaala ga-agwọ ha. Na ha abụghị ọrịa
ndị dibịa bekee ga-agwọnwu. Ọtụtụ ndị be anyị nwekwara
nkwenye na ndị dibịa ọdịnaala na-agwọ ọrịa niile dị n’ụwa, ma
ọrịa ahụ, ọrịa ime mmụọ, ọrịa uche, ọrịa mmụọ ọjọọ, nsogbu
ụwa dị iche iche, ahụọkụ dị iche iche, ahụ ezughị oke dgz.
Ọtụtụ ndị be anyị bụ ndị Igbo bụ ndị anaghị ekweta na dibịa
bekee ga-agwọta ha ihe na-arịa ha. Nkwenye ha mgbe niile ọrịa
bịakwutere ha bụ na ọ bụ dibịa ọdịnaala ga-enye ha ọgwụ ga-
agwọ ha.
454
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE ATỌ
NDỊICHE DỊ N’ETITI DIBỊA ỌDỊNAALA
NA DIBỊA BEKEE
456
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE ANỌ
ỤDỊRỊ DIBỊA ỌDỊNAALA DỊ ICHE ICHE E NWERE.
459
E nwekwara usoro dị iche iche na kwa ụzọ dị iche iche e si
agba aja ma na-achụkwa aja. Ọ bụkwa dibịa aja na-ekwu ihe e
ji agba aja na ihe e ji achụ aja tupu a malite ịgba na ịchụ aja. E
nwere aja a na-achụ na mmiri, n’oshimiri, n’ịkpa, n’ajọ ọhịa,
n’ọgbọ iliozu, n’ukwu osisi, n’okporoụzọ, na mbaraezi, n’ụzọ
awaraawara, n’ụzọ gbara anọ, n’arụsị, n’ajaala, n’okwu arụsị,
n’eluugwu, n’ọzara, dgz. Ọ bụkwa dibịa aja ka ọ bụ ọrụ ya ịhụ
maka aja, usoro a ga-esi mee ya na kwa ebe a ga-anọ mee ya.
Matakwa na onye amaghị achụ aja maọbụ agba aja mee ya, ọ
waa n’afa. Ihe nke a na-akọwa bụ na o gosipụtakwa onwe ya,
na aja a gbara maọbụ na aja a chụrụ adịghị mma site n’inye
onye e ji maka ya were chụọ ya nsogbu n’ụzọ dị iche iche. Ọ
bụkwa site n’afa ka a ga-esi mata na aja a gbara maọbụ na aja a
chụrụ na a gbataghị ya maọbụ na a chụtaghị ya. A ga-akpọkwa
dibịa ọ bụ ọrụ ya ma bụrụkwa onye o doro anya ka o
menwokwa ihe ahụ e mere n’ụzọ kacha mma ma metakwa ihe
ahụ e metaghị. O kwesịkwara ka ị mata na ọ bụghị onye ọbụla
na-eri ihe e jiri chụọ aja. Ọ bụ dibịa aja na-eri ihe ndị e jiri chụọ
aja ruoro ya, ma werekwa nke ruoro ndịmmụọ nye ha. Maka na
o rie nke ya ma rikwuo nke ndịmmụọ, ndịmmụọ anawa ya ihe
ha. Ọ kpachaghị anya, ha etigbuo ya ma menye onye ọbụla
gbataara ya ọsọ ọgụ, egwu.
460
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE ISE
URU DIBỊA BARA
Otu n’ime uru ndị dibịa baara anyị bụ na ha na-enye ndị be anyị
ezigbo olileanya na nchekwube bụ ọkpọkọpị na ndụ. Ọtụtụ
mgbe, ka ndị be anyị na-esi na dibịa afa wee na-enweta
nkwenye na ihe ga-akacha mma n’ọdịniihu. Ndị dibịa aja na-
emekwa ka ndị be anyị chụọ chụo aja maọbụ gbaa aja iji were
rọzie ihe rọgọrọ arọgọ. Ọ bụkwa dibịa aja mgbe ụfọdụ na-
akọwapụta ụdịrị afa a ga-agba maọbụ chụọ ijiri dozie ọnọdụ
maọbụ kwee ọnya maka ọnọdụ ọma n’ọdịniihu.
Uru ọzọ dibịa bara bụ na ha na-agwọ ndị ọrịa. Ndị Igbo tụrụ ilu
na-asị na onye ya na chi ya dị na mma anaghị aga na nke dibịa.
Ihe ilu a na-akọwa bụ na ọ bụ naanị onye nọ na nsogbu na-
achọkwuga ndị dibịa. Onye ọbụla chọọrọ dibịa were gaa na nke
ya bụ onye ahụ adịghị. Ọ bụrụ na onye ahụ anaghị arịa ọrịa ime
ahụ, ọ na-arịa ọrịa chi ọjọọ. Onye ahụ nwekwara ike bụrụ onye
ndịmmụọ ọjọọ na-enye nsogbu. Ọtụtụ ndị mmadụ na-achọga
ndị dibịa bụkwa maka na ndị mmadụ ibe ha ekweghị ka ha ńụọ
mmiri tọgbọ iko. Ndị ihe na-esiri ike na kwa ndị a na-emegbu
emegbu na-achọkwa enyemaka ndị dibịa. Ndị a niile bụcha ndị
ahụ adịghị. Mgbe ọbụla ha gakwuuru ndị dibịa, ha na-enweta
461
ọgwụgwọ ọrịa na-arịa ha ma nwekwaa afọojuju n’ụzọ pụrụ iche
na ihe ndị ahụ na-esogbu ha ga-ahapụ ha aka.
Uru ọzọ dịkwa ezigbo mkpa bụ na ndị dibịa anyị na-enyere aka
n’idowe na ichekwaba omenaala ndị Igbo. O kwesịrị ka anyị
mata na ihe niile ndị dibịa Igbo na-eme bụ ihe ndị gbadosiri
ọkpa ike n’omenaala Igbo. Ọ bụkwa n’usoro omenaala na
ọdịnaala Igbo ka ha si enye ọgwụgwọ ha, agba afa, achụ aja na
kwa ihe niile ndị ha na-eme. Ndị dibịa anyị ejighị omenaala
anyị egwuri egwu n’ihi na ha kwenyesịrị ike na ngwere gbawa
ọsọ were hapụ ukwu osisi, aka akpara ya. N’ihi na a naghị
ahapụ isiaka were na-agba ụrịọm. Maka na ọ bụ ihe anụ na-
asara ka e ji amata ya n’ọnya.
Ndị dibịa sokwa na ndị kwenyesịrị ike na ọtụtụ ihe na-eme anyị
bụ ndị nke sitere na-amaghị omenaala, ileda omenaala anya na
imebi omenaala na ọdịnaala Igbo. Na onye ọbụla na-asọpụrụ
omenaala na ọdịnaala Igbo anaghị enwe nsogbu ma ya fọdụkwa
onye ahụ inwe nsogbu karịrị ya.
Uru ọzọ kwa ndị dibịa bara n’ala Igbo bụ na e mejọọ ala, mee
nsọala maọbụ mee arụ n’ala Igbo, ọ bụ ndị dibịa ka a ga-
agbakwuru maka ịmata ụzọ a ga-esi kwọọ onye ukwu wara.
N’ọnọdụ dị otu ahụ, ndị dibịa na-ewetakwa olileanya n’ebe e
chere na olileanya adịghịzi. Ha na-eme ka ije nyịrị anyị kwe
ọgụga site n’ịtụpụta aro otu a ga-esi mee ka ọnọdụ ọjọọ dị otu
ahụ kwe itinye aka. N’ezie, e meta nsọala maọbụ arụ n’ala
Igbo, ọ bụ ndị dibịa ka ọ dịịrị imezi ihe e mebiri. Ha na-eme
nke a site na-ime ihe a na-akpọ ‘Ịkpụ arụ’ maọbụ ‘Ịkwa ala’.
463
Ọ bụ ndị dibịa na-ahụ maka ịkpụ arụ. Ọ bụghị ihe mmadụ nkịtị
na-eme. Tupu onye mere arụ maọbụ nsọala akpụọ arụ maọbụ
kwaa ala, ọ bụ dibịa ga-ekwupụta ihe ndị a ga-eji kpụọ arụ na
usoro na kwa ọnọdụ a ga-agbaso n’ịkpụ arụ. Ọ bụrụ na a kpụwa
arụ mana aka dibịa adịghị ya, a mata na ịkpụ arụ ahụ agaghị adị
ire. Ọ gaghịkwa eziru ozi ya n’isi site na-ime ka obi ndị nọ ndụ,
ndị nwụrụ anwụ na ala anyị zọdoro ọkpa, dajụọ ma jụọ oyi.
Chepụta uru ndị ọzọ dịgasị iche iche ndị dibịa bara n’ala Igbo
na kwa na ndụ anyị, ma depụtachaa ha.
466
IHE ỌMỤMỤ NKE ISII
ỌGHỌM DỊ N’ỌRỤ NDỊ DIBỊA NA-ARỤ.
Ọtụtụ ndị dibịa bụ ndị ji asị were na-arụ ọrụ dibịa ha. Ọrụ ha
na-arụrụ ndị nọ na nsogbu na-abịakwute ha bụ ọrụ ndị na-
agbado ụkwụ n’asị. Ha anaghị eji eziokwu were na-arụ ọrụ ha.
Ha na-esi n’ụzọ dị otu a were na-aghọgbu ndị na-abịakwute ha
maka nsogbu ụwa ji ha. Ụfọdụ ndị dibịa na-agba afa, ma ndị
na-enye ọgwụ, ma ndị na-achụ àjà, bụ ndị ji asị were na-arụ ọrụ
dibịa ha. Ọnọdụ dị otu a na-etinye ndị na-abịakwute ha na
nsogbu ma mekwaa ka ụwa gbaa ndị ahụ gharịị. Ndị dibịa ndị
asị a na-eji ọrụ asị ahụ ha na-arụrụ ndị ọrịa na-abịakwute ha
were na-eme ka nsogbu ha kawanye njọ. Ha sikwa n’ụzọ dị otu
a were na-anapụ ha ihe ha nwere ma tinyekwa ha na nsogbu
site n’iji ahgụghọ na azụaka were na-eso ndị ji ọsọ were
gbakwute ha maka enyemaka n’usoro ọgwụgwọ.
Ụfọdụ ndị dibịa bụ ndị obi fere azụ. Ha bụ ndị afọ tara mmiri.
Arụrụala kụrụ ha akwa n’isi. Ha na-eji ọrụ dibịa ha na-arụ were
na-emegide mmadụ ibe ha. Ụdịrị dibịa ndị a na-eji ọrụ dibịa ha
na-arụ were na-etinye ndị mmadụ ibe ha na nnukwu nsogbu ma
na-emekwa ka ha were anyammiri na-akwọ aka. Ụfọdụ n’ime
ndị dibịa bụ ndị a maara dị ka ndị ajọ dibịa, na-ahapụ iji
ọnatarachi dibịa ha were na-agwọ mmadụ, kama ha na-eji ya
were na-egbu mmadụ ma werekwa ya na-eme mmadụ ibe ha ‘ọ
dị ndụ ọnwụ ka mma.’ Ụdịrị dibịa ndị a ewetala nnukwu iru
ụjụ na akwa arịrị n’ebe mmadụ ibe ha nọ. Ọ bụ ụdịrị ajọ dibịa
ndị a na-agwọ ọgwụ ọjọọ a na-etinyere mmadụ na nri, na
468
mmanya maọbụ na mmiri ọńụńụ dgz. Ọ bụkwa site n’aka ha ka
e si eweta ọgwụ a na-achịsara mmadụ n’ụzọ, maọbụ ụdịrị ọgwụ
a na-eliri mmadụ n’ala, maọbụ n’ụlọ mmadụ bi, ebe ọ na-arụ
ọrụ, ebe o si agafe, ebe ọ na-apụ ọrịrị, ebe ọ gara mmemme,
n’ama egwuregwu dgz. Ọ bụkwuazị ndị dibịa ọjọọ a na-
ewepụta ọgwụ a na-akọ mmadụ. Ịkọ ọgwụ bụ ọgwụ e si
n’ikuku were na-ememina mmadụ. Ọtụtụ mgbe ka ndị mmadụ
na-asị na a kọrọ ha ọgwụ. Ọtụtụ ọrịa ọjọọ dị iche iche ka e si
n’ịkọ ọgwụ were na-enweta. Ọtụtụ ọrịa ọjọọ dị iche iche ka e si
n’ịkọ ọgwụ were na-enweta. Ọtụtụ ndị ọrịa nọ na be anyị ugbua
nwekwara nkwenye siri ike na ọ bụ ọgwụ ka a kọrọ ha.
469
Ọtụtụ ndị dibịa bụ ndị ji ọrụ dibịa ha were na-ebo ebubo ụgha.
Mgbe ụfọdụ, onye ha na-ekwu na ọ bụ ya mere ihe, mebiri ihe
maọbụ rụọ ala na-abụ onye aka ya dị ọcha, onye enweghị ihe
ọbụla o mere. Ọ bụkwa site n’ịgbara ndị na-abịakwute ha afa
maka ịmata maka ọnọdụ ha, ndụ ha na echi ha ka ụdịrị ebubo
ụgha a si adapụta. N’ezie, ndị dibịa arụrụala a na-ama na ihe ha
na-eme maọbụ ihe ha na-ekwu adabaghị. Mana onye maọbụ
ndị ha na-agwa okwu ụgha ahụ niile na-ewere ihe ha na-agwa
ha dị ka eziokwu, ma werekwa ha mewe ihe. Ụdịrị ndụ a
jọgburu onwe ya ma bụrụkwa ihe kwesịrị ka a kwụsị ya. Ma
ndị dibịa ahụ na-akpa ụdịrị agwa ọjọọ a, ma ndị ahụ na-
abịakwute ha, ha niile kwesịrị ka ha baa n’ụlọ ma were
Chineke ha hiri isi.
Ihe ọghọm ọzọ sikwa n’ebe ndị dibịa ọdịnaala were na-apụta
bụ na ha na-etinye ọgbaaghara na ndụ ndị mmadụ, n’etiti ndị
mmadụ, n’ezinaụlọ, n’obodo na kwa n’ọnọdụ ụwa. Dị ka otu
ihe si kwụrụ, ọtụtụ ụmụnne achọghịkwa iji anya ha hụ onwe ha
n’ihi na ndị dibịa ụfọdụ na-eme ka nwanne nwee nkwenye siri
ike na ọ bụ nwanne ya dowere ya n’ọnọdụ ọjọọ ọbụla ọ nọ na
ya. Imirikiti ụmụnne anaghịzi esi otu ụzọ aga n’ihi ihe ndị dibịa
gwara ha na kwa ụjọ ha yiri ha site n’afa ụgha ha na-agbara ha.
Ọtụtụ ezinaụlọ n’ala Igbo bụzịkwa oke n’ọhịa, ngwere n’ụzọ.
onye gbata, ọ ghaa ibe ya. O nweghịzi onye chọrọ ịnụ isi
nwanne ya. O nweghịzi onye chọrọ mmeụta ahụ nwanne ya
n’ihi na onye ọbụla na-ahụtazị ibe ya dị ka onye nsi na onye ihe
ọjọọ. Ihe kpatara ọnọdụ dị otu a ji kawanye njọ ma na-arịkwa
elu n’ụzọ jọgburu onwe ya bụ n’ihi nkwenye ndị be anyị nwere
n’ebe ọrụ ndị dibịa dị. Ndị dibịa asị a na-etisakwa di na nunye
470
site n’ụdịrị afa asị ha na-agba. Ọ bụrụ na ha asịghị di na ọ bụ
nwunye ya na-egbu ya, ha asị nwunye ya na ọ bụ di ya dowere
ya n’ọnọdụ ọjọọ ọ nọ, maọbụ na di ya chọrọ ka o were ya gwọọ
ọgwụ ego. Ọzọ kwa dị ka ibe ya bụ na imirikiti ndị be anyị ka
nọ n’ìsì. Ha amaghị aka nri ha, ha amaghịkwa aka ekpa ha. Ọ
bụ ụzọ ọbụla a sị ha si, ka ha na-esi. A sị ha kpọnye isi n’ọhịa,
ha akpọnye. A sịkwanụ ha kpọdo isi n’ala, ha akpọdo n’ihi na
ha enwebeghị nghọta miri emi banyere ụwa iji were ghọta na ọ
bụghị ebe e tinyere anya mmọnwụ ka mmọnwụ si ahụ ụzọ.
472
NKUZI ỤTỌASỤSỤ NKE IRIABỤỌ NA ITOOLU
IHE ỌMỤMỤ NKE MBỤ
AGWA ỌMA NA AGWA ỌJỌỌ NA NDỤ NDỊ IGBO
Ịgba mgba okpuru bụkwuazị otu n’ime omume ọjọọ so wee na-
emebiri anyị ihe na be anyị. Gịnị kwanụ bụ ịgba mgba okpuru?
477
Ịgba mgba okpuru bụ i si n’azụ were na-emebiri mmadụ ihe ọ
na-eme. Mgbe ọbụla mmadụ si n’ụzọ nzuzo were na-ekponye
aja n’ihe mmadụ ibe ya na-eme, onye ahụ matakwa na ọ bụ
mgba okpuru ka ọ na-agba. Onye ọbụla si n’ụzọ aghụghọ
maọbụ n’ụzọ arụrụala were na-emebi ezigbo mbọ mmadụ ibe
ya na-agba, were na-aghasa ihe mmadụ ibe ya na-eme ka ihe
onye ahụ na-eme ghara inwe isi bụ mgba okpuru ka onye ahụ
na-agba mmadụ ibe ya. Onye ọbụla na-eme ụdịrị omume dị otu
a mata na ọ bụ agwa ọjọọ ka ọ na-akpa. Na iwe Chukwu ga-
adịrịrị ọkụ n’ebe onye ahụ nọ.
Agwa ọjọọ ọzọ akwụkwọ a ga-eleba anya bụ ịbọ ọbọ. Ịbọ ọbọ
bụ mmadụ imegwara ihe mmadụ ibe ya mere ya. Ọtụtụ mmadụ
ka ọ na-abụ mmadụ ibe ha mee ha ihe, ha anaghị edi ya. Ha ga-
emegwarịrị onye ahụ mere ha ihe, ihe ahụ o mere ha. Agwa dị
otu a abụghị ezigbo agwa. Ọ bụ agwa jọgburu onwe ya. Ọ bụ
agwa ọjọọ. Chukwu sị anyị ejikwala aka anyị were bọọ ọbọ, ka
anyị hapụrụ ya ọbọ ka Ọ bọọ. Ọ bụ Chukwu kere anyị. Ọ
bụkwa ya ga na-alụrụ anyị ọgụ. Ọ bụkwa ya ga na-agbara anyị
ọgụ. Ihe ọbụla e mere anyị bụ Chukwu ka e mere ya. Ọ na-
ahụzu ihe niile anyị na-eme na kwa ihe niile a na-eme anyị. Ọ
bụ ya mazuru ihe niile ma marakwa ka ọ ga-esi were soo ndụ O
kere. N’ihi nke a, o kwesịghị ka mmadụ nọ ndụ na-arụnye
Chukwu aka n’anya. Ihe ọbụla i mere mmadụ bụ Chukwu ka i
mere ya. Ọ bụkwa Chukwu ka ịkwụ ụgwọ dịịrị. N’ihi nke a, ịbọ
ọbọ bụ agwa ọjọọ ma bụrụkwa agwa na-emegide mmadụ. Ọ bụ
ya kpatara o jiri dị mma ka anyị na-ekpesara Chukwu ihe ọbụla
e mere anyị ka O were aka ya na-alụrụ anyị ọgụ.
478
Mmadụ ekwesịghị imesi mmadụ ibe ya ike maọbụ megide onye
enweghị ihe ọbụla o mere ya. N’ihi nke a, onye nọ ndụ
sepụkwa aka na mmegbu. Mmegbu jọgburu onwe ya na njọ.
Onye ọbụla a na-emegbu emegbu na-ebe, na-eri arịrị mgbe
niile. Onye ahụ na-enwe nnukwu nwute mgbe ọbụla. Matakwa
na akwa onye ọbụla a na-emegbu emegbu na-eru Chukwu ntị.
Ala anyị zọdoro ọkpa na-agbakwara Chukwu ọgụ kwa oge
ọbụla. Onye ọbụla na-emegbu mmadụ anaghị ańụ mmiri tọgbọ
iko. Onye dị otu ahụ matakwa na ihe ọbụla o mere mmadụ ibe
ya na-adakwasa ya mmaji kwuru mmaji. Onye ọbụla na-
emegbu mmadụ na-ata ntu ọkụ, maka na ọ bụ ihe onye tụrụ
n’ahịa ka a ga-azụtara ya. Kama ị ga-emesi mmadụ ike, kama
nyere onye ahụ aka maka ọńụ na ụgwọọrụ dị mma jupụtara
n’omume ọma. Onye ọbụla na-emesi mmadụ ibe ya ike, na-
emegide mmadụ ibe ya, na-emegbu mmadụ ibe ya, matakwa na
ọ bụ olulu ọnwụ ka ọ na-egwuru onwe ya na kwa ezinaụlọ ya
n’ihi na mmiri na-amachi ụbaọkpa mana ọ naghị amachi
okwuọnụ. Maka na ọnya laa, àpà ya anaghị ala n’ihi na ọ bụ ihe
onye metara o were isi ya buru. Onye meta ihe ọkụmmụọ, ọ
gawa ọkụmmụọ. Onye metakwanụ ihe ala ga-eji chụwa ya osọ,
ala achụwa ya ọsọ. Onye mmegbu matakwa na ọ bụ ihe o
metara ga-egbu ya. Mana, onye a na-emegbu emegbu mata na o
tee aka ọ dị njọ, ọ dịkwa mma n’ihi na chi onye na-alụrụ ya
ọgụ.
480
IHE OMUME SITE NA NKUZI ỤTỌASỤSỤ NKE
IRIABỤỌ NA ITOOLU
15. Dee ma kọwaa ụzọ ise kacha mma a ga-esi kwụsị agwa
ọjọọ.
20. Agwa ọma na agwa ọjọọ, kedụ nke na-enyere ibe ya aka
maọbụ nke na-emebi ibe ya na ndụ ndị Igbo?
482
NKUZI ỤTỌASỤSỤ NKE IRIATỌ
IHE ỌMỤMỤ NKE MBỤ
AKỤNAỤBA
Akụnaụba bụ njupụta ihe e ji ebi ndụ n’ụdị ihe akụ akụ na ihe
enwe enwe. Ọ bụ ihe na-eme ka ndụ zuo oke nke ọma ma
dịkwa mma obibi. Akụnaụba na-emekwa ka ndụ na-eto eto ma
na-enyekwa ọńụ. Akụnaụba bụkwa ihe Chukwu wepụtara ijiri
mee ka ụwa na-agba mbọ ma na-arụsi ọrụ ike ijiri tozuo nke
ọma n’ogo onye chọrọ na kwa n’ụdịrị ogo ndị obodo ya na-atụ
anya n’aka ya. Akụnaụba na-enye ndụ ọnọdụ ọma ma mekwaa
ka ndụ nwee mkpọrọgwụ. Akụnaụba na-enyekwuazị ndụ
ngalaba na olileanya. Ọ bụ otu Chukwu siri kee mmadụ ka O
siri kee akụnaụba. Akụnaụba Chukwu kere bụ ka O were nye
mmadụ ọdịmma n’ụwa O kere.
483
N’ezie, akụnaụba dị n’ụwa tupu anyị apụta ụwa. Ọ ga-adịkwa
ma anyị hapụkwa ụwa. Akụnaụba anaghị agwụ agwụ. Ọ bụ
Chukwu kere ya. Ihe Chukwu kere bụ ihe na-adịgide. N’oge
gboo, akụnaụba dị. Ndị nnanna anyị ha maara maka akụnaụba.
Ọ bụghị anyị malitere nwewe akụnaụba. Ọ dị tupu anyị bịa, ọ
ga-adịkwa anyị alawa, ndị na-esota anyị amalitekwa n’ebe anyị
kwụsịrị.
485
na ndị nwere akụnaụba. N’oge ugbua, ọtụtụ ụgbọala bụzịkwa
ọtụtụ akụnaụba. Onye enweghị ụgbụala enweghị akụnaụba.
1. Gịnị bụ Akụnaụba?
2. Ọ bụ mmadụ nwe akụnaụba ka ọ bụ akụnaụba nwe
mmadụ?
3. Dee ma kọwapụta ihe na-emebe akụnaụba.
4. Ụdịrị akụnaụba a na-enwe ugbua na nke a na-enwe
n’oge gboo, ha bụ otu?
487
NKUZI ỤTỌASỤSỤ NKE IRIATỌ NA OTU
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE MBỤ
NLEKỌTA GBURUGBURU
Onye ọbụla bụ onye Igbo nwere ebe ọ nọ maọbụ ebe o bi. Ebe
ahụ onye ahụ nọ maọbụ onye ahụ bi nwekwuazịrị okirikiri ya.
Ọ bụ okirikiri ebe ahụ onye ahụ bi maọbụ onye ahụ nọ ka a
maara dị ka gburugburu. Gburugburu bụ ebe niile dịdebere ebe
mmadụ bi na kwa ebe mmadụ na-anọ mgbe niile. Ọzọ kwa dị
ka ibe ya bụ na ihe ọbụla dị n’ebe mmadụ bi maọbụ ebe
mmadụ nọ bụ ihe dị na gburugburu ya. Akụkụ niile n’ebe ọbụla
mmadụ nọ bụ gburugburu onye ahụ. Onye ọbụla nọ ndụ nwere
gburugburu. Gburugburu onye nwere ka o kwesịrị ka ọ na-eleta
anya. Ihe ndị na-emebe gburugburu mmadụ bụ mbaraezi, osisi,
ụzọ, ezinaụlọ, ọwammiri, ụlọ, ọdọmmiri, enunu, ịmeụlọ dgz.
489
ọcha otu kwesịrịnụ. Adịghị ọcha bụ nnukwu ihe dị njọ n’ihi na
ọ na-ebubatara mmadụ ọrịa dị iche iche na kwa nsogbu ahụike.
Ihe ọzọ kwa gburugburu a naghị elekọta anya nke ọma na-
ewetara anyị bụ ịkọ ọnụ na mkparị. Gburugburu adịghị ọcha bụ
gburugburu e ji eme ihe ọchị. A na-ahụta gburugburu ahụ dị ka
gburugburu mmadụ na-anọghị na ya, maọbụ gburugburu ndị nọ
na ya enweghị isi na mmadụ. Maka na o kwesịghị ekwesị ka
gburugburu mmadụ nọ na ya bụrụ nke ga-adị njọ ile anya
maọbụ ịbata na ya. Gburugburu kwesịrị ka ọ na-adị ọcha ma
na-atọkwa ụtọ ọnụnọ.
491
492
NKUZI ỤTỌASỤSỤ NKE IRIATỌ NA ABỤỌ
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE MBỤ
NZIKỌRỊTAOZI KETEKNỌLỌJI
Usoro ozi leta bụ usoro isi n’ide ozi n’akwụkwọ were zikọrịta
ozi. Onye chọrọ iji ya zie ozi dechaa ozi ya, o zipụ ya ma
zigara ya onye ahụ ọ chọrọ izi ozi. Onye ahụ ezigaara ya
gụchaa ya, ọ bụrụ na ọ ga-azaghachikwa ihe e ziteere ya n’ozi,
o mekwaa nke ahụ site n’idegakwara onye ahụ ziteere ya ozi
leta, leta nke ya.
495
URU DỊ NA NZIKỌRỊTAOZI KETEKNỌLỌJỊ
Nzikọrịtaozi keteknọlọjị bara ọtụtụ uru. Otu n’ime uru ọ bara
bụ na ọ na-eme ka ozi ruo onye e ziri ya ngwa ngwa.
Nzikọrịtaozi keteknọlọjị bụ ozi na-agaru n’ebe a chọrọ ka o
ruo. Ndị bekee mere ya ka o soro ikuku na-aga. Aga m ejikwa
ohere a kwuo na nzikọrịtaozi keteknọlọjị gbanahụrụ
amụmammiri n’ọsọ. Ozigbo a na-ezipụ ya ka ọ na-eru n’ebe a
na-ezije ya. Ọ naghị egbu oge ọbụla n’iru onye a na-ezi ya,
aka.
496
Nzikọrịtaozi keteknọlọjị na-eme ka onye na-ezi ozi mata ma
onye maọbụ ndị ọ na-ezi ozi ọ nọkwa ya. Ọ bụghị ụdịrị ozi ọ
na-abụ a na-ezi, a na-atụ ụjọ ma onye a na-ezi ya ọ ga-anọkwa
ya. Nzikọrịtaozi keteknọlọjị bụ nke na-eme ka onye na-ezi ozi
jide n’aka na onye ọ na-ezi ozi nọ ya tupu o ziwe ya.
497
igwe nzikọrịtaozi keteknọlọjị bụ onyenkuzi onye ọbụla chọrọ
ịmụta ihe banyere ihe ọbụla ọ na-ajụ ase ya.
499
mmadụ n’ìgwè. Ndị igbu mmadụ na ịkwafu ọbara anaghị adị ka
ihe, na-eji ya were na-alalu ụmụmmadụ.
Mana, o nwekwaa ihe ọbụla ị chọrọ ịchọta maka Igbo nke ị na-
enwetaghị site n’akaraoziikuku, ihe ọzọ ị ga-eme bụ na ị ga-
akpọtụrụ ngalaba igwe oziikuku (ịtanetị) nke ndị bekee kpọrọ
Google. Aha akwụkwọ a ị na-agụ ugbua gụrụ Google bụ
Jụtamnaoziikuku. Aha Igbo ọbụla maọbụ ihe ọbụla gbasara
502
asụsụ omenaala Igbo dị n’igwe oziikuku nke i nweghị ike
ịchọtanwu site n’akaraoziikuku, ọ bụrụ na ị gakwuru
jụtamnaoziikuku ma kọwaara ya mkpa gị na kwa ihe ị chọrọ ka
o meere gị, ọ ga-emere gị ya ma ọ bụrụ na ihe ahụ ị na-achọ dị
n’ịtanetị. Ọ bụrụkwanụ na ihe ị na-achọ adịghị,
Jụtamnaoziikuku ga-eme ka ị mata na akwụ achaghị mmanụ
n’ihi na chakacha adịghị n’udummanya. Jụtamnaoziikuku na-
enyere igwe oziikuku na onye batara n’igwe oziikuku maka
ịmata ihe dị ya mkpa, aka n’ụzọ pụrụ iche.
503
8. Kọwapụta ọghọm dị iche iche e si na nzikọrịtaozi
keteknọlọjị were na-enweta.
9. Gịni bụ itanetị?
10. Kedụ ihe a na-akpọ E-mail, Tweeter, Internet,
Facebook, Website, Wlky-talky na Google n’Igbo?
11. Dee ma kọwaa maka nzikọrịtaozi na webụsaịtị Igbo
n’ịtanetị.
504
NKUZI ỤTỌASỤSỤ NKE IRIATỌ NA ATỌ
ISI IHE ỌMỤMỤ NKE MBỤ
ECHICHE NDỊ IGBO BANYERE ỤWA
Ihe niile Chukwu kere nwechara ọdịdị na kwa ụdịrị ha. Nke
ọbụla n’ime ha nwekwara ụdịrị ndụ ọ na-ebi na kwa agwa ọ na-
akpa. Ma anụọhịa, ma mmadụ, bụcha Chukwu kere ha. O
nwekwara ihe kpatara O jiri kee nke ọbụla n’ime ha. A bịa na
mmadụ Cukwu kere, Chukwu kere mmadụ n’ụdị Ya, ka
mmadụ yie Ya. O keghị mmadụ ka ọ na-eme ajọ omume
maọbụ na-akpa ajọ agwa. O kere mmadụ ka mmadụ mara ihe,
mara onye kere ya ma na-emekwa omume ga-adị onye ahụ kere
ya mma. E keghị mmadụ ka o nupu isi n’ọchịchọ nke Chineke.
Chukwu kere mmadụ ka ọ bụrụ ihe ọńụ n’etitti mmadụ na ibe
ya na kwa Chukwu kere ya. Ọ na-ewe Chukwu iwe ma ọ bụrụ
505
na mmadụ O kere hapụ ihe o jiri kee ya ma mewe omume na-
ezighị ezi.
N’ala Igbo, ihe ndị Igbo weere dị ka ihe kacha ihe niile
Chukwu kere bụ mmadụ. Ndị Igbo na-asọpụrụ mmadụ, na-
akwanyere mmadụ ùgwù, na-asọ mmadụ nsọ, ma na-ehukwa
mmadụ nhu. N’ihi nke a, mmadụ ekwesịghị ka ọ na-ata mmadụ
ibe ya ahụhụ site n’ịkpa agwa na ime omume na-agbasa anya.
O kwesịghịkwa ka mmadụ na-arịa ọrịa mgbe na mgbe ọbụla.
Onye ọbụla na-arịa ọrịa kwa mgbe ọbụla bụ onye na-etinye ndị
nwe ya na mgbagharị kwa oge ọbụla. Onye ọbụla na-emekwa
omume na-agbasa anya bụkwa onye na-amapụ ndị nwe ya obi
ma na-emekwa ka ha na-akụja akụja kwa oge ọbụla. Ndị Igbo
kwenyesịrị ike na onye ọbụla na-etinye mmadụ ibe ya n’oke
ahụhụ na kwa n’oke nsogbu na-abụ ụdịrị onye ndụ ọ nọ n’ụwa
a anaghị atọ ụtọ. Mgbe niile, echiche onye dị otu ahụ bụ ọnwụ.
site n’ụdịrị ọnwụ oge ya na-erughị eru onye dị otu ahụ nwụrụ,
na-ewetara ndị nwe ya ‘Ịgba aka were na-etiri ọkụkụ akị’ na
kwa iru ụjụ mgbe niile. Ọ bụ ụdịrị onye dị otu ahụ ka ndị Igbo
na-akpọ ọgbanje. Na nkwnye ndị Igbo, ọgbanje na-ahapụ ndị
nwe ya were nwụọ mgbe ndị nwe ya na-atụghị anya. Maka ndị
Igbo kwenyesịrị ike na mmadụ na-anọru ndụ n’isi tupu onye
ahụ alakwurukwa onye kere ya. Ọ bụ nkwenye dị otu a kpatara
o ji abụ ọ bụrụ na mmadụ emeghị okenye maọbụ agadi were
nwụọ, ndị Igbo na-ewere onye ahụ dị ka onye anwụghị ọnwụ
chi ya. Ha na-agbakwa mbọ otu ha nwere ike n’ịchọpụta ihe
kpatara onye dị otu ahụ ọnwụ erubeghịrị jiri nwụnahụ ha.
507
Ndị Igbo kwenyekwara na ọnwụ mmadụ abụghị njedebe ndụ.
Ọ bụ nkwenye ndị Igbo na onye ọbụla nwụrụ anwụ nwere ebe
ọ gawara. Ebe ahụ ọ gawara bụkwa ebe ọ ga-esi were
laghachitekwa n’ụwa a dị ka n’ụdị nwatakịrị. Onye ahụ ga-
abakwa nwaanyị n’afọ, a dị ime ya, mụọ ya, ọ malitekwa ndụ
ya. Ọ bụ ọnọdụ dị otu a ka ndị Igbo na-akpọ ịlọ ụwa. Ịlọ ụwa
bụ ọnọdụ mmadụ ga-abịaghachikwa n’ụwa ma malitekwa ndụ
n’isi. N’ihi nke a, ndị Igbo ekwenyeghị na ndụ na-agwụ agwụ.
Ndị Igbo kwenyere na onye ọbụla biri ezigbo ndụ n’ụwa a na-
eji ọńụ were na-alakwuru ndị nnanna ya ha. Mana, onye ọbụla
biri ajọ ndụ bụkwa onye ha kwenyere ga na-ata naanị ahụhụ
n’ebe ahụ ọ na-eje ma ọ nwụọ.
N’ala Igbo, ndị Igbo nwere chi dị iche iche. Chi ọbụla bụ nke
ha kwenyere na o nwere ihe ọ na-arụ. Ọ bụkwa ihe ahụ chi ahụ
na-arụ ka e ji mara ya. Ụfọdụ n’ime chi e nwere n’ala Igbo bụ:
chi okikie, chi ọmụmụ, chi ọgụ, chi ọrụ dgz. Nke ọbụla n’ime
ndị a nwechara ọrụ ọ na-arụ. Chi okike bụ ya bụ Chi kacha chi
niile e nwere n’ala Igbo. Ọ bụ ya ka a na-akpọ Chiokike maọbụ
Chineke. Ọrụ ya bụ ike mmadụ na kwa ihe niile dị n’ụwa. Ọ
bụkwa ya na-ahazi mmadụ na kwa ihe ndị dị n’ụwa dị ka ha
kwesịrị ịdị. Chi ọzọ a ga-eleba anya bụ chi ọmụmụ. Chi
ọmụmụ bụ chi ndị Igbo kwenyere na ọ na-enyere nwaanyị aka
ịmụ nwa n’udo. Chi ọmụmụ a na-emekwa ka ụmụnwaanyị na-
amụ nwa ghara ịnwụ. Nwaanyị lụo di n’ala Igbo, a na-emere ya
emume chi ọmụmụ maka ịtụ ime na ịmụta nwa. Kedụkwanụ
maka chi ọgụ. Nke a bụ chi ndị Igbo na-akpọku ma ha gawa
509
agha. N’oge gboo n’ala Igbo, obodo na obodo na-ebuso onwe
ha agha. Tupu obodo ọbụla agawa ọgụ, ọ bụkwa chi ọgụ ha ka
ga-akpọku ka o duru ha gaa ọgụ ma dulatakwa ha ma mee ka
ha merie na ya bụ ọgụ ha na-aga. Chi ọrụ bụ chi na-ahụ na ihe a
rụpụtara n’ubi na-adị n’uju. N’oge ochie n’ala Igbo, naanị ọrụ e
jiri mara ndị Igbo bụ ọrụugbo. Ọ bụrụ na ọkọchi kpọkarịa, ihe
ha kọrọ n’ubi na-akpọnwụcha, maọbụ o ruo oge mmiri ga-ezo
were hapụ izo, ha na-akpọku chi ọrụ nke ha nwere aha a ga-
aakpọ ya ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka n’ihi na mmiri na-achọ
iri ha.
512
N’ezie, onye ọbụla na-agụ akwụkwọ, na-agụ akwụkwọ maka
echi. Ihe e jikwanụ agụ akwụkwọ ma na-agụsi ya ike bụ
maka agamniihu. N’ihi nke a, onye ọbụla chọrọ ka echi kara
ya taa mma, ka ọnọdụ ya taa kara mma echi, kwesịrị ka o
were agụmakwụkwọ hiri isi n’ihi na onye esoghị ibe ya agụ
akwụkwọ ugbua bụ onye na-achọghị ka ụzọ agamniihu ya
megghee. Ndị Igbo sị na ihe e ji eje mba bụ ka a mụta ihe, ọ
bụghị ka e rijuo afọ. Maka na ọ bụ ọnọdụ ya taa ga-akọwa ka
echi ya ga-adị.
514
ọ ga-eru ma mekwaa ka onye ahụ bụrụ onye e ji ama atụ na
ndụ na kwa n’ụwa ọ nọ na ya.
1. Gịnị bụ agụmakwụkwọ?